Igbo Mass Readings for May 30 2027, Ụka Ahụ na Ọbara Kristi – Afọ nke Abụọ.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for May 30 2027, Ụka Ahụ na Ọbara Kristi – Afọ nke Abụọ.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 24:3-8
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ọpụpụ
Isi Okwu: “Anyị ga-emezu ihe niile Onyenweanyị kwuru.”
Mgbe Mosis bịakutere ndị mmadụ ahụ, ọ kọọrọ ha ihe niile Onyenweanyị kwuru, kọọkwaara ha atụmatụ Ya. Ha niile jiri otu olu zaa: “Anyị ga-emezu ihe niile Onyenweanyị gwara anyị”.
Mgbe o bilitere n’ụzọ ụtụtụ, ọ bịara wuo ebe nchụaja n’ala ugwu ahụ, bịakwa wuo ogidi nkume iri na abụọ maka ọnụmara iri na abụọ, nke Izrel. Mgbe o zipụchara ụfọdụ ụmụokorobịa Izrel ka ha chụọrọ Onyenweanyị aja nsureọkụ, bịakwa were ụmụ oke ehi chụọrọ Onyenweanyị aja udo; Mosis weere ọbara ahụ kee ya ụzọ abụọ tinye ya n’obosara efere.
O weere otu ụzụ wụọ n’ebe nchụaja. O weere akwụkwọ ọgbụgba ndụ ahụ gụsiere ndị mmadụ ike. Ha niile za: “Anyị anụla, anyị ga-emezukwa ihe niile iwu na ụkpụrụ Chineke kwuru.”
Mgbe ahụ ka O weere ọbara ahụ fee ndị mmadụ sị: “Ihe a bụ ọbara ọgbụgba ndụ ahụ ụnụ na Onyenweanyị gbara n’usoro okwu niile ndị a Ọ gwara ụnụ.
ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 115:12-13, 15-18
Azịza: Aga M eburu iko nzọpụta wee kpọkuo aha Dinwenụ.
1. Kedụ ihe m ga-emere Dinwenụ m,
maka ihe niile O na-emere m?
Aga m eburu iko nzọpụta,
wee kpọkuo aha Dinwenụ m.
Azịza: Aga M eburu iko nzọpụta wee kpọkuo aha Dinwenụ.
2. Ọnwụ ndị kwere na Chukwu bụ ihe dara oke ọnụ n’anya Onyenweanyị.
Onyenweanyị abụ m nwodibo Gị,
bụrụkwa nwa nwodibo nwanyị Gị,
Ị tọhapụla m n’agbụ.
Azịza: Aga M eburu iko nzọpụta wee kpọkuo aha Dinwenụ.
3. Aga m achụnyere Gị aja ekele bịakwa kpọkuo aha Onyenweanyị.
Aga m emezu nkwa m kwere Onyenweanyị n’ihu ndị nke Ya niile.
Azịza: Aga M eburu iko nzọpụta wee kpọkuo aha Dinwenụ.
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 9:11-15
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi e degaara Ndị Hibru
Isi Okwu: Ọbara Kristi na-asachapụ omume niile nwụrụ anwụ n’akọ na uche anyị.
Ma Kristi n’onwe Ya abịala dịka Onye isi nchụaja, nke ọnọdụ ngọzi niile ahụ bịaralarị abịa ugbu a. Ụlọ ikwuu nke Ọ na-agba ụkọ n’ime ya bukariri ibu, zukwaa oke karịa nke a hụrụla na mgbe mbụ.
Ụlọ ikwuu nke ugbu a abụghịkwa nke e ji aka mee. O soghịkwa n’ihe e kere eke dị n’ụwa nke a. Ọ bụ naanị otu mgbe ka Kristi gafere ụlọ ikwuu nke agba ọhụrụ wee banye n’Ebe Nsọ nke kachasị dị nsọ.
