Igbo Mass Readings for February 10 2026, Tuezde n’ime Izuụka nke Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for February 10 2026, Tuezde n’ime Izuụka nke Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 8:22-23, 27-30
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Akwụkwọ Ndịeze nke mbụ
Solomọn kwụụrụ n’ihu ebe nchụaja nke Chineke n’ihu ọgbakọ ụmụ Izrel niile wee cheeaka ya n’elu sị, “Yahweh Chineke nke Izrel, o nweghị Chineke dịka gị n’eluigwe mọbụ n’ụwa nke nwere ọgbụgbandụ na ịhụnaanya siri ike n’ebe ndị nke gị, ndị ji obi ha niile na-eso ụzọ gị, nọ.
“Ma, Chineke ọ ga-ebi n’ụwa n’eziokwu? Lee, eluigwe agaghị aba gị, ma ya bụrụzie obere ụlọ a nke m rụrụ. Ma, nụrụ ekpere nwodibo gị, chee ntị n’arịrịọ ya; Yahweh Chineke m, nụrụ mkpu akwa na ekpere nwodibo gị na-ekpe n’ihu gị ụbọchị taa.
Ka anya gị dị oghe ehihie na anyasị ilekọta ụlọ a nke i kwuru maka ya sị, ‘Aha m ga-adị na ya’ ka i wee nụrụ arịrịọ nwodibo gị na-arịọ n’ebe a.
Nụrụ ekpere nwodibo gị na nke ndị nke gị Izrel ga-ekpe n’ebe a, nọrọ n’eluigwe ebe obibi gị nụrụ, ma mgbe ị nụrụ biko gbaghara.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 84: 2,3,4,9,10
Azịza: Lee ka ụlọ obibi gị siri makarịchaa mma, Osebụrụwa, Chineke pụrụ ime ihe niile.
1. Ọ na-agụ m nnukwu agụụ
ka m bata n’ogige Osebụrụwa,
ka mkpụrụobi m na anụahụ m
na-ekwere Chineke dị ndụ ukwe ọñụ.
Azịza: Lee ka ụlọ obibi gị siri makarịchaa mma, Osebụrụwa, Chineke pụrụ ime ihe niile.
2. Ka o si dị, nnụnụ ebelebe na-achọtara onwe ya ụlọ obibi
Nnụnụ eleke achọtara onwe ya akwụ
Ebe ọ ga-edote ụmụ ya
N’akụkụ ebe nchụaja gị, Onyenweanyị onye pụrụ ime ihe niile
Onye bụ eze m na Chineke m.
Azịza: Lee ka ụlọ obibi gị siri makarịchaa mma, Osebụrụwa, Chineke pụrụ ime ihe niile.
3. Ha bụ ndị agọziri agọzi, ndị bi n’ụlọ gị
Na-ekwere gị ukwe otito oge niile
Meere onyeeze anyị ebere, O Chineke
Meere onye ahụ I tere mmanụ eze ebere.
Azịza: Lee ka ụlọ obibi gị siri makarịchaa mma, Osebụrụwa, Chineke pụrụ ime ihe niile.
4. N’ihina otu ụbọchị n’ebe gị ka mma
Karịa nnụkwuru nnụ afọ ebe ọzọ
Ọ kaara m mma ịbụ onye nche ụzọ n’ụlọ nke Onynweanyị
Karịa ibi n’ebe obibi ndị ajọ mmadụ.
Azịza: Lee ka ụlọ obibi gị siri makarịchaa mma, Osebụrụwa, Chineke pụrụ ime ihe niile.
MBEKU – Jemis 1:21
Alleluia, Alleluia:
Werenụ nwaayọ nara okwu ahụ nke a kụrụla n’obi ụnụ dị ka mkpụrụ, nke pụrụ ịzọpụta mkpụrụobi ụnụ.
Alleluia.
OZIỌMA – 7:1-13
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere
Mgbe ndị Farisii na ụfọdụ ndị odeakwụkwọ si na Jerusalem bịakwutere Jesu, ha chọpụtara na ụfọdụ n’ime ndị na-eso ụzọ ya na-eri ihe n’aka rụrụ arụ, ya bụ, ha adịghị akwọ aka ha.
N’ihina ndị Farisii na ndị Juu niile adịghị eri ihe n’ebughị ụzọ kwọọ aka ha dịka omenaala ndị okenye ha si dị. Ọzọ, ọ bụrụ na ha alọta ahịa, ha adịghị eri ihe n’ebughị ụzọ doo onwe ha ọcha.
O nwekwara omenaala ndịọzọ ha na-edebe, dịka ịsa iko, na ite, na iko ọlanchara. Ya mere, ndị Farisii na ndị odeakwụkwọ jụrụ Jesu sị, “Gịnị mere ndị na-eso ụzọ gị adịghị eso omenaala ndị okenye, kama ha na-eri ihe n’akwọghị aka dịka usoro si dị?”.
Ma ọ sịrị ha, “Aịzaya buziri amụma nke ọma banyere ụnụ ndị ihu abụọ dịka e dere ya n’akwụkwọ sị, ‘Ndị a na-asọpụrụ m n’egbugbere ọnụ ha, ma obi ha dị anya n’ebe m nọ.
N’efu ka ha na-akpọ isiala enye m, Na-akụzi nkuzi nke mmadụ ka ọ bụ iwu nke Chineke. Ụnụ hapụrụ iwu nke Chineke jidesie aka ike n’omenaala nke mmadụ’.
O wee sịkwa ha, “Ụnụ nwere ụzọ aghụghọ ụnụ si ajụ idebe iwu Chineke, ka ụnụ wee nwee ike idebezu omenaala ụnụ natara! N’ihina Mosis sịrị, ‘sọpụrụ nna gị na nne gị’ kwukwaa sị, ‘Onye ọbụla kwujọrọ nne ya mọbụ nna ya kwesịrị ogbugbu’.
Mana ụnụ na-akụzi sị, ‘Ọ bụrụ na mmadụ asị nne ya mọbụ nna ya, ihe i nweere ike inweta n’aka m bụ ‘Kọban ya bụ ihe e nyere Chineke, iwu ejighịkwa ya ọzọ inyere nne ya mọbụ nna ya aka.
N’ụzọ dị otu a, ụnụ na-eme ka okwu Chineke bụrụ ihe efu, site n’omenaala ụnụ na-enyefe ndịọzọ n’aka. Ọtụtụ ihe dị otu a, ka ụnụ na-emekwa.
Igbo Mass Readings for February 11 2026, Wenezde n’ime Izuụka nke Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Igbo Mass Readings for February 10 2026, Tuezde n’ime Izuụka nke Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.