Igbo Mass Readings for April 27 2025, Ụka Nke Abụọ N’oge Ncheta Mbilite N’Ọnwụ Kristi – Afọ nke Atọ.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for April 27 2025, Ụka Nke Abụọ N’oge Ncheta Mbilite N’Ọnwụ Kristi – Afọ nke Atọ.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 5:12-16

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Ọrụ Ndị Ozi

Isi Okwu: Ọnụ Ọgụgụ ndị kweere n’Onyenweanyị na-amụba kwa ụbọchị.

Ọtụtụ ihe ịrịbaama na ọrụ ebube ka a rụụrụ ndị mmadụ site n’aka Ụmụazụ Jesu. Ndị niile kwere ekwe jikwa otu obi na-ezukọ na mpaghara ụlọ nsọ ukwu Chineke a na-akpọ Mgbe Ụlọ Solomọn.

Ma ọ dịghịkwa onye ọ bụla na-anọghị n’otu ha, ọ dịịrị mfe inweta obisike isonyere ha; ọ bụ ezie na ndị mmadụ niile kwuru okwu dị mma banyere ha. Ma Chineke tụkwasịịrị ha igwe mmadụ, ma ndị nwoke ma ndị nwanyị, ndị ji obi ha kwere n’Onyenweanyị.

N’ihi ọrụ ịtụnanya nke ndị ozi na-arụ, ndị mmadụ na-ekupụtara ha ndị ọrịa n’ezi. Ụfọdụ ka ha na-atọgbọchi ụzọ n’ute, ma ọ bụ n’akwa. Nzube ha bụ ka onyinyo Pita wee dakwasị ụfọdụ n’ime ha mgbe Pita na-agafe ka ahụ dị ha mma.

Igwe mmadụ sikwa n’obodo niile dị Jerusalem gburugburu gbakọọ, kutekwara ha ndị ọrịa ma ndị mmụọ ọjọọ ji. Ha wee mee ka ahụ ha niile n’otu n’otu dị mma.

ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 117: 2-4, 15-18, 22-24 Az. 1

Azịza: Nyenụ Onyenweanyị ekele n’ihi na Ọ dịmma. N’ihi na ịhụnanya Ya enweghị ngwụcha. Ma ọ bụ Aleluya

1. Ka ụmụ Izrel kwuo sị: “Ịhụnanya Ya enweghị ngwụcha.”

Ka ụmụ Erọn kwuo sị: “Ịhụnanya Ya enweghị ngwụcha.”

Ka ndị niile na-atụrụ Onyenweanyị egwu kwuo sị:

“Ịhụnanya Ya enweghị ngwụcha.”

Azịza: Nyenụ Onyenweanyị ekele n’ihi na Ọ dịmma. N’ihi na ịhụnanya Ya enweghị ngwụcha. Ma ọ bụ Aleluya

2. A kpagidesiri m ike ka m daa,

ma Onyenweanyị nyeere m aka gbapụta m.

Onyenweanyị bụ ike m na ukwe m,

Ọ bụ Onye nzọpụta m.

Ụda mkpu ọñụ na mmeri,

dị n’ebe obibi nke ndị ezi omume.

Azịza: Nyenụ Onyenweanyị ekele n’ihi na Ọ dịmma. N’ihi na ịhụnanya Ya enweghị ngwụcha. Ma ọ bụ Aleluya

3. Nkume nke ndị na-ewu ụlọ jụrụ ajụ aghọọla ide ji ụlọ.

lhe a bụ ọrụ ebube nke Onyenweanyị,

ma ọ bụkwa ihe ịtụnanya n’ebe anyị nọ.

Taa bụ ụbọchị nke Onyenweanyị mere.

Ka anyị ñụrịanụ ọñụ bịakwa nwee obi añụrị.

Azịza: Nyenụ Onyenweanyị ekele n’ihi na Ọ dịmma. N’ihi na ịhụnanya Ya enweghị ngwụcha. Ma ọ bụ Aleluya

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 1:9-13, 17-19

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Mkpughe

Isi Okwu: Ọ dị mgbe m ghọrọ onye nwụrụ anwụ. Ma ugbu a aga m adịgide ndụ ruo mgbe ehighị ebi.

Ọ bụ m na-edere ụnụ akwụkwọ a. Mọ onwe m bụ Jọn, nwanne ụnụ na onye ụnụ na ya so nwekọọ otu ahụhụ, na otu alaeze, na otu ndidi ahụ dị mkpa n’ime Jesu.

Ndị ọchịchị mere ka m nọdụ na Patmọs, ala ntakịrị mmiri gbara gburugburu n’ihi na m kwusara okwu Chineke ma gbakwaara ihe Jesu kwuru akaebe. Mgbe m na-ekpe ekpere n’ụbọchị nke Onyenweanyị, ya bụ n’ụbọchị Sọnde, Chineke mere ka m nọrọ n’ime Mmụọ.

M wee nụ otu oke olu dara ka opi igwe n’azụ m, na-asị: “Ihe niile ị hụrụ, dee ha n’akwụkwọ! Zigakwara Ụka asaa ndị a: Zigara Ụka dị na Efesọs, na nke dị na Smina, na Pegamọs, na Tiatira, na Sadis, na Filadelfia na Laodesia.”

