Igbo Mass Readings for May 27 2025, Tuzde Izuụka nke Isii n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi
Nke a bụ Igbo Mass Readings for May 27 2025, Tuzde n’ime Izuụka nke Isii n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 16:22-34
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Ọrụ Ndịozi
Igwe mmadụ ndị ọzọ, ndị Filipi, biliri sonye imegide ha. Ndị ikpe ahụ dọwara uwe Pọl na Saịlas, nye ikikere ka apịa ha ụtalị. Mgbe ha tichara ha ihe, ha tụbara ha n’ụlọ mkpọrọ, nye onye nche ụlọ mkpọrọ iwu, ka o chesie ha ike, ka ha ghara ịpụ.
Mgbe onye nche ahụ natara iwu nke a, ọ tụnyere ha n’ime ụlọ mkpọrọ, kpọsie ha ịga ike n’ụkwụ. N’etiti abalị, Pọl na Saịlas nọ n’ekpere, na-ekwe ukwe otito nye Chineke.
Ndị mkpọrọ ndịozo nọkwa na-ege ntị, na mberede enwere oke ala ọma jijiji, nke a mere ka ntọala ụlọ mkpọrọ ahụ maa jijiji. Ngwa ngwa ọnụụzọ niile meghere, agbụ ndị mkpọrọ niile tọpụkwara.
Onye nche ụlọ mkpọrọ tetara hụ na ọnụụzọ niile nke ụlọ mkpọrọ ghe oghe. O chere na ndị mkpọrọ niile agbalagala. Ọ mịpụtara mmaagha ya, ka o gbuo onwe ya.
Ma Pọl tiri mkpu n’oke olu sị, “Emerụla onwe gị ahụ! Anyị niile nọ n’ebe a!” Ọ kpọrọ ka eweta ọkụ. Ọ mabara n’ime, daa n’ụkwụ Pọl na Saịlas na-ama jijiji.
Ọ kpọpụtara ha, na-ajụ ha sị, “Ndị nwe mmadụ. Gịnị ka m ga-emenụ ka m wee nweta nzọpụta?” Ha zara ya sị: “kwere n’Onyenweanyị Jesu, a ga-azọpụta gị na ezinụụlọ gị.”
Ha gwara ya na ndị niile nọ n’ezinụụlọ ya okwuchukwu. N’otu elekere ahụ, n’abalị ahụ, onye nche ụlọ mkpọrọ ahụ kpọọrọ ha sachaa ọnya nke ihe e tiri ha.
N’atụfughị oge, ha mere ya na ezinụụlọ ya mimirichukwu. Ọ kpọrọ Pọl na Saịlas banye n’ụlọ ya, nye ha ihe oriri. Ya na ezinụụlọ ya niile jupụtara n’ọñụ, n’ihi na ha abụrụla ndị kwere na Chineke.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 138:1-2, 2-3, 7-8.
Azịza: Aka nri gị ga-emere m ihe niile Onyenweanyị.
1. Ejim obi m niile na-ekele gị Onyenweanyị,
n’ihina Ị nụla ekpere m!
N’ihu ndị mmụọozi niile aga m ekwere gị ukwe;
Aga m akpọ isiala n’ụlọ nsọ gị.
Azịza: Aka nri gị ga-emere m ihe niile Onyenweanyị.
2. N’ihi ịhụnaanya na ịkwụdosiike gị,
n’ihina aha gị na nkwa gị kacha dị elu.
N’ụbọchị m kpọkuru gị, Ị zara m
mekwaa ka ike m bawanye.
Azịza: Aka nri gị ga-emere m ihe niile Onyenweanyị.
3. Aka nri gị ga-emere m ihe niile
Onyenweanyị Chineke! ịhụnaanya gị na-adị ebeebe.
Ahapụkwala anyị ndị I kere.
Azịza: Aka nri gị ga-emere m ihe niile Onyenweanyị.
MBEKU
ALLELUIA ALLELUIA:
Kristi bilitere n’ọnwụ, ma mee ihe mile ka ọ dị ọhụrụ, O gosila ebere ya n’ebe mmadụ nọ.
ALLELUIA.
OZIỌMA – 16: 5-11.
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere.
Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị: “Ugbu a ana m alakwuru onye zitere m. Ọ dịghị onye n’ime ụnụ jụrụ m sị, Olee ebe Ị na-eje? N’ihina agwala m ụnụ ihe ndị a, obi ụnụ jupụtara n’ihe mwute.
Ka o sila dị, ana m agwa ụnụ eziokwu; Ọ bụ maka ọdịmma nke ụnụ ka m ga-eji ala, n’ihina ọ bụrụ na m alaghị, onye ntasịobi ahụ agaghị abịakwute ụnụ.
Ma ọ bụrụ na m laa aga m ezitere ụnụ ya. Mgbe ọ bịara, ọ ga-ata ụwa ụta banyere mmehie, eziomume na ikpe. Ọ ga-ama ha ikpe mmehie n’ihi na ha ekwenyeghị na m.
Ọ ga-ama ha ikpe eziomume n’ihi na ana m alakwuru Nna m, ụnụ agaghị ahụkwa m ọzọ. Ọ ga-akọwara ha banyere ikpe Chineke, n’ihina ekpeela onye na-achị ụwa a ikpe.
Igbo Mass Readings for May 28 2025, Wenezde Izuụka nke Isii n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi.
Igbo Mass Readings for May 27 2025, Tuzde Izuụka nke Isii n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi.