Igbo Mass Readings for June 2 2026, Tuzde Izuụka nke Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for June 2 2026, Tuzde Izuụka nke Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 3:12-15, 17-18
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Akwụkwọozi Pita nke Abụọ
Na-emenụ otu a ka ụnụ nọ na-eche ọbịbịa nke ụbọchị nke Chukwu. Chọsikwaanụ ya ike ka ọ bịa ngwangwa, bụ ụbọchị ahụ Chineke ga-amụnye eluigwe niile ọkụ ka ha repịa.
Mana anyị na-atụ anya ihe Chineke kwere na nkwa, bụ eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ, ebe eziomume ga-adịgide. Ndị m hụrụ n’anya ebe ụnụ nọ na-ele anya ụbọchị ahụ, gbaanụ mbọ dobe onwe ụnụ ọcha ka ụnụ ghara inwe ntụpọ ọbụla n’ihu Chineke, ka ụnụ dịkwa n’udo mgbe ọ ga-abịa.
Ghọtanụ na ogologo ndidi Onyenweanyị nwere n’ebe ụnụ nọ bụ ohere nzọpụta o nyere ụnụ dị ka Pọl nwanne anyị, onye anyị hụrụ n’anya jiri amamihe Chineke nyere ya deere ụnụ akwụkwọozi.
Ndị m hụrụ n’anya, ebe ọ bụ na ụnụ amarala ihe ndị a kpacharanụ anya, ka ndị arụrụ ala ghara iduhie ụnụ ụzọ, si otu ahụ mee ka ụnụ dapụ n’okwukwe ụnụ.
Na-abawanyenụ n’amara na ọmụma nke Dinwenụ anyị na onye Nzọpụta anyị bụ Jesu Kristi. Otito dịrị ya ugbu a, rue mgbe ebighịebi. Amen.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 90: 2, 3-4, 10, 14, 16
Azịza: Onyenweanyị bido na ndụdụgandụ ruo na ndụdụgandụ ị bụ ebe nchedo m.
1. Tupu I kee ugwu niile
tupu i kee ụwa na ihe niile dị n’ime ya,
Ị dịrịị adị ebeebe ebeebe.
Azịza: Onyenweanyị bido na ndụdụgandụ ruo na ndụdụgandụ ị bụ ebe nchedo m.
2. Ị na-akpọghachi mmadụ na ntụ site n’ịgwa ya sị,
Laghachinụ ebe ụnụ si ụmụ mmadụ.
N’anya gị puku afọ dịka otu ụbọchị,
dịka ụnyahụ nke gaferelanụ,
mọbụ otu nche abalị.
Azịza: Onyenweanyị bido na ndụdụgandụ ruo na ndụdụgandụ ị bụ ebe nchedo m.
3. Afọ niile mmadụ nwere ike ịnọ n’ụwa bụ nanị iri asaa,
mọbụ iri asatọ maka ndị siri ike.
Ndụ a niile dị n’ụwa jupụtara n’oke nchekasị na nsogbu
N’oge adịghị anya mmadụ na-abụ ihe gara aga n’ụwa.
Azịza: Onyenweanyị bido na ndụdụgandụ ruo na ndụdụgandụ ị bụ ebe nchedo m.
4. Ka ịhụnaanya gị jupụta n’ime anyị ụtụtụ ọbụla,
ka anyị were nwee ike ikwe ukwe
ma nweekwa añụrị ụbọchị niile nke ndụ anyị.
Mee ka anyị bụ ụmụodibo gị hụ ọrụ ịtụnaanya gị.
Meekwa ka ụmụ anyị hụ ebube gị.
Azịza: Onyenweanyị bido na ndụdụgandụ ruo na ndụdụgandụ ị bụ ebe nchedo m.
MBEKU – Heb 4:12
Alleluia, Alleluia:
Okwu Chineke dị ndụ, dị ike. Ọ bụkwa ihe nwere ike inyocha echiche na izu niile nke obi.
Alleluia.
OZIỌMA – 12:13-17
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere
Nịisi ndị Juu zigaara ya ụfọdụ n’ime ndị Farisii na ndị otu Herọd iji kwee ọnya maka ijide Jesu n’okwu ya. Mgbe ha bịakwutere Jesu, ha jụrụ ya sị, “Onyenkuzi, anyị ma na ị bụ onye eziokwu, na ị naghị asọ mmadụ anya, mọbụ onye na-esekpuru ọnọdụ ọbụla mmadụ nọ na ya, kama i ji eziokwu akụzi ụzọ e si efe Chineke.
Gwa anyị o ziri ezi ka anyị na-atụrụ Siza ụtụisi ka ọ bụ na o zighị ezi? Anyị ga-atụ ka ọ bụ na anyị a gaghị atụ?” Ma ebe Jesu mazuru ihu abụọ ha, ọ jụrụ ha sị, “Gịnị mere ụnụ ji anwa m?
Weterenụ m otu mkpụrụ ego ka m leruo ya anya”. Ha wetaara ya otu mkpụrụ ego. O wee jụọ ha sị, “Onyinyo na aha onye dị n’elu ego a?”
Ha zara ya sị, “Ọ bụ nke Siza”, Jesu sịrị ha, “Nyenụ Siza ihe bụ nke Siza, nyekwanụ Chukwu ihe bụ nke Chukwu”. Azịza ya nke a tụrụ ha n’anya.
Igbo Mass Readings for June 3 2026, Wenezde Izuụka nke Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Igbo Mass Readings for June 2 2026, Tuzde Izuụka nke Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.