M wee chigharịa ka m mata onye nwe olu a na-akpanyere m ụka. Mgbe m chigharịrị, ahụrụ m ihe ịdọba oriọna asaa nke e ji ọlaedo kpụọ. Ahụkwara m onye dị ka Nwa nke Mmadụ, ka O guzo n’etiti ihe ịdọba oriọna asaa ahụ.

O yikwa uwe mwụda ruru Ya n’ụkwụ ala, werekwa ihe okike ọlaedo kee n’obi ya gburugburu. Mgbe m hụrụ Ya, m wee da n’ala n’ụkwụ Ya dịka onye nwụrụ anwụ.

O wee bikwasị m aka nri Ya, sị: “A tụla egwu! Abụ M Mmalite ihe niile na Ọgwụgwụ ihe niile. Abụ M Chi Ahụ Nwe Ndụ! E nweburu mgbe M ghọrọ onye nwụrụ anwụ.

Ma lee, adịzi M ndụ mgbe niile ebighị ebi. Ọ bụ M ji mkpịsị igodo nke e ji akpọchi ọnụ ụzọ ọnwụ na ọnụ ụzọ ọkụ ala mmụọ. Ya mere, dee ihe niile ị hụrụ n’akwụkwọ: ma ndị ị hụrụ na-emezu ugbu a, ma ndị ga-emezu n’ọdịnihu.

MBEKU – Jọn 20:29

Aleluya, aleluya!

Jesu kwuru sị: “I kwere n’ihi na ị hụla M. Ngọzi dịrị ndị na-ahụghị n’anya ma kwere”.

Aleluya!

OZIỌMA – 20:19-31

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere

Isi Okwu: Jesu bịara ka Ọ gasịrị mkpụrụ ụbọchị asatọ.

Na mgbede nke ụbọchị Ụka ahụ, bụ ụbọchị mbụ n’izu, ndị Ụmụazụ Jesu zukọrọ, kpọchie ụzọ n’ihi egwu ndị Juu. Mgbe ahụ, Jesu bịara, guzo n’etiti ha, sị ha: “Udo dịrị ụnụ!”

Mgbe O kwusịrị nke a, O gosịrị ha aka Ya abụọ na akụkụ Ya. Ya mere, ndị Ụmụazụ Ya ñụrịrị ọñụ mghe ha hụrụ Onyenweanyị. Jesu wee sị ha ọzọ: “Udo dịrị ụnụ! Dịka Nna M zitere M, otu a kwa ka M si eziga ụnụ”.

Mgbe O kwusịrị nke a, O kusara ha ume, sị ha: “Naranụ Mmụọ Nsọ. Ndị niile ụnụ gbaghara mmehie ha, a gbagharala ha. Ndị niile ụnụ jụrụ ịgbaghara mmehie ha, a gaghị agbaghara ha.”

Otu onye n’ime ndị ozi iri na abụọ ahụ, Tọmọs, nke a na-akpọ Ejima, esoghị ha nọrọ mgbe Jesu bịara. Ya mere, ndị ozi ibe ya ndị ọzọ, wee sị ya: “Anyị ahụla Onyenweanyị!” Tọmọs wee sị ha: “Ọ bụ naanị mgbe m jiri anya m hụ ebe ntu kpọpuru ya aka.

Ọ bụ naanị mgbe m tinyere aka m n’apa ntu ndị a, ọ bụkwa naanị mgbe m tinyere aka m n’akụkụ ya ebe a mara ya ube, ka m ga-ekwere na O sitela n’ọnwụ bilie.”

Mgbe ụbọchị asatọ gasịrị, ndị Ụmụazụ Ya zukọkwara ọzọ n’ime otu ụlọ. Tọmọs nọkwa n’etiti ha. A kpọchiri ụzọ akpọchi. Ma Jesu batara, guzo n’etiti ha, sị ha: “Udo dịrị ụnụ!” O wee sị Tọmọs, “Weta mkpịsị aka gị tinye n’ebe a. Lelee aka M abụọ.

Setịpụkwa aka gị, tinye ya n’akụkụ M. A bụla onye na-esi agụgọ. Kama bụrụ onye kwere ekwe.” Tọmọs wee tie, sị Ya: “Onyenwe m na Chineke m!” Jesu wee sị ya: “I kweere ugbu a n’ihi na i ji anya gị hụ.

Ma ngọzi dịịrị ndị na-ahụghị m ma kwere.” Ọtụtụ ọrụ ebube ndị ọzọ ka Jesu rụrụ n’ihu ndị Ụmụazụ Ya, ndị a na-edeghị n’ime akwụkwọ a. Ma e dere ndị a ka ụnụ wee kwere na Jesu bụ Kristi ahụ, Nwa Chineke, ka ụnụ wee site n’okwukwe ụnụ nweta ndụ n’aha Ya.

Igbo Mass Readings for April 28 2025, Mọnde Izuụka nke Abụọ n’oge Ncheta Mbilite N’Ọnwụ Kristi

Igbo Mass Readings for April 27 2025, Ụka Nke Abụọ N’oge Ncheta Mbilite N’Ọnwụ Kristi – Afọ nke Atọ.