Igbo Mass Readings for March 21 2027, Ụka Igu (Ọmụ) Nkwụ – Afọ nke Abụọ

Nke a bụ Igbo Mass Readings for March 21 2027, Ụka Igu (Ọmụ) Nkwụ – Afọ nke Abụọ.

(N’ebe a ga-agọzi igu)

OZIỌMA – 11:1-10

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere

Isi Okwu: Ọ dị ngọzi bụ Onye bịara n’aha Onyenweanyị.

 Mgbe ha bịaruru Jerusalem nso, ruo Betfage na Betanị, n’akụkụ ugwu Olivu, ihe dị ka otu kilometa ma ọ bụ abụọ ruo obodo ukwu, bụ Jerusalem, Jesu wee zipụ mmadụ abụọ n’ime ndị Ụmụazụ Ya, sị ha: “Jeenụ n’obodo nta dị na ncherịta ihu ụnụ.

Ka ụnụ na-abanye n’ime ya, ụnụ ga-ahụ nwa ịnyịnya-ibu e libere n’osisi, nke mmadụ ọ bụla na-anọkwasịbeghị n’elu ya. Tọpụnụ ya, sekpụtara m ya. Ọ bụrụ na onye ọ bụla ajụọ ụnụ, sị: “Gịnị mere ụnụ ji atọpụ ya?

Ụnụ ga-agwa ya, sị: “Ọ dị Onyenweanyị mkpa; ọ ga-ezighachikwa ya n’ebe a ọsọ ọsọ.” “Ha wee jee, hụ nwa ịnyịnya ibu ahụ ebe e libere ya n’ọnụ ụzọ nke otu ụlọ nta.

Mgbe ha na-atọpụ ya, ụfọdụ ndị guzo nso n’ebe ahụ wee jụọ ha sị: “Gịnị ka ụnụ na-eme? Ụnụ na-atọrọ nwa ịnyịnya-ibu ahụ? Ndị ozi abụọ ahụ wee gwa ndị na-ajụ ha ajụjụ ihe Jesu ziri.

Mmadụ ndị ahụ wee kwenye ka ha kpụrụ nwa ịnyịnya-ibu laa. Ha wee sekpụtara Jesu nwa ịnyịnya-ibu ahụ, wụkwasị uwe ha n’elu ya. Jesu wee nọkwasị ya dị ka eze. Ọtụtụ mmadụ wee tụsaa akwa mgbokwasị ha n’okporo ụzọ.

Ndị ọzọ wee tụsaa obobodo akwụkwọ ha gbubitere na ngalaba osisi dị n’ubi. Ma ndị na-aga n’ihu ma ndị na-eso n’azụ, ji otu olu na-eti mkpu, sị: “Hozana! Zọpụta anyị ugbu a!

Onye Chineke gọziri agọzi ka Onye ahụ bụ. Nke na-abịa n’aha Onyenweanyị. Ihe a gọziri agọzi ka alaeze ahụ bụ, nke na-abịa, bụ alaeze nna anyị, Devid: Hozana! n’ebe kasị elu!”

IHE ỌGỤGỤ NKE AJA MISA ỤKA IGU (N’ime Ụlo Ụka)

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 50:4-7

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ onye Amụma Aịzaya

Isi Okwu: E kpuchighị m ihu m n’ebe ndị na-akparị m nọ; ama m nke ọma na ihere agaghị eme m.

Onyenweanyị enyela m ire nke nwa azụ; ka m mara otu m ga-esi na-aza ndị ike gwụrụ azịza. O nyela m onyinye nke okwu. Ọ na-emete m n’ụra kwa ụtụtụ ka m chee ntị nụrụ okwu dị ka nwa azụ.

Onyenweanyị emegheela ntị m. N’ebe mụ onwe m nọ, enweghị m ike ọ bụla nke m na-agbaketa azụ. Atọgbọọrọ m ndị na-eti m ihe azụ m; nye ndị na-adọ m aka n’ahụ-ọnụ agba m.

Ekpuchighị m ihu m n’ebe ndị na-akparị m, na-abụ m asọ n’ihu nọ. Onyenweanyị na-enyere m aka, nke mere na mkparị anaghị emetụta m. Akwụbara m ihu m dị ka okwute siri ike. Amaara m na ihere agaghị eme m.

ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 21:8-9, 17-20, 23-24 Az. 2

Azịza: Onyenwe m na Chineke m, Gịnị kpatara I jiri gbaketa m azụ?

