Igbo Mass Readings for February 17 2026, Tuezde n’ime Izuụka nke Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for February 17 2026, Tuezde n’ime Izuụka nke Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 1:12-18
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Akwụkwọozi Jemis
Ngọzi na-adịrị onye ahụ nke na-enwe ntachiobi n’ọnwụnwa. N’ ihina mgbe o meriri ọnwụnwa, ọ ga-anata, dịka ụgwọ olu ya okpueze ahụ, bụ ndụ nke Chineke kwere nkwa inye ndị hụrụ ya n’anya.
Ka onye ọbụla ghara ịsị mgbe a na-anwa ya: Ọnwụnwa nke a si n’aka Chineke! Maka na mmadụ apụghị iji ihe ọjọọ nwatalie Chineke. Kama a na-anwa onye ọbụla mgbe agụụ ihe ọjọọ nke na-agụ ya dọtara ya rafuo ya.
Mgbe ahụ agụụ ihe ọjọọ na-agụ ya ewere mụta mmehie. Mmehie n’onwe ya, mgbe o tozuru oke ewee mụta ọnwụ. Ụmụnna m hụrụ n’anya! Ụnụ ekwela ka e duhie ụnụ!
Onyinye ọbụla dị mma na nke zuru oke na-esite n’eluigwe abịa. Ha si n’aka Chineke bụ Nna nke ihe onye na-adịghị agbanwe agbanwe.
Ọ naghị ezonahụ ụmụ mmadụ ihu ya ka ọchịchịrị gbachiere ha ụzọ. Site n’uche nke aka ya o jiri okwu nke eziokwu ahụ mee ka anyị pụta iche. Meekwa ka anyị bụrụ ụdị mkpụrụ mbụ nke ihe o kere eke.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 94:12-13, 14-15, 18-19
Azịza: Onyenweanyị añụrị ga-adịrị onye ị na-agbaziri
1. Onyenweanyị añụrị ga-adịrị onye ị na-agbaziri,
onye nke ị na-akụziri site n’iwu gị.
Ị na-enye ya udo nke obi n’oge nsogbu.
Azịza: Onyenweanyị añụrị ga-adịrị onye ị na-agbaziri
2. N’ihina Onyenweanyị agaghị echezọ ndị nke ya,
Ọ gaghị echezọ ndị nke o jiri aka ya were họrọ.
Ma ikpe nkwụmọtọ ga-abịaghachi n’ụlọ ikpe,
ndị eziomume ga-agbasokwa ya.
Azịza: Onyenweanyị añụrị ga-adịrị onye ị na-agbaziri
3. Mgbe m tiri mkpu sị, ‘iyi na-achọ iri m,’
Ozigbo, i gosiri m ịhụnaanya gị site n’inyere m aka;
Oge ọbụla nsogbu juru m obi,
ị na-akasị m obi nke na-enye mmụọ m añụrị.
Azịza: Onyenweanyị añụrị ga-adịrị onye ị na-agbaziri
MBEKU – Matiu 11:25
Alleluia, Alleluia:
“Ana m ekele gị Nna Dinwenụ nke eluigwe na ụwa, n’ihina i kpugheere ụmụntakịrị ihe omimi nke alaeze.
Alleluia.
OZIỌMA – 8:14-21
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere
Ndị na-eso ụzọ Jesu chefuru iwere ogbe achịcha ha ga-eri. Ihe ha nwere n’ụgbọ bụ naanị otu ogbe achịcha. Jesu dọrọ ha aka na ntị sị, “Kpacharanụ anya!
Zerenụ ihe na-eko achịcha nke ndị Farisii na nke Herọd”. Ndị na-eso ụzọ ya wee na-ekwurịta n’etiti onwe ha sị, “O kwuru nke a n’ihina anyị ejighị achịcha ọbụla”.
Jesu matara ihe ha na ekwu, ma sị ha, “Gịnị mere ụnụ ji ekwurịta n’onwe ụnụ na ụnụ enweghị achịcha ọbụla? Ọ bụ na ụnụ amụtabeghị ihe mọbụ ghọta ihe ọbụla?
Obi ụnụ ọ kpọchiri akpọchi? Ụnụ nwere anya, ma ụnụ adịghị ahụ ụzọ, ụnụ nwere ntị, ma ụnụ adịghị anụ ihe, Ọ bụ na ụnụ echetaghị?
Mgbe m nyawara ogbe achịcha ise, maka puku mmadụ ise. Iberibe achịcha ụnụ tụtụkọtara o juru nkata ole? Ha zara sị, “Nkata iri na abụọ”.
“Mgbe nyawara ogbe achịcha asaa maka puku mmadụ anọ, nkata ole ka ụnụ tụtụjuru n’ọnụ site n’iberibe achịcha nke fọdụrụnụ?” Ha zara ya sị, “Nkata asaa” O wee sị ha, “Ọ bụ na ụnụ aghọtabeghị?”.
Igbo Mass Readings for February 18 2026, Wenezde Ntụ
Igbo Mass Readings for February 17 2026, Tuezde n’ime Izuụka nke Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.