Igbo Mass Readings for January 18 2026, Ụka nke Abụọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Mbụ.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for January 18 2026, Ụka nke Abụọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Mbụ.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 49:3, 5, 6
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Onye Amụma Aịzaya
Isi Okwu: Aga M eme ka ị ghọọ ihe mba niile ji ahụ ụzọ, ka nzọpụta M wee gazuo ụwa niile.
Onyenweanyị gwara m: “Izrel, ị bụ nwodibo M, aga M esi na gị egosipụta ebube M.” Ugbu a, Onyenweanyị ekwuola okwu; Onye ahụ kpụrụ m n’afọ nne m ekwuola na a ga-akpọghachiri Ya Jekọp, bịakwa kpọkọtara Ya Izrel.
E tubere m ugo n’anya nke Onyenweanyị. Chineke m bụkwa ike m. O kwuru sị: “Ime gị nwodibo M, ọ dị ofere?
Ọ dị fecha fecha ikulite agbụrụ Jekọp, bịakwa mee ka ndị e gbufọrọ egbufọ n’ala Izrel kwụrụ chịm? Aga M eme ka ị ghọọ ihè ụmụ mba ji ahụ ụzọ, ka nzọpụta M wee garuo na ngwụcha ụwa.
ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 39:2, 4, 7-10 Az. 8,9
Azịza: Onyenweanyị, anọ m n’ebe a. Abịara m ime uche Gị.
1. E chere m Onyenweanyị,
chegide Ya ruo mgbe O hulatara bịa nụ mkpu akwa m.
O tinyere abụ ọhụrụ n’ọnụ m,
nke bụ ukwe otito nke Chineke anyị.
Azịza: Onyenweanyị, anọ m n’ebe a. Abịara m ime uche Gị.
2. Ọ bụghị aja ma ọ bụ onyinye nhunye ka ị chọrọ.
Kama ọ bụ ntị ghere oghe.
Ị chọghị aja nsure ọkụ na aja a chụrụ maka njọ.
N’ihi ya ka m jiri kwuo sị: “Lee, abịala m”.
Azịza: Onyenweanyị, anọ m n’ebe a. Abịara m ime uche Gị.
3. Chineke m, ọ bụ iwu e deere m n’obodobo akwụkwụ ahu: na m ga-eme uche Gị.
Iwu Gị bi ebi n’ime obi m.
Azịza: Onyenweanyị, anọ m n’ebe a. Abịara m ime uche Gị.
4. Onyenweanyị, ekwupụtara m ikpe nkwụmọtọ Gị n’ihu Nzukọ.
Ekpuchighị m ọnụ m.
Azịza: Onyenweanyị, anọ m n’ebe a. Abịara m ime uche Gị.
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 1:1-3
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Mbụ Pọl dị asọ degaara Ndị Kọrịnt
Isi Okwu: Ka Chineke Nna anyị na Onyenweanyị Jesu Kristi zitere ụnụ amara na udo.
Pọl, onye a kpọrọ ịbụ onye ozi nke Kristi Jesu, site n’ọchịchọ nke Chineke, na Sọstenis bụ nwanne anyị, na-edegara Nzukọ Chineke dị na Kọrịnt akwụkwọ ozi a.
Akwụkwọ ozi a sokwara bụrụ nke ụnụ niile bụ ndị e doro nsọ n’ime Kristi Jesu, ndị a kpọrọ ịbụ ndị nsọ nke Chineke, ha na ndị niile, n’ebe niile, na-akpọku aha Onyenweanyị Jesu Kristi,
Onye bụ Onyenwe anyị na ha: Ka amara na udo nke si n’aka Chineke bụ Nna anyị, na n’aka Onyenweanyị Jesu Kristi dịrị ụnụ!
MBEKU – Luk 19:38
Aleluya, aleluya!
Ngọzi dịrị eze bịara n’aha Onyenweanyị. Udo dịrị ụwa, ebube dịrị igwe.
Aleluya!
OZIỌMA – 1:29-34
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere
Isi Okwu: Lee Nwatụrụ nke Chineke, Onye na-ekpochapụ njọ nke ụwa.
N’echi ya, Jọn ewee hụ Jesu ka Ọ na-abịakwute ya. O wee kwupụta sị: “Lee Nwatụrụ Chineke, Onye na-ebupụ njọ nke ụwa! Ọ bụ maka Ya ka m na-ekwu mgbe m gwara ụnụ, sị: “Otu nwoke na-abịa n’azụ m.
Ma Ya onwe Ya ka m. N’ihi na Ọ dịrịị adị tupu a mụọ m! Mụ onwe m amabụghị Ya. Ma abịara m na-eme ndị mmadụ mmirichukwu nke mmiri, ka m wee gosi Ya ndị Izrel.”
Jọn wee gbaa akaebe sị: “Ahụla m Mmụọ Nsọ ka O si n’eluigwe fedata n’ụdị nduru wee dakwasị Ya. Mụ onwe m amabughị Ya. Ma Onye ahụ zitere m ka m jiri mmiri mee ndị mmadụ mmirichukwu gwara m, sị:
“Onye ọ bụla ị hụrụ Mmụọ Nsọ fedatara bịa bekwasị n’isi, onye ahụ bụ onye nke ga-eji Mmụọ Nsọ eme ndị mmadụ mmirichukwu.” Ugbu a, ahụla m Ya wee gbaa akaebe na ọ bụ Nwa Chineke n’eziokwu.”
Igbo Mass Readings for January 19 2026, Mọnde Izuụka nke Abụọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume
Igbo Mass Readings for January 18 2026, Ụka nke Abụọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Mbụ.