Igbo Mass Readings for August 11 2026, Tuzde Izuụka nke Iri na Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for August 11 2026, Tuzde Izuụka nke Iri na Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 2:8-3:4
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Onye Amụma Ezekiel
Yahweh sịrị m, “Ma gị, nwa nke mmadụ, nụrụ ihe m na-agwa gị: adịkwala ka ndị nnupụisi a, meghee ọnụ rie ihe nke m ga-enye gị.”
Mgbe m lere anya, ahụrụ m aka e setịpụtaara m, nke ji akwụkwọ a pịakọtara apịakọta n’ime ya. O wee saghee ya n’ihu m e dere ya ihe n’ihu na azụ. Ihe e dere n’ime ya bụ okwu na-eweta ịkwa akwa, iru ụjụ na ịsụ ude.
O wee sị m, “Nwa nke mmadụ, rie ihe nke e nyere gị, rie akwụkwọ nke a a pịakọtara apịakọta, ma gaa gwa ụlọ Izrel okwu.” Ya mere, m meghee ọnụ m, O nye m akwụkwọ ahụ ka m rie.
Ọ sị m, “Nwa nke mmadụ, rie akwụkwọ nke a m na-enye gị ka I rijuo afọ gị.” Mgbe m riri ya, ọ dị m ụtọ dịka mmanụ añụ. Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, gaa n’ụlọ Izrel gwa ha okwu nke m.”
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 119: 14, 24, 72, 103, 111, 131
Azịza: Lee ka nkwa gị siri dị ụtọ karịa mmanụ añụ n’ọnụ m.
1. Ana m enwe añụrị n’iso iwu gị
Kama akụnụụba niile nke ụwa a.
Azịza: Lee ka nkwa gị siri dị ụtọ karịa mmanụ añụ n’ọnụ m.
2. Iwu gị na-atọ m ụtọ
na-adụkwa m ọdụ.
Azịza: Lee ka nkwa gị siri dị ụtọ karịa mmanụ añụ n’ọnụ m.
3. Iwu siri n’ọnụ gị pụta ka mma,
Karịa puku kwuru puku ọlaọcha na ọlaedo.
Azịza: Lee ka nkwa gị siri dị ụtọ karịa mmanụ añụ n’ọnụ m.
4. Lee ka okwu gị siri dị m ụtọ,
ọ dị ụtọ karịa mmanụ añụ n’ọnụ m.
Azịza: Lee ka nkwa gị siri dị ụtọ karịa mmanụ añụ n’ọnụ m.
5. Iwu gị na-ewetara obi m añụrị,
ha bụ ihe nke m ketara ruo mgbe ebighịebi.
Azịza: Lee ka nkwa gị siri dị ụtọ karịa mmanụ añụ n’ọnụ m.
6. Eghebere m ọnụ na-eku ume
n’ihi agụụ nke iwu gị.
Azịza: Lee ka nkwa gị siri dị ụtọ karịa mmanụ añụ n’ọnụ m.
MBEKU – Matiụ 11:25
Alleluia, Alleluia:
Ana m ekele gị Nna Dinwenụ nke eluigwe na ụwa, n’ihina i kpugheere ụmụntakịrị ihe ndị a I zonahụrụ ndị amamihe na ndị okemmụta.
Alleluia.
OZIỌMA – 18:1-5, 10, 12-14
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
N’oge ahụ ndị na-eso ụzọ Jesu bịakwutere ya jụọ ya sị, “Olee onye kachasị ibe ya ukwuu n’alaeze eluigwe?”
O wee kpọrọ otu nwatakịrị kwụba ya ọtọ n’etiti ha sị, “N’ezie agwa m ụnụ, ọ bụrụ na ụnụ agbanweghị dịka ụmụntakịrị, ụnụ agaghị aba n’alaeze eluigwe.
Onye ọbụla nke wedara onwe ya ala dịka nwatakịrị a, ọ bụ ya kachasị ukwu n’alaeze eluigwe. “Onye ọbụla nke ga-anabata nwatakịrị dị otu a nke ọma n’aha m anabatala m.
Lezienụ anya ka ụnụ ghara ileli otu n’ime ụmụaka ndị a. N’ihina ana m agwa ụnụ na ndị mmụọọma ha nọ n’eluigwe na-ahụ ihu Nna m nke bi n’eluigwe oge niile.
N’ihina Nwa nke mmadụ bịara ịzọpụta ndị furu efu. Gịnị ka ụnụ chere? Ọ bụrụ na otu onye nwere otu narị atụrụ, ma otu n’ime ha agahie ụzọ, ọ bụ na ọ gaghị ahapụ iri itoolu na itoolu ndịọzọ n’elu ugwu gaa ịchọ nke ahụ gahiere ụzọ?
Ọ bụrụ na o nwere ka o si chọta ya, n’ezie agwa m ụnụ, ọ ga-añụrị ọñụ n’ihi ya karịa otu ọ ga-esi ñụrịa n’ihi iri itoolu na itoolu ndịọzọ ahụ na-agahịeghị ụzọ.
Ya mere, ọ bụghị uche Nna m nke bi n’eluigwe ka otu n’ime ụmụaka ndị a laa n’iyi.
Igbo Mass Readings for August 12 2026, Wenezde Izuụka nke Iri na Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume
Igbo Mass Readings for August 11 2026, Tuzde n’ime Izuụka nke Iri na Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.