Igbo Mass Readings for June 16 2026, Tuzde Izuụka nke Iri na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for June 16 2026, Tuzde Izuụka nke Iri na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 21:17-29
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Akwụkwọ nke Mbụ nke Ndịeze
Elijah onye Tishbe nwetara okwu nke Yahweh nke sịrị ya: “Bilie, gaa zute Ahab eze Izrel na Sameria. Ị ga-ahụ ya n’ubi vaịn Nabọt, ọ gbadala ebe ahụ iweghara ya. Ị ga asị ya, ‘Osebụrụwa na-ekwu nke a sị: Ọ kwa I gbuola ọchụ were aka ike na-ewere ihe abụghị nke gị?
N’ihi nke a, ọ bụ Yahweh na-ekwu, n’ebe ahụ nkịta ndị ahụ rara ọbara Nabọt ka nkịta gakwa ara ọbara gị.”‘ Ahab sịrị Elaịja, “Ya bụ na I jidela m, onyeiro m?”
Elaịja azaa ya sị, “Ejidela m gị maka ihu abụọ gị n’ebe i merela ihe na-ewe Yahweh iwe. Aga m ezitere gị oke ọdachi, aga m azachapụ gị bịa kpochapụ nwoke ọbụla nọ n’ụlọ Ahab, ma ohu ma onye nwe onwe ya n’Izrel.
Aga m emekwa ezinụụlọ gị dịka m si mee ezinụụlọ Jeroboam nwa Nebat nakwa nke Baasha nwa Ahija maka iwe ị kpasuru m na maka ihe ọjọọ nke i dunyere Izrel.
Osebụrụwa kwukwara ghasara Jeribel sị, “Nkịta ga-eri Jezibel n’ime Jezril. Onye ezinụụlọ Ahab ọbụla nwụrụ n’ebe ndị mmadụ bi nkịta ga-eri ya, nke nwụrụ n’ịkpa ụmụnnụnụ nke igwe ga-erikwa ya.
Ma n’ezie o nweghị onye yiri Ahab na-ime mpụ nakwa na-ime ihe na-ewe Yahweh iwe site na mmanye nwaanyị ya Jezibel. Ọ rụrụ ala n’ụzọ kacha dị ukwuu site n’ife arụsị dịka ndị Amọ si mee, nke na Yahweh napụrụ ha akụ ha were ha nye Izrel.
Mgbe Ahab nụrụ okwu ndị ahụ ọ dọkara uwe ya, bịa yiri naanị nkịrịka akwa, bịakwa buo ọnụ. O ji nkịrịka akwa ahụ na-arahụ ụra na-agakwa ka onye a na-emegbu emegbu.
Elaịja onye Tishbe nwetara okwu nke Yahweh nke sịrị ya: “Ị hụla ka Ahab si weda onwe ya ala n’ihu m? Ebe o wedara onwe ya n’ihu m, agaghị m ezite mbibi ahụ n’oge nke ya, mana aga m ezidata mbibi ahụ n’ezinụụlọ ya n’oge nke nwa ya.”
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 51:1-2,3-4,9,14
Azịza: Meere anyị ebere O Chineke n’ihina anyị emehiego
1. Meere m ebere O Chineke site n’ịhụnaanya gị,
Site na nnukwu obi ebere gị hichapụ njọ m niile;
Sachapụ mmehie m niile
wụchapụ m na njọ m.
Azịza: Meere anyị ebere O Chineke n’ihina anyị emehiego
2. N’ihina amarala m mmehie m niile,
njọ m nọ na mmụọ m oge niile.
Ọ bụ sọ gị, naanị gị, ka m mere njọ megide,
ihe dị njọ n’ihu gị ka m mere.
Azịza: Meere anyị ebere O Chineke n’ihina anyị emehiego
3. Elekwala anya na njọ m
ma hichapụ mmehie m niile.
Si n’ọnwụ zọpụta m Chineke onye nzọpụta m
Ka ire m wee kwupụta ịkwụba aka ọtọ gị.
Azịza: Meere anyị ebere O Chineke n’ihina anyị emehiego
MBEKU – 1 Jọn 2:5
Alleluia, Alleluia:
Onye ọbụla nke na-edobe okwu nke Kristi, n’ezie ịhụnaanya maka Chineke zuru oke n’ime ya.
Alleluia.
OZIỌMA – 5:43-48
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Ụnụ anụla na e kwuru sị, ‘Ị ga-ahụ onye agbataobi gị n’anya, ma kpọọ onyeiro gị asị’.
Ma ana m agwa ụnụ, hụnụ ndịiro ụnụ n’anya, na-ekpekwaranụ ndị na-emegbu ụnụ ekpere, ka ụnụ wee bụrụ ụmụ nke Nna ụnụ bi n’eluigwe n’ihina ọ na eme ka anyanwụ ya chakwasị ma ndị ajọ mmadụ, ma ndị ezigbo mmadụ.
Ọ na-emekwa ka mmiri na-ezoro ma ndị ọma ma ndị ọjọọ. Ọ bụrụ na ụnụ na-ahụ naanị ndị enyi ụnụ n’anya, kedụ ụgwọ ọrụ pụrụ iche ụnụ ga-anata n’aka Chineke?
Ọbụladị ndị ọna ụtụ na-emekwa otu ahụ. Ọ bụrụ na ụnụ na-ekele naanị ụmụnne ụnụ, kedụ ihe pụrụ iche ụnụ mere karịa ndịọzọ?
Ọ bụ na ndị na-ekpere arụsị anaghị eme otu abụ? Ya bụ, hụnụ onwe ụnụ ga-ezu oke dịka Nna ụnụ nke bi n’eluigwe siri zuo oke.
Igbo Mass Readings for June 17 2026, Wenezde Izuụka nke Iri na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume
Igbo Mass Readings for June 16 2026, Tuzde Izuụka nke Iri na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.