Igbo Mass Readings for July 7 2026, Tuzde Izuụka nke Iri na Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for July 7 2026, Tuzde Izuụka nke Iri na Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 8:4-7, 11-13

Ihe Ọgụgụ ewetara n’Akwụkwọ Onye Amụma Hosea

Ha eguzowela ndịeze n’anataghị m ike. Họpụtakwa ndịisi n’emeghị ka m mara. Ha ejila ọlaọcha na ọlaedo kpụọrọ onwe ha arụsị maka mbibi ha.

Ajụla m arụsị nwa ehi ị kpụrụ, O Sameria! Iwe m na-enwu ka ọkụ megide ha; kedụ mgbe ha ga-adịkwa ọcha ọzọ n’Izrel? Ọ bụ onye ọrụaka mere ya, ọ bụghị Chukwu.

A ga-akụricha arụsị nwa ehi nke Sameria ahụ. Ebe ha na-akụ ifufe, ha ga-aghọtakwa oke ifufe. Osisi ọka ha amịtaghị mkpụrụ ọbụla, ma a sị na ọ mịtara ndị mba ọzọ ga-ata ya.

N’ihina Ifrem arụọla ọtụtụ ebe nchụaja maka njọ ya, ebe nchụaja ndị a abụrụla ya ebe a na-eme njọ. Ọ bụrụ na-edeturu m iwu m nye ha ugboro puku kwuru puku, ha ga-ewere ya ka ihe si na mba ọzọ bịa.

Ha hụrụ ịchụ aja n’anya ha na-eji ụmụanụmaanụ achụrụ m aja ma riekwa ya; mana Yahweh enweghị mmasị n’ebe aja ha dị.

Ugbu a, ọ ga-echeta mmehie ha ma taa ha ahụhụ maka njọ ha, ha ga-alaghachi azụ n’Ijipt.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 115:3-4, 5-6, 7-8, 9-10

Azịza: Ụlọ nke Izrel tuụwasịrịobi n’Onyenweanyị

1. Chineke anyị nọ n’eluigwe,

na-eme ihe ọbụla masịrị ya

Arụsị ha bụ ọlaọcha na ọlaedo,

ọrụ aka ndị mmadụ.

Azịza: Ụlọ nke Izrel tuụwasịrịobi n’Onyenweanyị

2. Ha nwere ọnụ ma ha anaghị ekwu okwu,

nwee anya ma ha anaghị ahụ ụzọ.

Ha nwere ntị ma ha anaghị anụ ihe,

imi, ma ha anaghị anụ isi ihe.

Azịza: Ụlọ nke Izrel tuụwasịrịobi n’Onyenweanyị

3. Ha nwere aka ma ha ejighị ya emetụ ihe,

ụkwụ ma ha ejighị ya aga ije,

Ndị niile mere ha na-adị ka ha,

Otu ahụkwa ka ha ga-adị bụ ndị niile tụkwasịrịobi na ha.

Azịza: Ụlọ nke Izrel tuụwasịrịobi n’Onyenweanyị

MBEKU – 2 Thes 2:14

Alleluia, Alleluịa:

Site n’oziọma anyị, Ọ kpọrọ ụnụ ka ụnụ wee nweta otito nke Dinwenụ anyị Jesu Kristi.

Alleluịa.

OZIỌMA – 9:32-38

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Ụfọdụ mmadụ kpọtaara Jesu otu onye dara ogbi, nke ajọ mmụọ ji. Mgbe ọ chụpụrụ ajọ mmụọ ahụ, onye ogbi ahụ malitere kwube okwu. Nke a tụrụ igwe mmadụ ahụ n’anya, ha wee na-asị: “Anyị ahụbeghị ihe dị otu a n’ala Izrel mbụ”.

Ndị Farisii nọ ebe ahụ kwuru sị, “Ọ na-esi n’ike onyeisi ndị ajọ mmụọ achụpụ ajọ mmụọ”. Jesu na-agagharị n’obodo na n’ogbe ha niile, na-akụzi nkuzi n’ụlọ nzukọ ha, na-ekwusa oziọma nke alaeze Chineke, na-agwọkwa ọrịa na nrịanrịa ha niile.

Mgbe ọ hụrụ ọtụtụ igwe mmadụ ahụ, ebere ha mere ya, n’ihina ha nọ na nsogbu. Ha enweghịkwa onye enyemaka, ha dịka atụrụ na-enweghị onye nche.

Jesu wee gwa ndị na-eso ụzọ ya sị: “Owuwe ihe ubi bara ụba, mana ndị ọrụ dị olemaole, Ya bụ, rịọnụ Dinwenụ nke owuwe ihe ubi ka o ziga ndị ọrụ n’ugbo ya.

Igbo Mass Readings for July 8 2026, Wenezde Izuụka nke Iri na Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume

Igbo Mass Readings for July 7 2026, Tuzde Izuụka nke Iri na Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.