Igbo Mass Readings for April 13 2025, Ụka Igu (Ọmụ) Nkwụ – Afọ nke Atọ
Nke a bụ Igbo Mass Readings for April 13 2025, Ụka Igu (Ọmụ) Nkwụ – Afọ nke Atọ.
(N’ebe a ga-agọzi igu)
OZIỌMA – 19:28-40
Ihe Ọgụgụ nke a sị n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Isi Okwu: Ọ dị ngọzi bụ onye bịara n’aha Onyenweanyị.
Mgbe Jesu kwusiri okwu a, Ọ gakwara n’ihu, n’ije ya ịga Jerusalem. Mgbe Jesu bịaruru Betfage na Betanị nso, n’akụkụ Ugwu Ólivu, O zipụrụ mmadụ abụọ na ndị Ụmụazụ Ya, zikwa ha sị: “Jeenụ n’obodo nta nke dị na ncherịta ihu ụnụ.
Mgbe ụnụ na-abanye ya, ụnụ ga-ahụ nwa ịnyịnya ibu, e libere, nke na-enwebeghị onye nọkwasịrị n’elu ya. Tọpụnụ ya, sekpụtanụ ya n’ebe a. Ọ bụrụ na onye ọ bụla ajụọ ụnụ sị: “Gịnị mere ụnụ ji atọpụ ya?
Gwanụ ya sị: “Ọ dị Onyenweanyị mkpa.” Ndị e ziri ozi wee gaa, hụ ihe niile dị ka Jesu gwara ha. Mgbe ha na-atọpụ nwa ịnyịnya ibu ahụ, ndị nwe ya wee jụọ ha, sị: “Gịnị mere ụnụ ji atọpụ nwa ịnyịnya ibu ahụ?”
Ha wee za sị: “Ọ dị Onyenweanyị mkpa.” Ha wee sekpụta ya nye Jesu, were uwe ha wụkwasị n’elu nwa ịnyịnya ibu ahụ, kukwasị Jesu n’elu ya. Mgbe Jesu na-aga n’elu nwa ịnyịnya ibu ahụ, ndị so Jesu wee tụsaa uwe ha n’ụzọ.
Mgbe Jesu bịaruru Jerusalem nso, n’ebe gbadara site n’Ugwu Olivu, igwe ndị na-eso ụzọ Ya malitere ịñụrị ọñụ, na iwere oke olu na-eto Chineke maka ọrụ ebube niile e ji amata ike Chineke, nke ha hụrụ site n’aka Jesu.
Ha wee na-eti, sị: “Onye a gọziri agọzi ka Eze ahụ bụ, nke na-abịa n’aha Onyenweanyị! Udo dịkwa n’eluigwe! Otito dịrị Chineke n’ebe kachasị elu” Ụfọdụ n’ime ndị Farisii wee si n’igwe mmadụ ahụ tinye ọnụ sị Ya: “Onye nkuzi! Baara ndị na-eso ụzọ Gị mba ka ha mechie ọnụ!” Ma Jesu sịrị ha, “Ana M agwa ụnụ: na ọ bụrụ na ha kpuchie ọnụ ha, ọ bụna nkume n’onwe ha, ga-eti mkpu otito.”
IHE ỌGỤGỤ NKE AJA MISA ỤKA IGU (N’ime Ụlo Ụka)
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 50:4-7
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ onye Amụma Aịzaya
Isi Okwu: E kpuchighị m ihu m n’ebe ndị na-akparị m nọ; ama m nke ọma na ihere agaghị eme m.
Onyenweanyị enyela m ire nke nwa azụ; ka m mara otu m ga-esi na-aza ndị ike gwụrụ azịza. O nyela m onyinye nke okwu. Ọ na-emete m n’ụra kwa ụtụtụ ka m chee ntị nụrụ okwu dị ka nwa azụ.
Onyenweanyị emegheela ntị m. N’ebe mụ onwe m nọ, enweghị m ike ọ bụla nke m na-agbaketa azụ. Atọgbọọrọ m ndị na-eti m ihe azụ m; nye ndị na-adọ m aka n’ahụ-ọnụ agba m.