1. Ndị niile hụrụ m na-achị m ọchị;

Ha na-emi m ọnụ, na-efeke isi, na-asi:

O chekwubere n’Onyenweanyị, Ya zọpụtanụ ya.

Ọ bụrụ na ọ bụ enyi ya, Ya bịa tọhapụ ya.

Azịza: Onyenwe m na Chineke m, Gịnị kpatara I jiri gbaketa m azụ?

2. Ọtụtụ nkịta gbara m gburugburu.

Igwe ndị obi ọjọọ nọgidere m.

Ha kpọpuru aka m na ụkwụ m.

E nwere m ike ịgụta ọkpụkpụ m ọnụ.

Azịza: Onyenwe m na Chineke m, Gịnị kpatara I jiri gbaketa m azụ?

3. Ha ekeela uwe m n’etiti onwe ha,

bịakwa were ya fee nza.

Onyenwe m, a gbahapụkwala m.

Onye ọgbụgba ume m, were ọsọ bịa nyere m aka.

Azịza: Onyenwe m na Chineke m, Gịnị kpatara I jiri gbaketa m azụ?

4. Aga m akọrọ ụmụnne m akụkọ aha Gị,

nyekwa Gị otito n’ọgbakọ ha.

Ụnụ bụ ndị na-atụrụ Ya egwu,

nyenụ Onyenweanyị otito, ụmụ Jekọb niile,

tobenụ Ya; Ụmụ Izrel, nyenụ Ya nsọpụrụ.

Azịza: Onyenwe m na Chineke m, Gịnị kpatara I jiri gbaketa m azụ?

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 2:6-11

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọozi Pọl dị asọ degaara ndị Filipaị

Isi Okwu: O budara onwe Ya mana Chineke buliri Ya nnukwu elu.

Jesu n’onwe Ya, dịrịị n’ụdị Chineke site na mbụ, ma O wereghị ịha ka Chineke dị ka ihe Ọ ga-ekwedosi aka ike. Kama, O mere onwe Ya ka onye na-abụghị ihe ọ bụla: O werela ọnọdụ ohu; O mekwara ka a mụọ Ya n’oyiyi mmadụ.

A hụkwara Ya ka Ọ dị ka mmadụ n’oyiyi. O wedatakwara onwe Ya n’ala, wee rube isi ruo n’ọnwụ – bụ ọnwụ nke obe. N’ihi nke a, Chineke ebuliela Ya oke elu.

O jikwa amara nye ya aha ahụ nke kachasị aha niile elu. Ka o wee bụrụ na-akpọọ aha Jesu, ihe niile e kere eke ga-egbu ikpere n’ala, ma ihe niile dị n’elu igwe, ma ihe niile dị n’elu ụwa, ma ndị nke dị n’okpuru ụwa.

Ka ire niile kwupụtakwa na Jesu Kristi bụ Onyenweanyị, ka e wee nye Chineke Nna otito.

MBEKU – Ph. 2:8-9

Kristi wedara onwe Ya ala nke ukwuu; Ọ naara ọnwụ; ọnwụ nke elu obe. Ma Chineke buliri Ya nnukwu elu, were nye Ya aha kachasị aha niile.

AKỤKỌ AHỤHỤ NKE ONYENWEANYỊ JESU KRISTI DỊKA MAK SIRI DEE YA

Mak – 14:1-15:47

A gaghị ebu oriọna, nke a na-ebu mgbaisi ọma: a gaghị ekele ndị mmadụ, nke a na-adụ akara nke obe n’elu akwụkwọ ma ọ bụ n’elu onwe anyị.

K = KRISTI

Ọ = ỌKỌ AKỤKỌ

N = NDỊ MMADỤ

Ọ: Ọ fọdụrụ abalị abụọ mmemme Ngabiga na nke Achịcha Ekoghị Eko eruo. Ndị isi nchụaja na ndị Ode-akwụkwọ wee na-achọ ụzọ ha ga-esi jide Jesu na nzuzo gbuo Ya. Ma ha sịrị:

N: “Anyị agaghị eme ya n’oge mmemme a, ka ọha ndị Juu ghara ibido ọgba aghara.”

