Igbo Mass Readings for August 5 2025, Tuezde n’ime Izuụka nke Iri na Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for August 5 2025, Tuezde n’ime Izuụka nke Iri na Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 12:1-13
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Ọnụọgụgụ
Mosis lụrụ onye Etiopia. Miriam na Erọn wee kwutọọ ya n’ihi ya. Ha sịrị, “Ọ bụ naanị site n’ọnụ Mosis ka Yahweh si ekwu okwu? Ọ bụ na ọ naghị esikwa n’ọnụ anyị ekwu okwu?” Yahweh nụrụ ihe ha kwuru.
Mosis dị umeala karịa ndị niile nọ n’ụwa mgbe ahụ. Ozigbo ahụ, Yahweh gwa Mosis na Erọn, na Miriam sị, “Achọrọ m ka ụnụ atọ bịakwute m n’ ụlọikwu ebe obibi m.”
Ha wee Jee. Yahweh gbadatara n’ogidi igwe ojii, guzo n’ọnụụzọ ụlọikwu nsọ ahụ, kpọọ Erọn na Miriam oku. Ha abụọ wee pụta. Yahweh wee sị ha: Nụrụnụ ihe m na agwa ụnụ!
Ọ bụrụ na ndị amuma nọ n’etiti ụnụ, aga m egosi ha onwe m n’ọhụ gwakwa ha okwu na nrọ. Ma ihe dị iche dị mgbe m na agwa odibo m, bụ Mosis okwu.
Emere m ka ọ bụrụ onye nlekọta ndị nke m bụ Izrel. N’ihi nke a, ana m agwa ya okwu ihu na ihu, otu ọ ga-edo ya anya, ọ bụghị n’ilu. Ya mere, gịnị mere ụjọ atụghị ụnụ ikwu okwu megide odibo m bụ Mosis? Yahweh wesoro ha iwe si n’ebe ha nọ pụọ.
Ozigbo igwe ojii ahụ si n’Ụlọikwu nsọ ahụ na-apụ, ahụ Miriam jupụtara n’ekpenta, nke na-acha gbaa. Mgbe Erọn lere ya anya ọ hụrụ na ekpenta ezuola ya ahụ.
Erọn wee gwa Mosis sị, “Nna anyị ukwu, biko, enyela anyị ụdị ahụhụ nke a, n’ihi mmehie anyị jiri nzuzu mee.
Biko, ekwela ka ahụ Miriam nwụọ mọbụ gbụchasịa otu akụkụ dịka nwa nwụrụ n’ime afọ nne ya.” Ya mere, Mosis tikuru Yahweh sị,” Chineke biko mee ka ahụ ya dịkwa mma ọzọ!”
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 51: 3-4, 5-6, 6-7, 12-13
Azịza: Meere anyị ebere, Dinwenụ, n’ihina anyị emeela njọ
1. Meere anyị ebere, Dinwenụ, n’ihi na anyị emeela njọ
Site na nnukwu obi ebere gị hichapọ njọ m niile;
Sachapụ mmehie m niile
wụchapụ m na njọ m.
Azịza: Meere anyị ebere, Dinwenụ, n’ihina anyị emeela njọ
2. N’ihina amarala m mmehie m niile
njọ m nọ na mmụọ m oge niile.
Ọ bụ sọ gị naanị gị ka m mere njọ megide
ihe dị njọ n’ ihu gị ka m mere.
Azịza: Meere anyị ebere, Dinwenụ, n’ihina anyị emeela njọ
3. Ya bụ ikpe amaghị gị n’ikpe i kpere m
ụta adịghịrị gị ma ị ma m ikpe.”
Ị maara na a mụrụ m n’ ime njọ
abụ m onye njọ site na mgbe a tụrụ ime.
Azịza: Meere anyị ebere, Dinwenụ, n’ihina anyị emeela njọ
4. Chineke, kenye obi dị ọcha n’ime m
tinye n’ime m mmụọ ọhụrụ na nke siri ike.
Achụpụkwala m n’ ihu gị
anapụkwala m mmụọ nsọ gị’.
Azịza: Meere anyị ebere, Dinwenụ, n’ihina anyị emeela njọ
MBEKU – Jọn 6:64,69
Alleluia, Alleluia
Okwu ndị m gwara ụnụ bụ mmụọ bụrụkwa ndụ. Gị ji okwu nke ndụ ebeebe.
Alleluia
OZIỌMA – 14:22-36
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Mgbe nke a gachara, Jesu gwara ndị na- eso ụzọ ya ka ha banye n’ụgbọmmiri buru ya ụzọ kwọfee n’ofe nke ọzọ; ma ya onwe ya nọdụrụ ka o zilaga igwe mmadụ ahụ.
Mgbe o zilachara ha, ọ gara n’ugwu ebe naanị ya ga-anọ kpee ekpere. Naanị ya nọ ebe ahụ ruo oge mgbede.
N’oge a ụgbọmmiri ha agamiela n’ime osimiri; ebilimmiri na ebugharị ya n’ihina ifufe na-efegide ya. N’elekere anọ nke chi ọbụbọ Jesu bịakwutere ha na-aga ije n’elu mmiri.
Mgbe ndị na-eso ụzọ ya hụrụ ya ka ọ na-aga ije n’elu mmiri egwu jidere ha, ha wee sị, “Ọ bụ mmụọ!” Ha tiri mkpu n’ihi egwu. Ozigbo ahụ ọ gwara ha sị, “Obi sie ụnụ ike ọ bụ m ụjọ atụla ụnụ!”
Pita zara ya sị, “Onyenweanyị ọ bụrụ na ọ bụ gị gwa m ka m bịakwute gị n’elu mmiri.” Ọ zaa ya sị “Bịa!” Pita siri n’elu ụgbọmmiri pụta, gaa ije n’elu mmiri, gakwuru Jesu.
Mgbe ọ hụrụ ifufe ahụ egwu jidere ya, o wee malite imikpu na mmiri. O tiri mkpu sị, “Onyenweanyị zọpụta m.”
Ngwa ngwa Jesu setịrị aka ya ghọta Pita sị ya, “Gị onye obere okwukwe, gịnị mere I ji nwee obi abụọ?” Mgbe ha batara n’ime ụgbọ, oke ifufe ahụ wee kwụsị.
Ndị nọ n’ụgbọ ahụ wee kpọọrọ ya isiala, na-ekwu sị, “N’ezie, ị bụ nwa Chineke.” Mgbe ha gafere n’akụkụ nke ọzọ, ha bịarutere n’ala Jenesaret.
Mgbe ndị obodo matara na ọ bụ Jesu, ha zisara ozi gburugburu obodo niile dị n’ala ahụ wee kpọtara ya ndị niile ahụ adịghị ike bụ ndị rịọrọ Jesu ka ha metụ ọ bụladị naanị ọnụ uwe ya aka. Ndị niile metụrụ ọnụ uwe ya aka e mere ka ahụ dị ha ike.
Igbo Mass Readings for August 6 2025, Emume Nnwogha nke Onyenweanyị.
Igbo Mass Readings for August 5 2025, Tuezde n’ime Izuụka nke Iri na Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.