Ekpuchighị m ihu m n’ebe ndị na-akparị m, na-abụ m asọ n’ihu nọ. Onyenweanyị na-enyere m aka, nke mere na mkparị anaghị emetụta m. Akwụbara m ihu m dị ka okwute siri ike. Amaara m na ihere agaghị eme m.
ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 21:8-9, 17-20, 23-24 Az. 2
Azịza: Onyenwe m na Chineke m, Gịnị kpatara I jiri gbaketa m azụ?
1. Ndị niile hụrụ m na-achị m ọchị;
Ha na-emi m ọnụ, na-efeke isi, na-asi:
O chekwubere n’Onyenweanyị, Ya zọpụtanụ ya.
Ọ bụrụ na ọ bụ enyi ya, Ya bịa tọhapụ ya.
Azịza: Onyenwe m na Chineke m, Gịnị kpatara I jiri gbaketa m azụ?
2. Ọtụtụ nkịta gbara m gburugburu.
Igwe ndị obi ọjọọ nọgidere m.
Ha kpọpuru aka m na ụkwụ m.
E nwere m ike ịgụta ọkpụkpụ m ọnụ.
Azịza: Onyenwe m na Chineke m, Gịnị kpatara I jiri gbaketa m azụ?
3. Ha ekeela uwe m n’etiti onwe ha,
bịakwa were ya fee nza.
Onyenwe m, a gbahapụkwala m.
Onye ọgbụgba ume m, were ọsọ bịa nyere m aka.
Azịza: Onyenwe m na Chineke m, Gịnị kpatara I jiri gbaketa m azụ?
4. Aga m akọrọ ụmụnne m akụkọ aha Gị,
nyekwa Gị otito n’ọgbakọ ha.
Ụnụ bụ ndị na-atụrụ Ya egwu,
nyenụ Onyenweanyị otito, ụmụ Jekọb niile,
tobenụ Ya; Ụmụ Izrel, nyenụ Ya nsọpụrụ.
Azịza: Onyenwe m na Chineke m, Gịnị kpatara I jiri gbaketa m azụ?
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 2:6-11
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọozi Pọl dị asọ degaara ndị Filipaị
Isi Okwu: O budara onwe Ya mana Chineke buliri Ya nnukwu elu.
Jesu n’onwe Ya, dịrịị n’ụdị Chineke site na mbụ, ma O wereghị ịha ka Chineke dị ka ihe Ọ ga-ekwedosi aka ike. Kama, O mere onwe Ya ka onye na-abụghị ihe ọ bụla: O werela ọnọdụ ohu; O mekwara ka a mụọ Ya n’oyiyi mmadụ.
A hụkwara Ya ka Ọ dị ka mmadụ n’oyiyi. O wedatakwara onwe Ya n’ala, wee rube isi ruo n’ọnwụ – bụ ọnwụ nke obe. N’ihi nke a, Chineke ebuliela Ya oke elu.
O jikwa amara nye ya aha ahụ nke kachasị aha niile elu. Ka o wee bụrụ na-akpọọ aha Jesu, ihe niile e kere eke ga-egbu ikpere n’ala, ma ihe niile dị n’elu igwe, ma ihe niile dị n’elu ụwa, ma ndị nke dị n’okpuru ụwa.
Ka ire niile kwupụtakwa na Jesu Kristi bụ Onyenweanyị, ka e wee nye Chineke Nna otito.
MBEKU – Ph. 2:8-9
Kristi wedara onwe Ya ala nke ukwuu; Ọ naara ọnwụ; ọnwụ nke elu obe. Ma Chineke buliri Ya nnukwu elu, were nye Ya aha kachasị aha niile.
AKỤKỌ AHỤHỤ NKE ONYENWEANYỊ JESU KRISTI DỊKA LUK SIRI DEE YA
Luk – 22:14-23:56 ma ọ bụ 23:1-49
A gaghị ebu oriọna, nke a na-ebu mgba isi ọma: A gaghị ekele ndị mmadụ, nke a na-adụ akara nke obe n’elu akwụkwọ, ma ọ bụ n’elu onwe anyị.