Ọ: N’oge ahụ Jesu nọ na Betanị n’ụlọ Saịmọn onye ekpenta. N’oge ha na-eri nri anyasị, otu nwanyị batara n’ime ụlọ ahụ. O bu karama mmanụ otite dị oke ọnụ ahịa. Ọ kụwara karama mmanụ ahụ, wụọ Jesu mmanụ ahụ niile n’isi. Ụfọdụ ndị nọ n’ebe ahụ were iwe nke ukwuu, na-ekwurịta n’etiti onwe ha, sị:

N: “Gịnị mere e ji laa mmanụ otite nke a n’iyii otu a? N’ihi na a pụrụ ire ya ihe kariri narị naịra atọ were ya nye ndị ogbenye.”

Ọ: Ha tamuru ntamu megide nwanyị ahụ. Ma Jesu sịrị ha:

K: “Hapụnụ ya! Gịnị mere ụnụ na-esogbu ya? Ọ rụrụ ọrụ ọma n’ahụ M. N’ihi na ụnụ na ndị ogbenye nọ mgbe niile; mgbe ọ bụla ụnụ chọrọ, ụnụ nwere ike inyere ha aka; ma Mụ na ụnụ anọghị n’ụdị a mgbe niile. Nwanyị a mere ihe ọ pụrụ ime. O buru ụzọ tee ahụ m mmanụ isi-ụtọ, ka e wee dozie M maka olili M. N’ịgwa ụnụ ezi okwu, ebe ọ bụla a ga-ekwusa Oziọma nke a n’ụwa niile, a ga-ekwupụta ihe nwanyị a mere ka ọ bụrụ ihe ncheta ya.”

Ọ: Mgbe ahụ Judas Iskarịọt, otu onye n’ime Ụmụazụ iri na abụọ ahụ wee pụọ, jekwuru ndị isi nchụaja ịgba izu otu ọ ga-esi rara Jesu nye n’aka ha. Mgbe ndị isi nchụaja nụrụ nke a, obi tọrọ ha ụtọ. Ha wee kwe nkwa inye Judas ego. Site n’ụbọchị ahụ Judas malitere na-achọ ụzọ ọ ga-esi rara Ya nye n’aka ha. N’ụbọchị mbụ nke Oriri Achịcha Ekoghị Eko, mgbe ndị nchụaja na-achụ aja Atụrụ Ngabiga, Ụmụazụ Jesu wee sị Ya:

N: “Olee ebe Ị chọrọ ka anyị jee doziere Gị ihe maka iri oriri Ngabiga?”

Ọ: Jesu wee zipụ Ụmụazụ Ya abụọ, sị ha:

K: “Gaanụ n’ime obodo. Mgbe ụnụ na-aga n’ụzọ ụnụ ga-ezute otu nwoke bu ite mmiri. Soronụ ya gaa ebe ọ bụla ọ na-aga. Ụlọ ọ bụla ọ banyere n’ime ya, sịnụ nna nwe ụlọ: “Onye Nkuzi sị: “Olee ebe ụlọ-ọbịa e debere M dị, ebe M na Ụmụazụ M ga-anọ rie Oriri Ngabiga?” Ọ ga-egosi ụnụ ime-ụlọ ukwu dị n’ụlọ elu. A kwadoro ya akwado, dozikwaa ya edozi. Kwadoonụ nri anyị n’ebe ahụ.

Ọ: Ụmụazụ Ya abụọ ahụ wee pụọ, banye n’obodo ukwu ahụ, wee hụ ihe niile dịka Jesu gwara ha. Ha wee kwadoo Oriri Ngabiga. Mgbe o ruru anyasị, Jesu na Ụmụazụ Ya iri na abụọ ewee bịa. Mgbe ha nọdụrụ n’oche nri, Jesu wee sị ha:

K: N’ịgwa ụnụ eziokwu, otu onye n’ime ụnụ ga-arara M nye. Ee, otu onye so M ugbu a na-eri nri!

Ọ: O malitere iwute ha. Ha wee jụọ n’otu n’otu sị:

N: Onyenweanyị, ọ bụ m?

Ọ: Jesu wee sị ha:

K: Ọ bụ otu onye n’ime ụnụ iri na abụọ, onye Mụ na ya manyekọrọ aka n’ime otu efere. Nwa nke Mmadụ na-ala dịka e dere ya n’Akwụkwọ Nsọ banyere Ya, ma ahụhụ ga-adịrị onye ahụ, onye a ga-esite n’aka ya rara Nwa nke Mmadụ nye! Ọ ga-akara onye ahụ mma ma a sị na a mụghị ya amụ!

