Igbo Mass Readings for February 18 2025, Tuezde n’ime Izuụka nke Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for February 18 2025, Tuezde n’ime Izuụka nke Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 6:5-8; 7:1-5, 10

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Jenesis

Yahweh hụrụ na obi ọjọọ mmadụ bara ụba n’ụwa, na ọ bụkwa sọ ihe ọjọọ ka ọ na-echepụta n’obi ya mgbe niile. O wutere Yahweh, gbawakwaa ya obi na o kere mmadụ n’ụwa.

N’ihi ya Yahweh asị “Aga m ekpochapụ ndị mmadụ m kere eke n’elu ụwa, ndị mmadụ na ụmụ anụmaanụ, ụmụ ihe na-arị arị na ụmụnnụnụ nke igwe; n’ihina o wutela m na mụ kere ha.”

Ma Yahweh gosịrị Noa obi ebere. Yahweh e were sị Noa, “Baa n’ime ụgbọ, gị na ezinụụlọ gị, n’ihina ahụla m na naanị gị bụ onye aka ya kwụ ọtọ n’agbụrụ a.

Site na ụdị anụọhịa ọbụla ndị na emerụghị emerụ, ị ga-ewere abụọ ha ụzọ asaa, otu oke na nke nne ya. Ma site n’ụmụnnụnụ nke igwe, ị ga-eweta abụọ ụzọ asaa, otu oke na nke nne, iji mụbaa ụdị ha n’elu ụwa.

N’ụbọchị asaa na-abịanụ, aga m eme ka mmiri zoo n’ụwa iri mkpụrụ ụbọchị anọ na iri abalị anọ. Aga m ekpochapụ ihe niile m kere eke n’elu ụwa”.

Noa mere dịka otu Yahweh siri nye ya iwu. Ka ụbọchị asaa gachara, oke mmiri ahụ ejupụta n’elu ụwa.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps.: 29:1-2, 3-4, 3, 9-10

Azịza: Ka Dinwenụ were udo gọzie ndị nke ya

1. Ụmụ Chineke, nyenụ Onyenweanyị

Nyenụ Onyenweanyị otito na ike,

nyenụ aha Onyenweanyị otito

feenụ Onyenweanyị n’ebe ya dị nsọ.

Azịza: Ka Dinwenụ were udo gọzie ndị nke ya

2. Olu Onyenweanyị na-ada n’elu osimiri,

olu Onyenweanyị na-edekpọ n’elu osimiri.

Olu nke Onyenweanyị dị ike,

olu nke Onyenweanyị jupụtara n’ebube.

Azịza: Ka Dinwenụ were udo gọzie ndị nke ya

3. Olu nke Onyenweanyị na-ada ka egbeigwe.

N’ụlọnsọ ya, ihe niile na-eti mkpu na-asị,

“Otito dịrị Onyenweanyị”

Onyenweanyị na-achị n’elu ide mmiri,

Ọ na-achị eze ruo ebighịebi.

Azịza: Ka Dinwenụ were udo gọzie ndị nke ya

MBEKU – Matiu 11:25

Alleluia, Alleluia:

“Ana m ekele gị Nna Dinwenụ nke eluigwe na ụwa, n’ihina i kpugheere ụmụntakịrị ihe omimi nke alaeze.

Alleluia.

OZIỌMA – 8:14-21

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere

Ndị na-eso ụzọ Jesu chefuru iwere ogbe achịcha ha ga-eri. Ihe ha nwere n’ụgbọ bụ naanị otu ogbe achịcha. Jesu dọrọ ha aka na ntị sị, “Kpacharanụ anya!

Zerenụ ihe na-eko achịcha nke ndị Farisii na nke Herọd”. Ndị na-eso ụzọ ya wee na-ekwurịta n’etiti onwe ha sị, “O kwuru nke a n’ihina anyị ejighị achịcha ọbụla”.

Jesu matara ihe ha na ekwu, ma sị ha, “Gịnị mere ụnụ ji ekwurịta n’onwe ụnụ na ụnụ enweghị achịcha ọbụla? Ọ bụ na ụnụ amụtabeghị ihe mọbụ ghọta ihe ọbụla?

Obi ụnụ ọ kpọchiri akpọchi? Ụnụ nwere anya, ma ụnụ adịghị ahụ ụzọ, ụnụ nwere ntị, ma ụnụ adịghị anụ ihe, Ọ bụ na ụnụ echetaghị?

Mgbe m nyawara ogbe achịcha ise, maka puku mmadụ ise. Iberibe achịcha ụnụ tụtụkọtara o juru nkata ole? Ha zara sị, “Nkata iri na abụọ”.

“Mgbe nyawara ogbe achịcha asaa maka puku mmadụ anọ, nkata ole ka ụnụ tụtụjuru n’ọnụ site n’iberibe achịcha nke fọdụrụnụ?” Ha zara ya sị, “Nkata asaa” O wee sị ha, “Ọ bụ na ụnụ aghọtabeghị?”.

Igbo Mass Readings for February 19 2025, Wednezde n’ime Izuụka nke Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings for February 18 2025, Tuezde n’ime Izuụka nke Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.