Igbo Mass Readings for August 4 2026, Tuezde n’ime Izuụka nke Iri na Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for August 4 2026, Tuezde n’ime Izuụka nke Iri na Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 30:1-2, 12-15, 18-22
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Onye Amụma Jeremiah
Okwu nke a bịakwutere Jeremaya site n’aka Yahweh. “Lee Ọ bụ Yahweh na-ekwu, Chineke nke Izrel: deba n’akwụkwọ, okwu niile nke m gwara gị.
Yahweh na-ekwu nke a, mmerụ ahụ ụnụ agaghị enwe ngwọta, ọnya ụnụ bukwara ibu. O nweghịkwa onye nwere ike ịrịọtara ụnụ, o nweghị ọgwụ ọbụla dị maka ọnya ụnụ, o nweghịkwa ngwọta ọbụla dịịrị ụnụ.
N’ihina ndị enyi gị niile echefuola gị, ha anaghịkwa elebara gị anya ọzọ, n’ihina emeela m ka onyeiro gị merụọ gị ahụ, ahụhụ nke si n’aka onyeiro obi tachiri, n’ihina njọ gị karịrị akarị mmehie gị na-achake achake.
Gịnị mere i ji ebe akwa maka mmerụ ahụ gị? Ihe mgbu gị enweghị ngwọta n’ihina ihe ọjọọ gị buru ibu njọ gị na-achakekwa achake. Ọ bụ m mere gị ihe ndị a.”
Yahweh kwuru nke a: N’eziokwu a ga eweghachite iheọma niile nke ụlọ Jekọb, ma nweekwa obi ebere n’ebe ndị bi n’ime ya nọ; a ga-arụzi obodo a n’elu aja ọgba ya, obi eze abịa kwụrụkwa ebe ọ nọọrọ na mbụ.
Ukwe ekele ga-esi n’ọnụ ha apụta, ya na olu ndị na-enwe añụrị. Aga m eme ka ha dị ụbara, ha agaghịkwa adị nta ọzọ; aga m eme ha ka ha nwee ugwu, ha agaghị adị olemaole.
Ụmụ ha ga-adị otu ha na-adị na mgbe ochie, a gakwa arụlite ọgbakọ ha n’ihu m, ma aga m ata ndị niile na-emegbu ha ahụhụ.
Nwa eze ha ga abụkwa otu onye n’ime ha, onye ọchịchị ha ga-esikwa n’etiti ha; aga m eme ya ka ọ bịaruo m nso, ma ọ ga-abịakwutekwa m, ma olee onye ga-anwa n’onwe ya ị bịakwute m?
Yahweh na-ekwu. Mgbe ahụ ụnụ ga-abụ ndị nke m, mụ abụrụ Chineke ụnụ.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 102: 15-17,18-20,28,21-22
Azịza: Onyenweanyị ga-arụgharị Zayọn, mekwaa ka a hụ ebube ya.
1. Mba niile ga-atụ aha nke Onyenweanyị egwu,
ndịeze ụwa niile ga-asọpụrụ otito gị;
N’ihina Onyenweanyị ga-arụgharị Zayọn;
mekwaa ka a hụ ebube ya.
Ọ ga-aza ekpere ndị ogbenye, ọ gaghị ajụ arịrịọ ha.
Azịza: Onyenweanyị ga-arụgharị Zayọn, mekwaa ka a hụ ebube ya.
2. Ka e debaa ihe ndị a n’akwụkwọ maka agbụrụ ndị ga-abịa n’ihu,
Ka ndị niile amụbeghị amụ were nwee ike too Onyenweanyị
Onyenweanyị sitere n’ebe nke ya dị asọ were ledata anya,
O sitere n’eluigwe na-ele ụwa anya
ka o were nụrụ ude ndị nọ na mkpọrọ na-asụ,
ka o were tọhapụ ndị a mara ikpe ọnwụ.
Azịza: Onyenweanyị ga-arụgharị Zayọn, mekwaa ka a hụ ebube ya.
3. Ụmụodibo gị ga-ebi n’udo,
ụmụ ụmụ ha ga-akwụdosikwa ike n’ihu gị.
N’ihi nke a aha Onyenweanyị ga-ewu ewu na Zayọn
otito ya ga-adịkwa na Jerusalem;
Mgbe mba niile na alaeze niile
ga-agbakọta ọnụ ife Onyenweanyị.
Azịza: Onyenweanyị ga-arụgharị Zayọn, mekwaa ka a hụ ebube ya.
MBEKU – Jọn 6:64,69
Alleluia, Alleluia
Okwu ndị m gwara ụnụ bụ mmụọ bụrụkwa ndụ. Gị ji okwu nke ndụ ebeebe.
Alleluia
OZIỌMA – 14:22-36
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Mgbe nke a gachara, Jesu gwara ndị na- eso ụzọ ya ka ha banye n’ụgbọmmiri buru ya ụzọ kwọfee n’ofe nke ọzọ; ma ya onwe ya nọdụrụ ka o zilaga igwe mmadụ ahụ.
Mgbe o zilachara ha, ọ gara n’ugwu ebe naanị ya ga-anọ kpee ekpere. Naanị ya nọ ebe ahụ ruo oge mgbede. N’oge a ụgbọmmiri ha agamiela n’ime osimiri; ebilimmiri na ebugharị ya n’ihina ifufe na-efegide ya.
N’elekere anọ nke chi ọbụbọ Jesu bịakwutere ha na-aga ije n’elu mmiri. Mgbe ndị na-eso ụzọ ya hụrụ ya ka ọ na-aga ije n’elu mmiri egwu jidere ha, ha wee sị, “Ọ bụ mmụọ!”
Ha tiri mkpu n’ihi egwu. Ozigbo ahụ ọ gwara ha sị, “Obi sie ụnụ ike ọ bụ m ụjọ atụla ụnụ!” Pita zara ya sị, “Onyenweanyị ọ bụrụ na ọ bụ gị gwa m ka m bịakwute gị n’elu mmiri.”
Ọ zaa ya sị “Bịa!” Pita siri n’elu ụgbọmmiri pụta, gaa ije n’elu mmiri, gakwuru Jesu. Mgbe ọ hụrụ ifufe ahụ egwu jidere ya, o wee malite imikpu na mmiri. O tiri mkpu sị, “Onyenweanyị zọpụta m.”
Ngwa ngwa Jesu setịrị aka ya ghọta Pita sị ya, “Gị onye obere okwukwe, gịnị mere I ji nwee obi abụọ?” Mgbe ha batara n’ime ụgbọ, oke ifufe ahụ wee kwụsị.
Ndị nọ n’ụgbọ ahụ wee kpọọrọ ya isiala, na-ekwu sị, “N’ezie, ị bụ nwa Chineke.” Mgbe ha gafere n’akụkụ nke ọzọ, ha bịarutere n’ala Jenesaret.
Mgbe ndị obodo matara na ọ bụ Jesu, ha zisara ozi gburugburu obodo niile dị n’ala ahụ wee kpọtara ya ndị niile ahụ adịghị ike bụ ndị rịọrọ Jesu ka ha metụ ọ bụladị naanị ọnụ uwe ya aka. Ndị niile metụrụ ọnụ uwe ya aka e mere ka ahụ dị ha ike.
Igbo Mass Readings for August 5 2026, Wenezde Izuụka nke Iri na Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Igbo Mass Readings for August 4 2026, Tuezde n’ime Izuụka nke Iri na Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.