Ọ: Mgbe ha nọ na-eri ihe. Jesu weere ogbe achịcha gọzie ya, nyawaa ya, nye Ụmụazụ Ya, sị ha:

K: Naranụ nke a. Nke a bụ ahụ M.

Ọ: Emesịa, o buru iko mmanya nye Chineke ekele, bunyekwa ndị Ụmụazụ ya. Ha niile sitere n’iko ahụ ñụọ mmanya. Jesu wee sị ha:

K: Nke a bụ ọbara M, ọbara nke ọgbụgba ndụ, nke a na-awụsi n’ihi ọtụtụ mmadụ. N’ịgwa ụnụ eziokwu, agaghị M añụkwa mmanya sitere na mkpụrụ osisi vaịn ọzọ tutuu ruo ụbọchị ahụ mgbe M ga-añụ mmanya ọzọ karịrị ya mma n’Alaeze Chineke.”

Ọ: Mgbe Jesu na Ụmụazụ Ya bụsịrị abụ otito, ha wee pụọ, jee Ugwu Olivu. Jesu wee gwa Ụmụazụ Ya, sị:

K: Okwukwe ụnụ nwere n’ebe M nọ ga-ama jijiji, n’ihi na e deela ya n’Akwụkwọ Nsọ, sị: “A ga-etigbu onye-ọzụzụ atụrụ. Atụrụ ya niile wee gbasasịa. Ma mgbe e mere ka M si n’ọnwụ bilie, aga M eburu ụnụ ụzọ gaa Galili.

Ọ: Ma Pita sịrị Ya:

N: Asịkwa na ndị ọzọ a niile ahapụ gị gbala, ọ dịghị mgbe m ga-ahapụ gị laa.

Ọ: Jesu wee sị ya:

K: N’eziokwu ka M na-agwa gị, na taa, tupu oke ọkụkọ akwa akwa ugboro abụọ, gị onwe gị ga-agọnarị M ugboro atọ.

Ọ: Pita wee kwusie ya ike ọzọ, sị:

N: Ọ bụrụ na ọ dị mkpa ka m soro Gị nwụọ, agaghị m agọnarị Gị.

Ọ: Ụmụazụ Ya ndị ọzọ kwukwara otu okwu ahụ. Jesu na Ụmụazụ Ya wee bịaruo ogige a na-akpọ Getsemane. Jesu wee sị Ụmụazụ Ya:

K: Nọdụnụ n’ebe a ka M gaa kpee ekpere.

Ọ: O wee kpọrọ Pita na Jemis na Jọn pụọ iche. Mgbe O bidoro ịga n’ihu O bidokwara inwe obi ọjọọ na obi ịlọ mmiri, Jesu wee sị ha:

K: Obi M na-achọ itiwa ruo n’ọnwụ n’ihi ihe mgbu dị n’ime ya. Nọdụnụ n’ebe a soro M chee nche.

Ọ: O wee gatụkwuo n’ihu daa n’ala, wee kpee ekpere, sị:

K: Nna! ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mee, ka ahụhụ na-akwado ịdakwasị ya gabiga, hapụ ịbịakwasị ya.

Ọ: O wee kpeekwa ekpere sị:

K: Nna, o nweghị ihe nyịrị gị ime. Ekwela ka ihe ọjọọ a bịakwasị M. Ma ọ bụghị uche M ka M chọrọ ka o mezuo, kama ka uche gị mezuo.

Ọ: Jesu wee laghachi, hụ Ụmụazụ Ya atọ ahụ ka ha na-arahụ ụra. O wee jụọ Pita, sị:

K: Saịmọn ị na-arahụ ụra? I nweghị ike soro M chee nche otu elekere? Na-echenụ nche, na- ekpekwanụ ekpere, ka ụnụ ghara ịdaba n’ọnwụnwa. Mmụọ M kwere ekwe ezie, ma anụ ahụ adịghị ike.

Ọ: O wee hapụ ha ọzọ, jekwa ikpe ekpere, na-ekwukwa otu okwu ahụ. O wee bịakwa ọzọ, hụ Ụmụazụ Ya atọ ahụ ka ha na-arahụ ụra. N’ihi na anya ha dị arọ nke ukwuu, ha amaghịkwa ihe ha ga-asa Ya. O wee bịakwute ha nke ugboro atọ si ha:

K: Ụnụ nọriri n’ụra? Ngwa, zuruwezienụ ike! O zuola! Oge ahụ a kara aka abịala! Lee, a na-arara Nwa nke Mmadụ nye n’aka ndị njọ! Bilienụ ka anyị si n’ebe a pụọ! Lee, onye na-arara M nye nọ nso!”