K = KRISTI
Ọ = ỌKỌ AKỤKỌ
N: NDỊ MMADỤ
Ọ: Mgbe oge ahụ ruru, Jesu weere ọnọdụ Ya n’oche-nri: Ụmụazụ Ya wekwaara ọnọdụ nke ha. Jesu gwara ha sị:
K: Ọ gụọla M nnukwu agụụ n’obi, ka Mụ na ụnụ rie Oriri Ngabiga nke a, tupu M banye n’ahụhụ. N’ihi na, ana M agwa ụnụ, na-agaghị m erikwa ya ọzọ, ruo mgbe a ga-emezu ya n’Alaeze Chineke.
Ọ: O buuru iko, nye ekele, wee sị:
K: Naranụ nke a. Onye ñụrụ, ya nye ibe ya. N’ihi na, ana M agwa ụnụ, na bido ugbu a gawa, agaghị M añụkwa mmanya a ọzọ, tutuu ruo mgbe alaeze Chineke ga-abịa.
Ọ: Mgbe ahụ kwa ka O wekwaara achịcha, nye ekele, nyawaa ya, bịakwa nye ya Ụmụazụ Ya sị:
K: Nke a bụ ahụ M, nke a ga-enye maka ụnụ: Na-emenụ nke a na ncheta nke M.
Ọ: Mgbe ha risiri nri anyasị, O buliri iko mmanya otu aka ahụ kwa, sị:
K: Iko nke a bụ ọgbụgba ndụ ọhụrụ n’ime ọbara M, nke a ga-awụsi maka ụnụ. Ma lee, onye ahụ na-ere M, ebe Mụ na ya na-amanye aka n’otu efere! N’ezie, Nwa nke Mmadụ na-ala, otu e si kpebie ya na mbụ. Ma ahụhụ dịrị onye ahụ a ga-esi n’aka ya ree Nwa nke Mmadụ!
Ọ: Mgbe ahụ ndị na-eso ụzọ Ya bidoro ịjụrịta onwe ha ajụjụ ịchọpụta onye ọ bụ n’ime ha nke ga-arara Ya nye. Esemokwu bịakwara dapụtara ha, banyere onye n’ime ha a ga-agụnye n’onye kacha ibe ya. Jesu wee sị ha:
K: Na be ndị ọgọmmụọ, ọ bụ ndị eze na-eji aka ike, na-amanye ndị a na-achị achị. Aha e ji eto ndị nwere ike ọchịchị n’ahụ ibe ha bụ: “Ome-nke-ọma”. Ihe a e mekwala n’etiti ụnụ! Mba! Onye kacha ibe ya ga-akpa agwa ka onye kacha ntakịrị. Onye isi ga-eme ka onye na-agba odibo. Kedụ onye ka ibe ya? Ọ bụ onye na-eri n’oche-nri, ka ọ bụ onye na-agba odibo? Ọ bụ na ọ bụghị onye na-eri n’oche-nri? Ma lee M, ebe M nọ n’etiti ụnụ, dịka onye na-agba odibo. Ụnụ bụ ndị ji okwukwe kwụnyere M, na nlegha niile e leghara M. Ugbu a, ana M e were alaeze nyefee ụnụ n’aka; otu Nna M si were alaeze nyefee M n’aka. Ụnụ ga-eri oriri, bịakwa ñụọ ihe ọñụñụ n’oche-nri M, n’alaeze M. Ụnụ ga-anọ n’oche eze, na-ekpe ọnụmara iri na abụọ nke Izrel ikpe. Saịmọn! Saịmọn! Mata na ekwensu enwetala ihe ọ chọrọ nke bụ, ịyọcha ụnụ niile, ka a yọchara ọka. Mana ekpeere M gị bụ Saịmọn ekpere, ka okwukwe gị ghara ịda. Ka o wee bụrụ na mgbe ọ bụla i nwetara onwe gị, gbaakwa ụmụnna gị ndị a ume.
