Igbo Mass Readings for April 22 2025, Tuzde Izuukwu nke Mbilite n’Ọnwụ Kristi

Nke a bụ Igbo Mass Readings for April 22 2025, Tuzde Izuukwu nke Mbilite n’Ọnwụ Kristi.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 2:36-41

Ihe Ọgụgụ ewetara n’Ọrụ Ndịozi

N’ụbọchị Pentikọst, Pita gwara ndị Juu sị: “Ya bụ ka ezinụụlọ Izrel niile mazuo na ọ bụ Jesu nke a, onye ụnụ kpọgburu n’obe ka Chineke mere ka ọ bụrụ Onyenweanyị na Kristi anyị.”

Mgbe ha nụrụ nke a, ihe a metụrụ ha n’obi. Ha jụrụ Pita na ndịozi ndị ọzọ, “Ụmụnna anyị, gịnị ka anyị ga-eme?” Pita azaa ha sị, “Chegharịanụ, sinụ na ihe ọjọọ pụta, onye ọbụla n’ime ụnụ n’otu n’otu ka e mee ụnụ mmirichukwu n’aha Jesu Kristi, maka mgbaghara njọ nke ụnụ niile, ụnụ ga-anatakwa onyinye nke Mmụọ Nsọ.

N’ihina ọ bụ ụnụ, na ụmụ ụnụ, na ndị niile nọ n’ebe dị anya, ka nkwa ahụ dịịrị bụ ndị niile Onyenweanyị Chineke na-akpọkọtara onwe ya.” Pita jikwa ogologo okwuchukwu gwasie ọgbakọ ahụ ike na-adụkwa ha ọdụ sị, “Zọpụtanụ onwe ụnụ n’agbụrụ ọjọọ a.”

N’ihi nke a, ọtụtụ ndị nabatara okwu ya ka e mere mmirichukwu. N’ụbọchị ahụ ihe dịka puku mmadụ atọ ka agbakwunyere n’ọnụọgụgụ ha.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps: 33:4-5, 18-19, 20, 22.

Azịza: Ụwa jupụtara n’ịhụnaanya nke Onyenweanyị

1. N’ihina okwu nke Onyenweanyị bụ eziokwu,

Ọ na-akwụdosiike n’ọrụ ya niile.

Ọ hụrụ eziomume na ikpe nkwụmọtọ n’anya,

ịhụnanya ya jupụtara n’ụwa.

Azịza: Ụwa jupụtara n’ịhụnaanya nke Onyenweanyị

2. Ma lee ka Onyenweanyị si eleta ndị niile na-atụrụ ya egwu anya,

ndị niile tụkwasịrịobi ha n’ịhụnaanya ya.

Ka o wee zọpụta mkpụrụobi ha n’ọnwụ

ma chekwaba ha n’oge ụnwụ.

Azịza: Ụwa jupụtara n’ịhụnaanya nke Onyenweanyị

3. Mkpụrụobi anyị na-eche Onyenweanyị;

ya bụ onye enyemaka anyị na onye ogbugbo anyị.

Ka ịhụnaanya gị dị n’ebe anyị nọ. O Chineke

ebe nchekwube anyị dị na gị.

Azịza: Ụwa jupụtara n’ịhụnaanya nke Onyenweanyị

MBEKU

ALLELUIA ALLELUIA:

Taa bụ ụbọchị ahụ Onyenweanyị mere, ka anyị nwee añụrị, ka obi dị anyị ụtọ na ya.

ALLELUIA.

OZIỌMA – 20:11-18.

Ihe Ọgụgụ ewetara n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere

Meri kwụ n’akụkụ ili ahụ, na ebe akwa. Ka ọ na-ebe akwa, o hulatara ala leba anya n’ime ili ahụ. Ọ hụrụ ndị Mmụọọma abụọ yi akwa ọcha, ka ha nọdụrụ ala, otu n’isi, nke ọzọ n’ụkwụ, n’ebe ahụ a tọgbọrọ ozu Jesu.

Ha jụrụ ya sị, “Nwaanyị, gịnị mere I ji ebe akwa?” Ọ zara ha sị, “Ha ebupụla Onyenwe m, ma amaghị m ebe ha dọbara ya.” Mgbe o kwuchara nke a, Ọ tụgharịrị hụ Jesu ka ọ kwụ.

Ma ọ maghị na ọ bụ Jesu. Jesu sịrị ya, “Nwaanyị, gịnị mere I ji ebe akwa? Onye ka Ị na- achọ?” Nwaanyị ahụ chere na ọ bụ onye ọrụ ubi wee jụọ ya sị, “Nnamukwu, ọ bụrụ gị bupụrụ ya, gwa m ebe I dobere ya, ka m ga buru ya.”

Jesu akpọọ ya sị, “Meri!” Nwaanyị ahụ atụgharịa, zaa ya na Hibru sị “Raboni! Nke pụtara “Onye nkuzi”. Jesu gwara ya sị, “E metụkwala m aka, n’ihina arịgokwubeghị m Nna m.

Gakwuru ụmụnna m gwa ha sị, Ana m alakwuru Nna m na Nna ụnụ, Chukwu m na Chukwu ụnụ.” Meri Magdalin bịara gwa ndị na-eso ụzọ Jesu sị,” Ahụla m Onyenweanyị.” Ọ kọọrọ ha na ọ gwara ya ihe ndị a.

Igbo Mass readings for April 23 2025, Wenezde Izuukwu nke Mbilite n’Ọnwụ Kristi.

Igbo Mass Readings for April 22 2025, Tuzde Izuukwu nke Mbilite n’Ọnwụ Kristi.