Ọ: Mgbe Jesu kpụ okwu a n’ọnụ, Judas, otu onye n’ime Ụmụazụ iri na abụọ ahụ, batara, ya na igwe mmadụ so. Ụfọdụ n’ime ha ji mma, ndị ọzọ ji osisi. Ndị isi nchụaja, na ndị Ode-akwụkwọ na Ndị okenye ndị Juu zitere ha. Tupuu ha abịaruo ebe Jesu nọ, Judas gwara ha sị:

N: Onye ọ bụla m ga-esutu ọnụ, onye ahụ bụ Ya: jidenụ Ya, durunụ Ya pụọ ma jisikwanụ Ya ike.

Ọ: Mgbe Judas batara, o mee ngwa jekwuru Jesu ebe Ọ nọ, sị Ya:

N: Onye Nkuzi!

Ọ: O sutu Ya ọnụ. Ha wee jide Jesu, kwegidesie Ya aka ike. Ma otu onye n’ime ndị guzo nso wee mịpụta mma agha ya, gbuo odibo onye isi nchụaja, gbupụ otu ntị ya. Jesu welitere olu jụọ ha, sị:

K: Abụ M onye na-apụnarị mmadụ ihe n’ike ụnụ jiri buru mma na osisi pụta ijide M? Kwa ụbọchị Mụ na ụnụ nọ n’Ụlọ Nsọ Chineke ebe M na-ezi ihe, ma ụnụ ejideghị M. Ma ihe ndị a na-eme ugbu a ime ka ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru na ha ga-eme mezuo.

Ọ: Ụmụazụ Ya niile wee hapụ Ya, gbalaga. O nwere otu nwokorobịa na-eso Jesu n’azụ. Nwokorobịa a gbokwasịrị ezi akwa ọcha n’ahụ ọtọ ya. Mgbe ndị ahụ jidere Jesu na-achọ ijide nwokoro ahụ, o fepụrụ ọsọ, hapụrụ ha ezi akwa ọcha o yi n’ahụ, gbara ọtọ gbalaga. Ha wee si ebe ahụ kpụrụ Jesu kpụjere onye isi nchụaja. Ndị isi nchụaja niile, na ndị okenye niile, na ndị Ode-akwụkwọ niile wee zukọọ n’ebe ahụ. Ma Pita lara azụ, na-eso Jesu n’ebe dị anya, ruo n’ime obi onye isi nchụaja. Ebe ahụ ka ọ nọdụrụ ala n’etiti ndị na-eje ozi, na-anya ọkụ a fụnwuru n’obi. Ma ndị isi nchụaja na Nnọkọ-ikpe ahụ niile gbara mbọ ka ha chọta ebubo ha ga-eji maa Ya ikpe ọnwụ, ma ha achọtaghị. N’ihi na ọtụtụ mmadụ gbara ama ụgha dị iche iche megide Ya, ma ama ha adakọtaghị. Ụfọdụ mmadụ biliri gbaa ama ụgha megide Jesu, sị:

N: Anyị nụrụ mgbe O kwuru sị: “Aga M akwada Ụlọ Nsọ a nke e ji aka wu, ma mgbe ụbọchị atọ gasịrị, aga M ewu ọzọ nke a na-ejighị aka mmadụ wuo.”

Ọ: Otu o dị, ama ha adakọtakwaghị. Onye Isi Nchụaja wee bilie ọtọ, guzo n’etiti, wee jụọ Jesu sị:

N: “Ị zaghị ihe ọ bụla? Ginị bụ ama mmadụ ndị a na-agbagide gị?”

Ọ: Ma Jesu gbara nkịtị, ọ zaghịkwa ihe ọ bụla. Onye Isi Nchụaja wee jụkwaa Ya ọzọ sị:

N: Ị bụ Kristi ahụ, Nwa nke Chineke dị ngọzi?

Ọ: Jesu zara sị:

K: Mụ onwe M bụ Ya. Ị ga-ahụkwa Nwa nke Mmadụ ka Ọ nọdụ n’aka nri Chineke, onye pụrụ ime ihe niile, na-abịakwa, Ya na igwe-ojii niile nke eluigwe.