Ọ: Ma Pita sịrị Ya:
N: Onyenweanyị, ejikerela m iso Gị gaa mkpọrọ, bịakwa soro Gị nwụọ.
Ọ: Ma Jesu zara ya sị:
K: Pita, n’ezie ka M na-agwa gị, tupuu oke ọkụkụ akwaa akwa taa, ị ga-agọnarị M ugboro atọ na ị maghị onye M bụ.
Ọ: Jesu bịakwara jụọ ha, sị:
K: Mgbe M zipụrụ ụnụ na mbụ n’ejighị akpa ego, na akpa onye ije, na akpụkpọ ụkwụ, o nwere ihe ọ bụla kọrọ ụnụ?
Ọ: Ha zara sị:
N: Mba!
Ọ: O wee sị ha:
K: Ma nke ugbu a, onye nwere akpa ego, ya were ya. Onye nwere akpa onye ije, ya sere ya. Onye na-enweghị mma agha, ya ree uwe ya, zụta mma agha. N’ihi na ezi okwu M na-agwa ụnụ bụ na, ihe a e dere n’Akwukwọ Nsọ: “Ọ hapụrụ onwe Ya, ka e mee Ya ihe a na-eme onye mere arụ”, a ga-emezu ya n’uju n’ime M. N’ezie, ọ bụ ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru banyere M, ka a na-emezu ugbu a, ugbu a.
Ọ: Ha sịrị Ya:
N: Onyenweanyị! Lee, anyị nwere mma agha abụọ!
Ọ: O wee sị ha:
K: Nke ahụ ezuole!
Ọ: O wee kpọrọ Ụmụazụ Ya pụọ, gawa n’Ugwu Olivu dịka O si eme. Mgbe ha ruru n’ebe ahụ, Ọ sịrị ha:
K: Kpeenụ ekpere, ka ụnụ ghara ịdaba n’ọnwụnwa.
Ọ: O wee si n’ebe ha nọ pụọ, gaa n’ihu nke nta, sekpuru ala, kpee ekpere sị:
K: Nnaa! Ọ bụrụ na ọ masịrị Gị, biko, wepụrụ M iko a. Kama, ọ bụghị uche M ga-eme; ka uche Gị mee.
Ọ: Mgbe ahụ ka otu mmụọ ọma siri n’eluigwe bịa na-agba Ya ume. Ma O sitere n’ọnụma juru Ya obi, kpesie ekpere ike, nke na, ọsụsọ si Ya n’ahụ na-atasị n’ala, dịka ọkpụrụkpụ ọbara. Mgbe O si n’ekpere bilie, O jekwuuru Ụmụazụ Ya, hụ ha, ka ha na-arahụ ụra, n’ihi na obi adịghị ha mma. O wee sị ha:
K: Gịnị mere ụnụ ji na-arahụ ụra? Bilienụ! Na-ekpenụ ekpere, ka ụnụ ghara ịdaba n’ọnwụnwa!
Ọ: Jesu ka kpụ okwu a n’ọnụ, mgbe igwe mmadụ nupụtara. Onye du ha bịa bụ nwoke ahụ a na-akpọ Judas, otu n’ime Ụmụazụ iri na abụọ. Mgbe ha bịarutere ebe Jesu nọ, Judas pụtara bakụọ Jesu sutu Ya ọnụ. Ma Jesu sịrị ya:
K: Judas! Ọ bụ isutu ọnụ ka i ji ere Nwa nke Mmadụ?
Ọ: Mgbe Ụmụazụ Ya hụrụ ka ihe si aga, ha jụrụ Ya sị:
N: Onyenweanyị, mma agha dị n’ebe a. Anyị ga-eji ya lụso ha ọgụ?
Ọ: Otu n’ime ndị Ụmụazụ jiri mma agha gbupụ ntị otu onye na-ejere onyeisi nchụaja ozi. Ma na nke ahụ ka Jesu zara sị:
K: Ngwa, kwụsị ya! Nke ahụ ezuola!