O jighị ọbara ewu na nke ụmụ ehi banye ịchụ aja n’ebe ahụ. Kama O jiri ọbara Ya onwe Ya banye wee nwetara anyị nzọpụta ebighị ebi. N’ihi na, ọ bụrụ na ọbara ewu, na nke oke ehi na ntụ nwunye ehi, e fesara ụmụ Izrel n’agba ochie, na-eme ka ndị merụrụ onwe ha n’elu ahụ, dịkwa ọcha ọzọ;
Ọ pụtara n’eziokwu na ọbara Kristi n’enweghị ntụpọ, ga-asachapụ omume niile nwụrụ anwụ n’akọ na uche anyị, ka anyị wee fee Chineke dị ndụ; ebe Kristi bụ Onye sitere na Mmụọ ahụ dị ebighị ebi, were onwe Ya chee n’ihu Chineke dịka aja zuru oke.
N’ihi nke a, ka Kristi ji bụrụ Onye Ogbugbo nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ, ka ndị niile Chineke kpọrọ wee kete ngọzi ebighị ebi niile ahụ Chineke kwere na nkwa. Nke a kwere omume, n’ihi na otu onye nwụrụ ịgbapụta ndị mmadụ na mmehie niile ha mehiere n’oge ọgbụgba ndụ nke mbụ.
UKWE ỌMA: ZAYỌN TOO ONYE NZỌPỤTA GỊ
(1) Zayọn too Onye Nzọpụta gị,
Toonụ Onye eze na Onye nche atụrụ
Kweenụ ukwe, bụbanụ abụ.
(2) Toonụ Ya, too Ya, toosienụ Ya ike
Ọ karịrị otito ụnụ nwere ike inye
Otito ụnụ agaghị ezuru Ya.
(3) Otu ihe pụrụ iche anyị ji eto Ya
Bụ achịcha nke ndụ maka ndị dị ndụ
Nke O debeere anyị n’ụbọchị taa.
(4) N’oriri ikpeazụ ka O ji aka Ya
Nyefee oriri nsọ n’aka Ụmụazụ Ya,
Ka a ghara inwe ihe ịrụ ụka ọ bụla
(5) Werenụ mkpu ọñụ toosienụ Ya ike,
Werenụ añụrị doo Ya ebube,
Were obi ụtọ tie mkpu ọñụ.
(6) Taa bụụrụ anyị nnukwu emume,
Anyị na-echeta ụbọchị mbụ ahụ,
Mgbe O nyere anyị ihe omimi nke a.
(7) N’ihe omimi nke a, Eze agba ọhụrụ,
Jiri oriri nsọ hibe iwu ọhụrụ,
Nke melara aja agba ochie.
(8) Iwu ọhụrụ anọchiela anya iwu ochie,
Eziokwu achụọla onyinyo ọsọ,
Ihe achụsaala ọchịchịrị.
(9) Ihe ahụ Kristi mere na nri ikpeazụ
Ọ bụkwa ya ka anyị na-eme ugbu a,
A ga na-eme ya na ncheta nke Ya.
(10) N’usoro ntọala nsọ I kuziiri anyị,
Ka anyị ji achụnyere Gị aja nke a,
Achịcha na mmanya nke nzọpụta.
(11) Iwu ji onye otu Kristi ọ bụla,
Ikwere na achịcha bụ ahụ Kristi,
Na mmanya bụ ọbara Kristi.
(12) Uche apụghị ịghọta ya, anya apụghị ịhụ Ya,
Ma okwukwe gwara anyị na ọ bụ ezie,
Eziokwu nke si n’igwe.
(13) Ọ bụghị achịcha na mmanya ka a hụrụ,
Kama n’okpuru nke ọ bụla n’ime ha,
Akara dị egwu zoro n’ime ya.
(14) Kristi nọzuru oke na nke ọ bụla,
Ahụ Ya bụ ezigbo ihe oriri,
Ọ bara ya bụ ihe ọñụñụ.
(15) N’oriri, nke ọ bụla a natara,
Kristi zuru oke n’ibe ọ bụla,
N’ebughị ọrụ n’enweghị nkewa.
(16) Ihe onye natara, ka ibe ya natara,
Nnụ kwuru nnụ dị ka otu onye,
E richaa, ọ fọkwara.
(17) Ndị ọma natara ihe ndị ọjọọ natara,
Ma n’ọpụpụ ha, ọ bụghị otu ihe,
Ndị a natara ndụ, ndị ọzọ natara ọnwụ.
(18) Ụwa hụrụ ya ka otu oriri ahụ,
Ọpụpụ abụghịkwa otu ihe ma ọlị,
Ọnwụ jọrọ njọ, ma ndụ mara mma.
