Igbo Mass Readings for December 31 2024, Ụbọchị nke Asaa N’Izuụka Krismas

Nke a bụ Igbo Mass Readings maka December 31 2024, Ụbọchị nke Asaa N’Izuụka Krismas.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 2:18-21

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Jọn nke mbụ

Ụmụntakịrị nke a bụ oge ikpeazụ. Otu ụnụ nụrụla na onye iro Kristi na-abịa, ugbu a, ọtụtụ n’ime ha abịala. N’ihi ya, anyị ma na nke a bụ oge ikpeazụ. Ha siri n’ọgbakọ anyị pụọ, mana ha abụghị ndị nke anyị.

A sị na ha bụ ndị otu anyị, ha gaara esonyere anyị. Kama ha pụrụ ka o wee pụta ihe na ọ dịghị onye ọbụla n’ime ha bụ onye otu anyị. Ma otu ọ dị, onye nsọ ahụ eteela ụnụ ude, dịka ụnụ niile si mara.

Ana m edere ụnụ akwụkwọ a, ọ bụghị na ụnụ amaghị eziokwu, kama ọ bụ maka na ụnụ maara ya, marakwa na o nweghị ụgha si n’eziokwu apụta.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 96: 1-2, 11- 12, 13.

Azịza: Ka eluigwe na ụwa kwebe ukwe añụrị.

1. Kweerenụ Onyenweanyị ukwe ọhụrụ;

ụwa niile kweere Onyenweanyị.

Kweerenụ Onyenweanyị ukwe, too aha ya;

Kwupụta nzọpụta ya ụbọchị niile. Azịza

2. Eluigwe ñụrịba, ụwa goribe,

oke osimiri na ihe niile dị n’ime ya, tienụ mkpu.

Ala ubi nile na ihe niile dị n’ime ya ñụrịbanụ,

ka osisi niile dị n’oke ọhịa kwebe ukwe añụrị n’ihu nke Onyenweanyị. Azịza

3. N’ihi Onyenweanyị na-abịa,

ọ na-abịa ikpe ụwa ikpe,

ọ ga-eji ikpe nkwụmọtọ were kpee ụwa ikpe,

ọ ga-eji eziokwu were kpee ndị mmadụ ikpe. Azịza

MBEKU

ALLELUIA ALLELUIA:

Ụbọchị dị nsọ adakwasala anyị, bịanụ mba niile kpọrọ Dinwenụ isi ala, taa nnukwu ihe achakwasala anyị.

ALLELUIA.

OZIỌMA – 1: 1-18.

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere

Na mbụ tupu e kee ụwa, okwu ahụ dịrịị. Okwu ahụ na Chineke dịrịị. Okwu ahụ bụkwa Chineke. Ya na Chineke dịrịị site na mbụ. Site na ya ka Chineke siri kee ihe niile.

E wezuga ya ọ dịghị ihe ọbụla e kere eke nke gaara adịnụ. N’ime ya ka ndụ dị. Ndụ ahụ bụkwa ihe nke ndị mmadụ. Ihe ahụ na-enwu n’ọchịchịrị, ma ọchịchịrị apụghị imenyụ ya.

Ọ dị otu nwoke Chineke zitere, aha ya bụ Jọn. Ọ bịara ịgba ama, ịgbara ihè ahụ akaebe, ka mmadụ niile site n’ihe ahụ kwere. Ya onwe ya abụghị ihè ahụ, kama ọ bịara ịgbara ihè ahụ akaebe.

Ezi ihè ahụ nke na-enye mmadụ niile ihè na-abịa n’elu ụwa. Ọ nọrịị n’ụwa, site na ya ka e si kee ụwa; ma ụwa amataghị ya. Ọ bịakwutere ndị nke ya, ma ha anatabeghị ya.

Ma ndị niile nabatara ya, kwerekwa n’aha ya, ka o nyere ike ị bụ ụmụ nke Chineke; Ha bụ ndị amụrụ, ọ bụghị site n’ọbara nke ọ na-abụ site n’echiche nke anụahụ ma ọ bụ echiche nke mmadụ kama site na Chineke.

Okwu ahụ bụụrụ mmadụ, wee binyere anyị. O jupụtara n’amara na eziokwu. Anyị ahụla ebube ya, ebube nke o nwere dịka sọọsọ otu Nwa nke Nna. Jọn gbara akaebe maka ya sị, “Onye na-esote m kariri m, n’ihina o bu m ụzọ dịrị.”

Site n’uju nke ya, anyị niile nwetara amara kwuru amara. Site n’aka Mosis ka e si nye iwu, ma amara na eziokwu si na Jesu Kristi bịa. Ọ dịghị onye ọbụla hụrụla Chineke, ọ bụ sọọsọ otu nwa ahụ, onye bụ Chineke, onye nke ya na Nna nọ, mere ka a mara ya.

Igbo Mass Readings for January 1 2025, Oriri Marịa dị Asọ Nne nke Chukwu

Igbo Mass Readings for December 31 2024, Ụbọchị nke Asaa N’Izuụka Krismas.