Ọ: O metụrụ odibo ahụ aka na ntị, wee mezie ntị ya. Mgbe ahụ, Jesu gwara ndị isi nchụaja na ndị ọchị agha, nke ndị na-eche nche n’Ụlọ Nsọ, na ndị okenye, bịara ijide Ya, sị:
K: Ụnụ chịịrị mma agha na osisi bịa ijide M, dị ka a ga-asị na M bụ onye ohi? Oge a niile Mụ na ụnụ na-anọ n’Ụlọ Nsọ, kwa ụbọchị, kwa ụbọchị, ụnụ emetụghị ụñara ijide M. Ma ugbu a bụ oge ụnụ. Ugbu a, ọ bụ itiri na ọchịchịrị na-achị, mgbe Chineke kpebiri inye ekwensu ohere igosi ike ya.
Ọ: Ha jidere Jesu, duru Ya pụọ, kpụrụ Ya jee n’obi onye isi nchụaja. Ma Pita na-eso n’ebe dị anya. Ha kwanyere ọkụ n’etiti mbara ezi. Pita soro ha nọdụ ala. Mgbe ọ nọ ebe ahụ na-anya ọkụ, otu nwagbọghọ na-agba odibo n’ebe ahụ hụrụ ya, nyoo ya sị:
N: Onye a bụ onye otu Ya!
Ọ: Ma Pita gọrọ agọ sị:
N: Nwanyị, amaghị m onye Ọ bụ!
Ọ: Mgbe nwa oge nta gasịrị, onye ọzọ hụrụ Pita, wee sị:
N: Ị bụ otu onye n’ime ha!
Ọ: Ma Pita gọrọ agọ sị:
N: Enyi m, a bụghịkwa m otu n’ime ha!
Ọ: Mgbe ihe dị ka otu elekere gasịrị, nwoke ọzọ bịakwara kwusie okwu ike sị:
N: N’ezie, nwoke a bụ otu n’ime ndị na-eso Jesu. Lee, ọ bụkwa onye Galili.
Ọ: Ma Pita zara sị:
N: Enyi m, amaghị m ihe ị na-ekwu okwu banyere ya!
Ọ: Ọ bụ n’oge ahụ, mgbe Pita kpụ okwu n’ọnụ, ka oke ọkụkọ kwara akwa. Onyenweanyị tụgharịrị lee Pita anya na mkpụrụ anya. Pita wee cheta ihe ahụ Onyenweanyị gwara ya: “Tupuu oke ọkụkọ akwaa akwa taa, ị ga-agọnarị M ugboro atọ’. O wee pụọ, gaa kwaa akwa arịrị. Ma mgbe ihe ndị a na-aga, ndị ji Jesu n’agbụ, ji Ya eme ihe ọchị, na-eti Ya ihe. Ha kechiri Ya anya, na-asị Ya:
N: Ngwa! Buoro anyị amụma! Onye tiri Gị ihe?
Ọ: Ha kwukwara ọtụtụ okwu mkparị na okwu nkwulu dị iche iche na-emegide Ya. Mgbe chi bọrọ, ndị okenye, na ndị isi nchụaja, na ndị ode-akwụkwọ zukọrọ n’ọgbọ ikpe. A kpụpụtaara ha Jesu n’ọgbọ ikpe. Ha bidoro ịjụ Ya ajụjụ sị:
N: Ọ bụrụ na ị bụ Onye nzọpụta ahụ, gwa anyị!
Ọ: Ma Ọ sịrị ha:
K: Ọ bụrụ na M agwa ụnụ, ụnụ agaghị ekwenye. Ọ bụrụkwa na M ajụọ ụnụ ajụjụ, ụnụ agaghjị aza M. Ma site ugbu a gaa n’ihu, Nwa nke Mmadụ ga-ewere ọnọdụ n’aka nri nke Ike Chineke.
Ọ: Mgbe ahụ ha niile bidoro ịjụ Ya ajụjụ sị:
N: Ọ pụtarany na Ị bụ Nwa Chineke?
Ọ: Jesu zara ha:
K: Ee, ọ bụ dị ka ụnụ si kwuo ya.