(19) A rụkwala ụka, chetakwa na
Mgbe a nyawara ogbe achịcha ọ bụla,
Kristi nọzuru n’ibe nke ọ bụla.
(20) E nweghị ihe ọ bụla na-ekewa Kristi;
A nyawaa achịcha, a nyawaghị Kristi,
O zuru oke n’ibe nke ọ bụla,
O nweghị ihe e bepụrụ na Kristi.
(21) Lee Achịcha Nke Ndị Mmụọma
E mere nri nke ndị nọ n’ije,
Ezigbo nri nke ụmụ Chukwu,
A tụpụkwarala ya nkịta.
(22) Ọ bụ ihe a ka e ziri n’akara
Mgbe e jiri Aịzik chụọ aja
Mgbe e gburu Nwatụrụ Ngabiga
N’achịcha igwe e nyere nna anyị ha.
(23) Jesu ezigbo nri na Onye nche atụrụ,
N’ebere Gị, zụọ anyị lekwaba anyị,
Mee ka anyị hụ ihe ọma Gị,
N’ala ndị dị ndụ.
(24) Ọ bụ sọ Gị ma ihe niile bara uru,
Nke e ji azụ anyị n’ụwa nke a.
Ka anyị rikọọ bụrụ otu n’igwe,
Wee keta oke ụmụ n’obodo nsọ.
MBEKU – Jọn. 6:51-52
Aleluya, aleluya!
Onyenweanyị kwuru sị: Abụ M achịcha dị ndụ, nke si n’igwe gbadata. Onye ọ bụla riri achịcha nke a, ga-adị ndụ ebighị ebi.
Aleluya!
OZIỌMA – 14:12-16, 22-26
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere
Isi Okwu: Nke a bụ ahụ M. Nke a bụ ọbara M.
N’ụbọchị mbụ nke Oriri Achịcha Ekoghị Eko, mgbe ndị nchụaja na-egbu Nwatụrụ Ngabiga ahụ e ji achụ aja, Ụmụazụ Jesu wee sị Ya: “Olee ebe Ị chọrọ ka anyị jee doziere Gị, ka I wee rie Oriri Ngabiga?”
Ya mere Jesu wee zipụ Ụmụazụ Ya abụọ, sị ha: “Banyenụ n’obodo Jerusalem. Otu nwoke bu ite mmiri ga-ezute ụnụ; sonụ ya. Ụlọ ọ bụla ọ banyere n’ime ya, sịnụ nna nwe ụlọ: “Onye nkuzi sị: “Olee ebe ụlọ-ọbịa e debeere M dị, ebe Mụ na Ụmụazụ M ga-anọ rie Oriri Ngabiga?”
Ọ ga-egosi ụnụ ime ụlọ ukwu dị n’ụlọ elu a kwadebere, dozikwaa. Dozierenụ anyị oriri ebe ahụ.” Ụmụazụ Ya abụọ, ahụ wee pụọ, banye n’obodo ukwu ahụ, wee hụ ihe niile dịka Jesu gwara ha.
Ha wee dozie Oriri Ngabiga. Mgbe ha nọ na-eri ihe, Jesu wee nara ogbe achịcha, gọzie ya, nyawaa ya, nye Ụmụazụ Ya, sị ha: “Naranụ. Nke a bụ ahụ M.”
O wee narakwa iko, kele Chineke, wee nye Ụmụazụ Ya. Ha niile wee si n’iko ahụ ñụrụ. Jesu wee sị ha: “Nke a bụ ọbara M. nke Chineke ji mesie ọgbụgba ndụ ọhụrụ ike, nke a na-awụsi n’ihi ọtụtụ mmadụ.
N’ịgwa ụnụ eziokwu, agaghị M añụkwa mmanya sitere na mkpụrụ osisi vaịnị ọzọ, ruo ụbọchị ahụ M ga-añụ ya ọhụrụ n’Alaeze Chineke”. Mgbe Jesu na Ụmụazụ Ya bụsịrị abụ otito, ha wee pụọ, jee Ugwu Olivu.
Igbo Mass Readings for May 31 2027, Emume Nleta Vegin Marịa gara Ileta Elizabet
Igbo Mass Readings for May 30 2027, Ụka Ahụ na Ọbara Kristi – Afọ nke Abụọ.