Ọ: Onye Isi Nchụaja wee dọwaa uwe ya, sị:

N: Gịnị ọzọ ka anyị n’achọ? Ọ bara uru ịchọkwa ndị ọzọ ga-agbagide Ya ama? Ụnụ anụla nkwulu ahụ! Gịnị bụ uche ụnụ?

Ọ: Ha niile wee maa Ya ikpe, sị:

N: O kwesịrị ịnwụ ọnwụ.

Ọ: Ụfọdụ n’ime ha bidoro ịgbụ ya ọnụ mmiri. Ndị ọzọ jiri akwa kechie anya Ya, bido jiri aka ha na-eti Ya ihe, na-eme ya ihe ọchị, na-asị:

N: Buo amụma! Onye tiri Gị ihe?

Ọ: Ndị nche na-eje ozi wee kpụrụ Ya, tie Ya ọtụtụ ihe. Mgbe Pita nọ na ndịda n’obi nke onye Isi Nchụaja, otu n’ime ụmụ agbọghọ ndị na-ejere onye Isi Nchụaja ozi wee bịa. Mgbe ọ hụrụ Pita ka ọ na-anya ọkụ, o wee leruo ya anya, sị ya:

N: Ị bụ otu n’ime ndị na-eso Jesu onye Nazaret?

Ọ: Ma Pita gọrọ agọ, sị:

N: Amaghị m, aghọtaghị m ihe ị na-ekwu.”

Ọ: O wee pụọ nọdụ n’ọnụ-ụzọ e si abata n’obi. Nwa agbọghọ ahụ wee hụ Pita, malitekwa ọzọ ịgwa ndị guzoro nso sị:

N: Nwoke a bụ otu onye n’ime ha.

Ọ: Ma Pita gọrọ agọ ọzọ. Mgbe nwa oge gasịrị, ndị guzoro nso wee gwa Pita ọzọ, sị:

N: N’eziokwu, ị bụ otu onye n’ime ha n’ihi na ị bụ onye Galili.

Ọ: Ma Pita malitere ịdụ onwe ya ikwu na ịñụ iyi, sị:

N: N’ezie, amaghị m onye nwoke a ụnụ na-ekwu okwu ya bụ.

Ọ: N’otu oge ahụ kwa, oke ọkụkọ wee kwaa akwa nke ugboro abụọ. Pita wee cheta otu Jesu buru amụma maka ya, sị: “Tupuu oke ọkụkọ akwaa akwa ugboro abụọ. Ị ga-agọnarị M ugboro atọ. “Pita wee tụlee okwu a n’obi ya, wee pụọ n’ezi kwaa akwa. N’isi ụtụtụ, ndị isi nchụaja zukọrọ, ha na ndị okenye, na ndị ode-akwụkwọ na Nnọkọ-ikpe Sanhedrịn niile, wee gbaa izu ihe ha ga-eme Jesu. Ha wee kee Jesu agbụ, duru Ya pụọ, rara Ya nye n’aka Paịlet. Paịlet wee jụọ Ya, sị:

N: Ị bụ Eze ndị Juu?

Ọ: Jesu wee zaa ya, sị:

K: Ee, ọ bụ dị ka i siri kwuo ya.

Ọ: Ndị isi nchụaja boro Jesu ọtụtụ ebubo, Paịlet wee jụkwaa ya ọzọ sị:

N: “Ị zaghị ihe ọ bụla? Lee, ọtụtụ ebubo ha na-ebo Gị.”

Ọ: Ma Jesu azaghịkwa ajụjụ ọzọ. Ya mere nkịtị ọ gbara juru Paịlet anya.

Ọ: N’oge Mmemme Ngabiga ọ bụla, ihe Pailet na-emere ndị Juu bụ ịhapụrụ ha otu onye mkpọrọ ọ bụla ha rịọrọ ka o nwere onwe ya. N’oge ahụ, otu nwoke a na-akpọ Barabas nọ n’ụlọ-mkpọrọ, ya na ndị biliri imegide ndị isi, ndị gbukwara mmadụ, na ụfọdụ ndị Juu kpaliri aghara megide ndị na-achị ha. Ọgbakọ ndị Juu wee bịakwute Paịlet, malite ịrịọ ya ka o mee dị ka ọ na-emere ha. Paịlet wee jụọ ha, sị:

N: “Ụnụ chọrọ ka m hapụrụ ụnụ Eze ndị Juu?”