Ọ: Ha zaghachiri sị:
N: Ọ dị mkpa ugbu a ịchọ ndị akaebe ọzọ? Anyị ejirila ntị anyị nụ ihe O jiri ọnụ Ya kwuo.
Ọ: Mgbe ahụ ọha mmadụ ahụ niile biliri kpụrụ Ya gawa n’ihu Paịlet. N’ebe ahụ, ha malitere ibo Jesu ebubo, sị:
N: Anyị jidere Nwoke a, ebe Ọ na-akpalite ndi mmadụ, ka ha bido ọgba aghara; na-agwa ha ka ha ghara ị tụrụ Siza ụtụ ala; na-ekwu na Ya bụ Kristi (Echiri echi) bụrụkwa Eze.
Ọ: Paịlet jụrụ Ya, sị:
N: Ị bụ eze ndị Juu?
Ọ: Jesu zara ya sị:
K: Ee, ọ bụ dị ka ikwuru.
Ọ: Paịlet gwara ndị isi nchụaja na igwe mmadụ ahụ niile sị:
N: Ahụghị m ihe ọjọọ ọ bụla Nwoke a mere.
Ọ: Ma ha nọgidere gwasie ya okwu ike sị Ya:
N: “O ji nkuzi Ya, na-esunye ọkụ ọgba aghara n’ala Judia niile. O bidolarị na Galili, kuziri nkuzi ruo ebe a.
Ọ: Mgbe Paịlet nụrụ ihe a, ọ jụrụ ma Nwoke a Ọ bụ onye Galili. Mgbe Paịlet chọpụtara na O si n’okpuru ọchịchị Herọd, ọ kpọgaara Ya Herọd, onye nọ na Jerusalem mgbe ahụ. Obi tọrọ Herọd ụtọ ịhụ Jesu. O teela mgbe ọ nụwara maka Jesu, bịakwa na-achọ ịhụ Ya. Nke ọzọ bụ na ọ chọkwara ịhụ ọrụ ebube n’aka Jesu. N’ihi ya ka o jiri jụwa Ya ogologo ajụjụ dị iche, iche, n’enwetaghị ọsịsa na nke ọ bụla. Mgbe a na-ekwu, ndị isi nchụaja na ndị ode-akwụkwọ nọ n’ebe ahụ, na-ebo Ya ebubo n’esepụghị ọnụ. Mgbe ahụ, Herọd na ndịagha ya jiri Ya na-akwa emu werekwa ya na-akpa ọchị. Ha yikwasara ya uwe mara mma, ụdị nke ndị eze na-eyi, ha dukwaara ya ọzọ jekwuru Paịlet. Na mbụ Herọd na Paịlet dị n’iro. Ma ha kpeziri iro dị n’agbata ha n’ụbọchị ahụ. Paịlet kpọrọ ndị isi nchụaja, na ndị ndu, na ndị mmadụ wee sị ha:
N: Ụnụ kpọtaara m Nwoke a, n’ihi na ụnụ sị na ọ na-eduhie ndị mmadụ. Ugbu a ajụọla m ya ajụjụ n’ihu ụnụ, chọpụta na ọ dịghị ihe ọjọọ ọ bụla o mere. Herọd n’onwe ya kwa achọpụtaghị ihe ọjọọ ọ bụla nwoke a mere. Ọ bụ n’ihi nke a ka o jiri zighachiri m ya. Ahụghị m ihe ọjọọ ọ bụla o mere nke pụrụ iwetara ya amamikpe ọnwụ. Ya mere, aga m apịa ya ihe hapụ ya ka ọ laa.
Ọ: Ma ha niile jiri otu olu tụọ ụzụ, tie mkpu sị:
N: Gbuo nwoke a, hapụrụ anyị Barabas!
Ọ: Bárabas bụ onye a tụrụ mkpọrọ n’ihi ịkpata ọgba aghara n’ime obodo, na igbu ọchụ. Ọ gụrụ Paịlet agụụ ịhapụ Jesu ka Ọ laa. O bidokwara ịgwa ha okwu ọzọ. Ma ha bidoro iti mkpu n’oke olu na-asị:
N: Kpọgbuo Ya! Kpọgbuo Ya!
