Igbo Mass Readings for June 9 2026, Tuezde n’ime Izuụka nke Iri N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for June 9 2026, Tuezde n’ime Izuụka nke Iri N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 17:7-16

Ihe Ọgụgụ ewetara n’Akwụkwọ nke Mbụ nke Ndịeze

Mmiri ahụ (ebe Elaija zoro) nọkatara takpọọ n’ihi ụkọ mmiri ozuzo e nwere n’ala ahụ. Ọ bịa nụ okwu nke Onyenweanyị nke sị ya: “Bilie gaa biri na Zarefat nke dị na Sidọn; enyele m otu nwaanyị isimkpe nọ ebe ahụ iwu ka ọ zụọ gị nrị.”

Elaịja ebilie gawa Zarefat. Mgbe o rutere n’ọnụụzọ ama obodo ahụ ọ hụrụ otu nwaanyị isimkpe nọ ebe ahụ akpa nkụ. Ọ kpọọ ya sị, “Kunyetụ m mmiri ka m ñụọ.”

Ka ọ na-aga ime nke a, ọ kpọghachiri ya azụ sị ya, “Biko wetakwuoro m otu ibe achịcha.” Ọ zara ya sị, “N’aha Chineke dị ndụ, o nweghị ihe oriri m nwere karịa nwa obere ntụọka na nwa ntakịrị mmanụ dị n’ite.

Nkụ olemaole a ị hụrụ mụ na-atụtụkọta bụ ka m were ha ga sie ya, ka mụ na nwa m nwoke rie cherezie ọnwụ.” Ma Elaịja sịrị ya, “Atụla egwu, gaa mee ka i siri kwuo, ma buru ụzọ metere m ntakịrị.

E mechaa, i mezie nke gị na nwa gị. N’ihi na Osebụrụwa Chineke nke Izrel na-ekwu sị, ‘Ntụọka agaghị agwụ n’udu, nke mmanụ ga-akọ n’ite ruo mgbe Yahweh ga-ezite mmiri n’ụwa.”

Ọ gara mee dịka Elaịja si kwuo. Elaịja, nwaanyị a na ezinụụlọ ya nwegideziri ihe oriri ogologo oge. Dịka Yahweh siri n’ọnụ Elaịja kwuo, udu ntụọka ahụ agwụghị, nke mmanụ jiri kọọ n’ite.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 4: 1-2, 2-3, 6-7

Azịza: Onyenweanyị mee ka ihu gị chawapụta n’ebe anyị nọ.

1. Chineke onye nchedo m za m mgbe m kpọkuru gị.

Mgbe m nọ na nsogbu Ị na-enyere m aka.

Ugbu a meere m ebere nụrụ ekpere m.

Ụnụ ndị mmadụ gịnị mere ụnụ ji akpọchi obi ụnụ ogologo oge?

Ụnụ na-ahụ ihe efu n’anya na-amakụ okwu asị.

Azịza: Onyenweanyị mee ka ihu gị chawapụta n’ebe anyị nọ.

2. Matanụ na Onyenweanyị na-arụrụ ndị kwere na ya ọrụ ịtụnaanya.

Onyenweanyị na-aza m oku mgbe m kpọkuru ya.

Kpacharanụ anya hapụnụ ime njọ;

n’anyasi nọdụ jụụ chee echiche n’ime obi ụnụ.

Azịza: Onyenweanyị mee ka ihu gị chawapụta n’ebe anyị nọ.

3. Gosi anyị ihe nke ihu gị O Onyenweanyị

mee ka ọ Chawapụta n’ebe anyị nọ!

Onyenweanyị I nyela mkpụrụobi m añụrị

Karịa nke mmanya na nri ọka na-enye.

Azịza: Onyenweanyị mee ka ihu gị chawapụta n’ebe anyị nọ.

MBEKU – Ps. 119:105

Alleluia, Alleluịa:

Okwu gị bụ mpanaka na edu m, bụrụkwa ihe n’ụzọ m.

Alleluia.

OZIỌMA – 5:13-16

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Ụnụ bụ nnu nke ụwa. Ma ọ bụrụ na nnu atụfuo ụtọ ya, kedụ otu a ga-esi weghachi ụtọ ya? O nweghịkwa uru ọzọ ọ bara karịa ịwụfu ya n’ezi ndị mmadụ azọba ya ụkwụ.

Ụnụ bụ ihe nke ụwa. Obodo a rụrụ n’elu ugwu adịghị na nzuzo. Ndị mmadụ anaghị amụnye ọkụ were ite kpuchie ya.

Kama, a na-amụnye ya dọba ya n’elu ihe e ji adọba ọkụ, ka ọ na-enye ndị niile nọ n’ime ụlọ ihe. Meenụ ka ihe ụnụ chawapụta n’ihu mmadụ niile, ka ha wee hụ ọrụ ọma ụnụ wee too nna ụnụ nke bi n’eluigwe.

Igbo Mass Readings for June 10 2026, Wenezde Izuụka nke Iri N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings for June 9 2026, Tuezde n’ime Izuụka nke Iri N’Oge Adanyeghị n’Emume.