Igbo Mass Readings for December 7 2025, Ụka nke Abụọ N’oge Olileanya Onye Nzọpụta – Afọ Nke Mbụ

Nke a bụ Igbo Mass Readings for December 7 2025, Ụka nke Abụọ N’oge Olileanya Onye Nzọpụta – Afọ Nke Mbụ.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 11:1-10

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Onye Amụma Aịzaya

Isi Okwu: Ọ na-ekpeziri ndị a na-emegbu emegbu ikpe

Ome ga-esi n’ogwe osisi Jese epupụta. Otu Ngalaba ga-esi na mgbọrọgwụ ya epulite. Mmụọ nke Onyenweanyị ga-anọnye n’ime Ya, mmụọ nke ndụmọdụ na ịdị ike; mmụọ nke amamihe na ịtụ egwu Chineke.

(Ịtụ egwu Chineke bụ ume ndụ Ya). Ọ bụghi ihe anya hụrụ ka Ọ na-ekpe n’ikpe. Ọ bụghịkwa asịrị ka O ji ebi ikpe. Kama Ọ na-ekpeziri ndị a na-emegbu emegbu ikpe, bịakwa kwụba aka ọtọ n’ikenye ụmụ ogbenye bi n’ala ahụ oke ruuru ha. Okwu ọnụ Ya bụ mkpara igwe O ji akụgbu ndị obi ọjọọ. Ọ ga-ama ndị obi kpọrọ nkụ ikpe ọnwụ. Izu oke ka O ji mere akwa O je n’ukwu.

Ezi omume bụ ajị O kere n’ume. Mgbe ahụ, agụ na nwatụrụ ga-ebikọta ọnụ. Agụ ukwu na nwa ewu ga-edinakọta n’otu ebe. Nwa ehi na nwa ọdụm ga na-erikọ nri, nwata ntakịrị abụrụ onye ndu ha.

Nne ehi na nnukwu ọdụm ga-abụ enyi, ụmụ ha wee na-edinakọta ọnụ. Agụ ga-ata ahịhịa dịka ehi, nwa na-añụ ara ga-egwurị egwu n’ọnụ ala, ebe agwọ bi. Nwata ntakịrị ga-amanye aka n’ọnụ ajụala.

A gaghị enwe nsogbu ma ọ bụ imerụ ahụ ọ bụla n’elu ugwu nsọ M niile. N’ihi na amamihe Onyenweanyị jupụtara obodo ahụ n’ọnụ, dịka mmiri si ejupụta n’oke osimiri.

N’ụbọchị ahụ, mgbọrọgwụ, Jese ga-eguzoro, ghọọrọ mba niile ihe ịrịbaama. Ndị mba ọzọ ga-achọsi Ya ike, maka na ebe obibi Ya ga-adị ebube.

ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 71:1-2, 7-8, 12-13, 17. Az. 7

Azịza: N’oge Ya, ezi omume ga-etolite dịka ahịhịa ndụ. Udo ga-adịgide ebe nilie ruo mgbe ebighịebi.

1. Biko Chineke, were ikpe nkwụmọtọ Gị nye eze.

Nyekwuo nwa eze ezi omume Gị.

Ọ ga-eji ikpe nkwụmọtọ chịkwawa ndị nke Gị;

bịakwa kpeziere ndị a na-emegbu emegbu ikpe.

Azịza: N’oge Ya, ezi omume ga-etolite dịka ahịhịa ndụ. Udo ga-adịgide ebe nilie ruo mgbe ebighịebi.

2. N’oge Ya, ezi omume ga-etolite dịka ahịhịa ndụ.

Udo ga-adịgide ebe niile ruo mgbe ebighị ebi.

Ọ ga-esite n’oke osimiri chịruo ọchịchị n’oke osimiri;

bịakwa site n’oke osimiri chịruo ọchịchị n’ebe ụwa kwụsịrị.

Azịza: N’oge Ya, ezi omume ga-etolite dịka ahịhịa ndụ. Udo ga-adịgide ebe nilie ruo mgbe ebighịebi.

3. N’ihi na Ọ ga-agbapụta nwa ogbenye ahụ na-etiku Ya.

Ọ ga-agbapụtakwa onye ahụ a na-emegbu emegbu,

nke na-enweghị onye enyemaka.

Ọ ga-enyere ndị nọ na mkpa aka,

bịakwa meere ụmụ ogbenye ebere.

Ọ ga-azọpụtakwa ndụ ụmụ ogbenye.

Azịza: N’oge Ya, ezi omume ga-etolite dịka ahịhịa ndụ. Udo ga-adịgide ebe nilie ruo mgbe ebighịebi.

4. Ngọzi dịrị aha Ya ruo mgbe ebighị ebi.

Aha Ya ga-adịgide mgbe niile dịka anyanwụ.

Agbụrụ niile dị n’ụwa ga-esi na Ya enweta ngọzi.

Mba niile ga na-akpọ Ya onye dị ngọzi.