Ọ: Ọ gwakwara ha okwu nke ugboro atọ sị:
N: Gịnị mere ụnụ ji chọọ ka nwoke a nwụọ? Gịnị bụ ihe ọjọọ o mere? A chọpụtaghị m ihe ọjọọ o mere nke ga-ewetara ya ọnwụ. Aga m apịa ya ihe hapụ ya ka ọ laa.
Ọ: Ma nke ọ bụla bara mba ka olu ya ha, na-eti ka a kpọgbuo Ya. Ụzụ na mkpọtụ si na mkpu ha na-eti bịara karịa. Paịlet wee bie ikpe ka e nye ha ihe ha rịọrọ. Ọ hapụụrụ ha onye ha sị ka a hapụrụ ha; nke bụ onye a tụrụ mkpọrọ maka ọgba aghara na igbu ọchụ. Ọ bịakwara nyefee ha Jesu n’aka, ka ha mee Ya ihe ọ bụla masịrị ha. Mgbe ha du Ya na-apụ, ha nwudere otu nwoke onye Sirin, a na-akpọ Saịmọn, ka o si n’azụ obodo na-alọta. Ha manyere ya amanye, ka o bute obe n’ubu, na-eso Jesu n’azụ. Nnukwu igwe mmadụ so Ya na-aga, tinyekwara ụmụ nwanyị na-emere Ya ebere, na-ebere Ya akwa. Ma Jesu tụgharịrị sị ha:
K: Ụmụada Jerusalem! Ụnụ eberela m akwa, kama berenụ onwe ụnụ, na ụmụ ụnụ akwa. N’ihi na oge na-abịa, mgbe ndị mmadụ ga-asị “Ọ dịrị ụnụ mma ụnụ ụmụ nwanyị ndị na-enweghị ụmụ, na ndị na-amụtaghị ụmụ ntakịrị, na ụnụ ndị na-enyebeghị ụmụ ntakịrị ara mbụ. N’oge ahụ, ọtụtụ ndị mmadụ ga-akpọku ugwu buru ibu sị ya, ‘Dakwasị anyị,’ ha ga-akpọkwa ugwu nta sị ya, ‘kpuchie anyị, zookwa anyị.’ Ọ bụrụ na ihe na-esiri osisi dị ndụ ike, gịnị ga-abụkwanụ ọnọdụ ya mgbe ọ kpọrọ nkụ?”
Ọ: E nwekwara ndị abalịdiegwu abụọ, a mara ikpe ọnwụ, e sokwa duru ha na Jesu. Mgbe ha rutere ebe a na-akpọ Okpokoro Isi, a kpọgidere Ya na ndị abalịdiegwu abụọ ahụ n’obe, kpọgide otu n’obe n’aka nri Ya; kpọgidekwa nke ọzọ n’obe n’aka ekpe Ya. Ma Jesu sịrị:
K: Nna gbaghara ha, n’ihi na ha amaghị ihe ha na-eme!
Ọ: Ndị agha fere nza, iji kesaa uwe Ya. Ndị mmadụ guzoro ebe ahụ na-ele Ya anya. Ndị ndu ndị Juu nọ na-achị ya ọchị, na-asị:
N: Ọ zọpụtara ndị ọzọ. Ya zọpụtanụ onwe Ya, ma a sị na Ọ bụ Echiri Echi nke Chineke, na Onye a Họtara Ahọta.
Ọ: Ndị agha sokwa jiri Ya na-eme ihe ọchị. Mgbe ha bịara inye Ya mmanya gbara ụka, ha sịrị Ya:
N: Ị bụrụ Eze ndị Juu, zọpụta onwe Gị!
Ọ: O nwere ihe e dere, kụpanye n’elu obe ahụ. Nke a bụ ihe e dere:
N: ONYE A BỤ EZE NDỊ JUU.
Ọ: Otu n’ime ndị abalịdịegwu ahụ, koro n’elu obe na-akọcha Ya sị:
N: “Ọ bụ Gị bụ Kristi ahụ, ka ọ bụ na Ị bụghị Ya? Zọpụtanụ onwe Gị! Zọpụtakwa anyị!