O: N’ihi na ọ ghọtara na ọ bụ n’ihi anya-ụfụ ka ndị isi nchụaja ji rara Jesu nye n’aka ya. Ma ndị isi nchụaja kwaliri igwe mmadụ ndị nọ n’ebe ahụ, ka ha jikọọ ọnụ rịọ ka ọ hapụrụ ha Barabas kama ọ ga-ahapụ Jesu. Ma Paịlet jụkwara ha ọzọ, sị:

N: “Gịnị ka ụnụ chọrọ ka m jiri Nwoke a, ụnụ kpọrọ Eze ndị Juu mee”?

Ọ: Ma ha tiri mkpu n’oke olu ọzọ sị:

N: “Kpọgide Ya n’obe”!

Ọ: Ma Paịlet jụrụ ha, sị:

N: Maka gịnị? Ihe ọjọọ gịnị ka O mere?

Ọ: Ma igwe mmadụ ahụ tiri, mkpu na-asị:

N: “Kpọgide Ya n’obe”!

Ọ: Ma Paịlet, ebe ọ na-achọ ka o mee ihe ga-atọ igwe ndị Juu ụtọ, ọ hapụrụ ha Barabas. Mgbe ọ pịasịrị Jesu ihe, ọ raara ya nye ka a kpọgide Ya n’obe. Ụfọdụ ndị agha wee kpụrụ Jesu pụọ, baa n’ime ogige ụlọ onye ọchịchị, ebe ndị agha bi. Ndị isi agha wee kpọkọọ otu ndị agha ha niile. Ha wee yikwasị Jesu uwe ndị eze, nke na-acha uhie uhie, kpaa okpu-eze nke e ji ogwu mee, kpube Ya n’isi. Ndị agha wee malite igbuchapụrụ ya n’ụzọ ime ihe ọchị na-asị:

N: “Ekele, Eze ndị Juu”!

Ọ: Mgbe ha nọ na-eme Ya ihe ọchị a, ha jikwa osisi na-eti Ya n’isi ọtụtụ mgbe, na-agbụkwa Ya ọnụ mmiri. Ha gburu ikpere n’ihu Ya na-akpọ isi ala na-enye Ya. Mgbe ndị agha jichara Jesu mee ihe ọchị, ha wee yipụ Ya uwe Ya niile. Ndị agha wee dupu Ya ka ha kpọgide Ya n’obe. Mgbe ha na-aga n’ụzọ, ndị agha wee zute otu nwoke a na-akpọ Saịmọn, onye Sịrịnị, nna Alegsanda na Rufọs, ka ọ na-agafe, mgbe o si n’azụ obodo na-alọta. Ndị agha ahụ wee manye ya ka o soro ha, ka o wee buru obe Jesu. Ha wee duru Jesu bịaruo ebe a na-akpọ Gọlgọta, nke bụ, ma a sụgharịa ya “Ebe Okpokoro isi”. Ebe ahụ ka ha nyere Jesu mmanya agwara ọgwụ nke ga-egbochi Ya inwe ihe mgbu. Ma o kweghị añụ. Ha wee kpọgide Jesu n’obe, kesaa uwe Ya n’etiti onwe ha, bịakwa fee nza maka uwe Ya, ka ha wee kpebie nke onye ọ bụla ga-enwe. Mgbe o ruru n’elekere itoolu nke ụtụtụ ha kpọgidere Jesu n’obe. E dekwasịkwara “EZE NDỊ JUU” n’elu obe, ka ọ bụrụ ihe ndekwasị nke ebubo e boro Ya. Ha kpọgidekwara Jesu na ndị ohi abụọ n’elu obe, otu n’aka-nri Ya, nke ọzọ n’aka-ekpe Ya. N’ụzọ dị otu a ka e si mezuo ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ, sị: “A gụkọtara Ya na ndị-ohi”. Ndị na-agafe n’ụzọ na-akwa Ya emo, na-efufe n’isi, na-asị:

N: “Aha! Gị onye ga-akwada ụlọ nsọ Jerusalem wulikwaa ya n’ụbọchị atọ! Zọpụta onwe Gị, si n’elu obe rịdata”!

Ọ: Otu aka ahụ, ndị isi nchụaja na ndị ode-akwụkwọ n’etiti onwe ha, ji Ya eme ihe ọchị, sị:

N: “Ọ zọpụtara ndị ọzọ, ma ike adịghị ya ịzọpụta onwe Ya. Ka Kristi, Eze Izrel, si n’elu obe ugbu a rịdata, ka anyị wee hụ ma kwerekwa.”