Azịza: N’oge Ya, ezi omume ga-etolite dịka ahịhịa ndụ. Udo ga-adịgide ebe nilie ruo mgbe ebighịebi.

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 15:4-9

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọozi Pọl dị asọ degaara ndị Rom

Isi Okwu: Kristi bụ onye nzọpụta nke mmadụ niile

N’ezie ihe niile e dere n’Akwụkwọ Agba Ochie, bụ ihe e dere, iji kụziere anyị maka nchekwube. Akwụkwọ Nsọ ji ihe amụmatụ dị iche iche na-akọwa, otu ndị jụrụ ikwere na e meriela ha, si nweta enyemaka Chineke.

Ka Onye ahụ na-enyere anyị aka, mgbe anyị jụrụ ikwere na e meriela anyị, nyekwara ụnụ niile aka, ka ụnụ were ndidi na-edigbu ihe ibe ụnụ na-eme ụnụ bịakwa soro ụkpụrụ nke Kristi Jesu.

Ka ụnụ were otu obi na otu olu na-eto Chineke, na Nna Onyenweanyị Jesu Kristi. Ihe ọ pụtara bụ, na iji ịhụnanya meere ndị ọzọ, ụdị amara ahụ Kristi meere ụnụ, bụ inye Chineke otito.

Ihe kpatara Kristi ji bụrụ odibo ndị Juu e biri ugwu, abụghị naanị ka e mezuo nkwa ahụ e kwere nna nna anyị ha; ọ bụkwa ka e soro kpọbata ndị ọgọmmụọ n’inye Chineke otito maka ebere Ya, dịka Akwụkwọ Nsọ si kwuo n’otu ebe sị: “N’ ihi nke a, aga m eto Gị n’etiti ndị ọgọmmụọ, bịakwa kweere aha Gị ukwe.”

MBEKU – Luk 3:4, 6

Aleluya aleluya!

Kwadooronụ Onyenweanyị ụzọ! Meenụ ka okporo ụzọ Ya guzozie. Mmadụ niile ga-ahụ nzọpụta nke Chineke.

Aleluya!

OZIỌMA -3:1-12

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Isi Okwu: Chegharịanụ! N’ihi na alaeze eluigwe abịala nso

N’oge ahụ, Jọn Ome Mmirichukwu pụtara na-ekwu okwuchukwu n’ọzara nke Judia. Lee ozi o ziri: “Chegharịanụ, n’ihi na alaeze eluigwe abịala nso.” Onye a bụ nwoke ahụ onye amụma Aịzaya kwuru maka ya sị: “Otu olu na-akpọ n’ịkpa; Kwadoonụ ụzọ maka Onyenweanyị.

Meenụ ka ụzọ Ya kwụrụ ọtọ.” Nwoke a bụ Jọn ji ajị nyịnya kwaa uwe; bịakwa were akpụkpọ anụ jere n’ukwu. Nri ya bụ ụkpala na mmanụ añụ dị n’ọhịa.

Jerusalem niile na Judia niile, na Ọnụmara Jọdan niile bịakwutere ya. Mgbe ọ na-eme ha mmirichukwu n’osimiri Jọdan, ha na-ekwupụta njọ ha. Ma mgbe ụfọdụ ndị ome ka e too ha (Farisii) na ndị Sadusii bịara maka mmirichukwu, ọ sịrị ha: “Ụmụ ajụala, onye dọrọ ụnụ aka na ntị ka ụnụ gbalaha ụgwọ njọ nke na-abịanụ?

A sị ụnụ echegharịala, mịtanụ mkpụrụ gosịrị nchegharị. O zubeghị ịgwa onwe ụnụ sị: “Anyị nwere Ebreham na nna.” Maka na, n’ezie, Chineke nwere ike ime okwute ndị a, ka ha ghọọ ụmụ Ebreham.

Ọ bụrụgodụ ugbu a, anyike tọgbọrọ n’ukwu osisi; ka o wee bụrụ na osisi ọ bụla na-amịtaghị ezi mkpụrụ, a ga-egbutu ya tụnye n’ọkụ. Eji m mmiri na-eme ụnụ mmirichukwu maka nchegharị.

Ma onye ahụ na-esota m kariri m ike. Etorughị m ịchịta akpụkpọ ụkwụ Ya. Ọ ga-eji Mmụọ Nsọ na ọkụ mee ụnụ mmirichukwu. Nkata O ji ayọ ọka dị Ya n’aka. Ọ ga-ayọchasị ọka Ya nke ọma. Ọ ga-ekpokọta mkpụrụ ọka Ya n’ọba Ya. Ma afụ ọka ka Ọ ga-akpọ ọkụ ebighị ebi.”

Igbo Mass Readings for December 8 2025, Nnukwu Emume Ịtụ Ime Marịa dị Ngọzi N’Ejighị Njọ.

Igbo Mass Readings for December 7 2025, Ụka nke Abụọ N’oge Olileanya Onye Nzọpụta – Afọ Nke Mbụ.