Ọ: Ma onye nke ọzọ baara ya mba, sị:
N: Ọ pụtara na ị naghị atụ egwu Chineke, ma otu? A mara gị ụdị ikpe a mara Ya; ma na nke anyị, ebubo e boro anyị, bụ ihe anyị mere n’ezie. Ọ bụ ihe anyị metara ka anyị na-akwụ ụgwọ ya. Mana Nwoke a emeghị ihe ọjọọ ọ bụla.
Ọ: Ọ bịa gwa Jesu:
N: Jesu! Chetakwa m mgbe Ị batara n’alaeze Gị.
Ọ: Jesu wee sị ya:
K: N’ezi okwu, ana M ekwe gị nkwa, na taa, ị ga-eso M anọ na Paradaịs (n’Ogige Añụrị).
Ọ: Ma mgbe o ruru ihe dị ka elekere iri na abụọ nke ehihie, anyanwụ lakpuuru, chi jiri ehihie jie, ọchịchịrị gbara ebe niile ruo elekere atọ nke ehihie. Akwa mgbochi nke Ụlọ Nsọ si n’etiti dọwaa ụzọ abụọ. Jesu jiri olu ike tie mkpu sị:
K: Nna! N’aka Gị ka M na-etinye Mmụọ M!
Ọ: Okwu a ka O kwuru, wee kubie ume.
(Onye ọ bụla ga-esekpuru ala, kpee ekpere ime obi).
Mgbe otu ọchị agha, na-achị narị ndị agha hụrụ ihe merenụ, o toro Chineke, wee sị:
N: Nwoke a ebuka! N’ezie, Ọ bụ ezi mmadụ! Aka ya dị ọcha!
Ọ: Mgbe ndị bịara ile otu a ga-esi kpọgbuo Jesu hụrụ ihe niile mere, ha hapụrụ ebe ahụ laa n’ụlọ ha, na-eti aka n’obi na mwute. Ndị enyi Jesu niile, na ụmụ nwanyị si Galili soro ya bịa Jerusalem, guzo n’ebe dị anya n’ele ihe ndị a. Ma ọ dị otu nwoke onye Juu a na-akpọ Josef si n’obodo a na-akpọ Arịmatịa. Josef bụ ezigbo mmadụ, bụrụkwa onye a na-asọpụrụ na onye na-ele anya ọbịbịa alaeze Chineke. Ọ bụkwa otu onye n’ime ndị na-anọ n’ụlọ ukwu ndị Juu, kama o kwagideghị mkpebi na mmeso ndị isi ndị Juu kpebiri megide Jesu site n’igbu ya. Ọ gara hụ Paịlet rịọ ya ka o kwe ya ka o buru ozu Jesu. Mgbe Paịlet nyere ya ike, Josef gara butuo ozu Jesu site n’elu obe ahụ. O ji akwa ọcha dị ogologo kechie ozu ahụ. E mesịa, o nyibere ya n’ili ọhụrụ o gwuru n’ime nkume nke a enyisabeghị onye ọ bụla n’ime ya mbụ. Josef mere ihe ndị a n’uhuruchi ụbọchị Fraịdee, n’oge ndị mmadụ na-akwado maka ụbọchị Satọdee bụ ụbọchị izuike ndị Juu. Ndị nwanyị ahụ si Galili soro Jesu bịa Jerusalem, sokwa Josef gaa hụ ili ahụ, hụkwa otu o si nyibe Jesu n’ime ya. E mesịa, ha lara n’ụlọ ha, gaa kwadoo ude na-esi isi ụtọ na mmanụ e ji echekwa ahụ mmadụ ka ọ hapụ isi isi. N’ụbọchị izuike ahụ, ha zuru ike dị ka e nyere n’iwu.
Igbo Mass Readings for April 14 2025, Mọnde n’ime Izuụka dị Asọ
Igbo Mass Readings for April 13 2025, Ụka Igu (Ọmụ) Nkwụ – Afọ nke Atọ.