Ọ: Ndị ohi abụọ a kpọgidere Ya na ha n’elu obe sokwa na-akparị Ya, na-atakwa Ya ụta. Mgbe o ruru elekere nke iri na abụọ n’ehihie, ọchịchịrị wee gbaa n’ala ahụ niile. Ọchịchịrị a dịgidere ruo n’elekere atọ nke ehihie. N’elekere nke atọ n’ehihie, Jesu weere oke olu tie mkpu sị:

K: “Elọi, Elọi, lama sabaktanị”!

Ọ: Nke bụ, ma a sụgharịa ya:

K: “Chineke M, Chineke M, gịnị mere I ji hapụ naanị M n’ebe a?”

Ọ: Mgbe ụfọdụ mmadụ n’ime ndị guzoro nso nụrụ mkpu a, ha sị:

N: “Lee, Ọ na-akpọ Ilaịja”!

Ọ: Otu onye n’ime ha gbara ọsọ, ga weta ogbo, denye ya n’ime mmanya gbara ụka, fanye ya n’ ogologo osisi nye Ya ka Ọ nụọ, sị:

N: “Cherenụ, ka anyị hụ, ma Elaịja ọ ga-abịa ikudata Ya n’elu obe”!

Ọ: Mgbe ahụ Jesu wee tie mkpu n’oke olu, wee kubie ume. Akwa-mgbochi nke dị n’ụlọ nsọ ukwu Chineke gbawara ibe abụọ, site n’elu ruo ala ya. Mgbe otu ọchịagha, na-achị ndị agha nke guzoro nso na ncherịta ihu nke obe Jesu, hụrụ otu O si kubie ume, ọ sịrị:

N: N’eziokwu, Nwoke a bụ Nwa Chineke.

Ọ: Ụmụ nwanyị ụfọdụ nọkwa n’ebe ahụ, guzo n’ebe dị anya na-ele ihe na-aga. N’etiti ha ka ụmụ nwanyị atọ ndị a nọ: Meri Magdalin na Meri nne Jemis nke nta na Joses na Salomi. Ụmụ nwanyị ndị a soro Jesu, mgbe Ọ nọ na Galili, na-ejekwara Ya ozi. Ọtụtụ ụmụ nwanyị ndị ọzọ nọkwa n’ebe ahụ, ndị soro Jesu bịa Jerusalem. Mgbe anyanwụ dasịrị, Josef onye Arịmatịa bịara ka ọ mara ihe ọ ga-eme, n’ihi na ụbọchị ahụ a kpọgburu Jesu bụ ụbọchị Nkwadebe, ma ọ bụ ụbọchị na-eso ụbọchị izuike nke ndị Juu. Ma Josef nke a, bụ onye Arịmatịa, bụ onye a ma ama na onye a na-asọpụrụ na Ụlọikpe ukwu ndị Juu a na-akpọ Sanhedrịn. Nwoke a sokwa na-atụ anya ọbịbịa nke Alaeze Chineke. Josef weere obisike jekwuru Paịlet, rịọ ka e bunye ya ozu Jesu. O juru Paịlet anya ịnụ na Jesu anwụọlarị n’atụfughị oge. Ya mere, o ziri ka a kpọọ ọchịagha na-eche ozu Jesu nche, wee jụọ ya ma o teela aka mgbe Jesu kubiri ume. Mgbe ọ nụrụ n’ọnụ ọchịagha ahụ na Jesu anwụọla, o kwenyere ka Josef buru ozu Jesu lie n’akwụghị ụgwọ ọ bụla. Josef wee zụọ akwa ụlarị ọcha budata ozu Jesu, were akwa ụlarị ọcha ahụ fụchie Ya, dọnye Ya n’ime ili nke e gwuwara ochie n’oke nkume. Ọ nuketara otu nkume buru ibu, were ya kpuchie ọnụ ụzọ ili ahụ. Meri Magdalin na Meri nne Jesu guzo n’ebe ahụ na-ele anya, wee rịba ama ebe e liri Jesu.

Igbo Mass readings for March 22 2027, Mọnde n’ime Izuụka dị Asọ

Igbo Mass Readings for March 21 2027, Ụka Igu (Ọmụ) Nkwụ – Afọ nke Abụọ.