Igbo Mass Readings for February 21 2027, Ụka nke Abụọ N’oge Ncheta Ahụhụ Kristi – Afọ Nke Abụọ.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for February 21 2027, Ụka nke Abụọ N’oge Ncheta Ahụhụ Kristi – Afọ Nke Abụọ.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 22:1-2, 9-13, 15-18.
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Jenesis
Isi Okwu: Aja Ebreham, nna anyị n’okwukwe, chụrụ.
Chineke nwara Ebreham ọnwụnwa. Ọ kpọrọ ya sị: “Ebreham! Ebreham! Ọ zaa Ya sị: “Anọ m n’ebe a.” Chineke asị ya: “Kpọrọ nwa gị nwoke, sọ otu nwa gị, Aịzik, onye dị gị n’obi; kpọrọ ya gaa n’ala Moria.
Ebe ahụ ka ị ga-eji ya achụnyere M aja nsureọkụ n’elu ugwu M ga-egosi gị.” Mgbe ha bịarutere n’ebe ahụ Chineke gwara ya, Ebreham wuru ebe nchụaja, bịakwa dozie nkụ n’elu ya.
Ọ bịakwa setịa aka ya dara mma ọ ga-eji egbu nwa ya. Ma Mmụọ ozi nke Onyenweanyị si n’eluigwe kpọọ ya oku sị: “Ebreham! Ebreham!” Ọ zakwaa Ya sị: “Anọ m n’ebe a. “Mmụọ ozi ewee sị ya: “E bitukwala nwata ahụ aka.
E merụkwala ya ahụ, n’ihi na amatala m ugbu a na ị na-atụrụ Chineke egwu: Ị jụghị inye M nwa gị, sọ otu nwa gị.” Mgbe Ebreham lelitere anya elu, ọ hụrụ otu ebulu nke eriri ọhịa jidere na mpi.
Ebreham weere ebulu ahụ chụọ aja nsureọkụ, kama iji nwa ya. Mmụọ ozi nke Onyenweanyị esi n’eluigwe kpọọ Ebreham nke ugboro abụọ sị: “Ọ bụ Onyenweanyị na-ekwu ihe a: Eji M onwe M añụ iyi.
Ebe ọ bụ na ị mere ihe a, n’ihi na ị jụghị inye M nwa gị nwoke, sọ otu nwa gị: aga M ehukwasa gị ngọzi. Aga M eme ka ụmụ ụmụ gị dị agụta agụta dịka kpakpando dị n’igwe, na aja dị n’agịga mmiri.
Ụmụ ụmụ gị ga-enweta ọnụ ụzọ ama ndị iro ha, iji kwụọ gị ụgwọ maka isi i rubeere M. Mba niile dị n’ụwa ga-esi n’ụmụ ụmụ gị na-agọzi onwe ha.
ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 115:10, 15, 19 Az. 114:9
Azịza: Aga m na-aga n’ihu nke Onyenweanyị n’ala ndị dị ndụ.
1. Echekwubere m sie ike,
ọbụladị mgbe m kwuru sị: “Ahụsiela m anya!”
Ọnwụ nke ndị kwụdosiri ike dị oke ọnụ n’ihu nke Onyenweanyị.
Azịza: Aga m na-aga n’ihu nke Onyenweanyị n’ala ndị dị ndụ.
2. Onyenweanyị, nwodibo Gị ka m bụ.
Abụ m nwodibo Gị. Ịtọhapụla m n’agbụ.
Ana m ehunye aja ekele.
Aga m akpọku aha nke Onyenweanyị.
Azịza: Aga m na-aga n’ihu nke Onyenweanyị n’ala ndị dị ndụ.
3. Aga m emeju nkwa m kwere Onyenweanyị,
n’ihu ndị nke Ya niile.
Aga m emeju ya n’Ụlọ Nsọ nke Onyenweanyị,
n’etiti gị bụ Jerusalem.
Azịza: Aga m na-aga n’ihu nke Onyenweanyị n’ala ndị dị ndụ.
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 8:31-34
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọozi Pọl dị asọ degaara ndị Rom
Isi Okwu: Chineke ahapụghị Nwa nke Ya.
Ọ bụrụ na Chineke dịnyeere anyị, onye ga-emegide anyị? Onye ahụ na-azọdoghị Nwa Ya, kama O weere Ya nye n’ihi anyị niile; ọ bụ na Ọ gaghị eji amara nyekwuo anyị ihe niile mgbe O nyesịrị anyị Nwa Ya?
Onye ga-ebo ndị Chineke họpụtara ebubo? Ọ bụ Chineke, onye na-agụ ha na ndị eziomume? Onye pụrụ ịma ha ikpe? Ọ bụ Kristi Jesu? Mba! ọ bụghị naanị na Ọ nwụrụ maka ihi anyị, kama O si n’ọnwụ bilie, bịa nọrọ n’aka nri Chineke na-arịọrọ anyị arịrịọ.
MBEKU – Matiu 17:15
R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.
E si n’igwe ọcha nụ olu nke Nna: “Onye a bụ Nwa M, M hụrụ n’anya, Onye ihe Ya na-amasị M.
R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.
OZIỌMA – 9:2-10
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere.
Isi Okwu: Onye a bụ Nwa M hụrụ n’anya. Onye ihe Ya na-amasị M.
Jesu kpọọrọ Pita na Jemis na Jọn duru ha rịgoro otu ugwu dị elu. Ha wee nọdụ iche naanị ha. Jesu wee nwoghaa onwe Ya n’ihu ha. Uwe ya nwupụkwara ọcha karịa uwe ọcha ọ bụla nke anya hụrụla.
E wee mee ka Ụụuazụ Ya atọ ahụ hụ Elaịja na Mosis, ebe ha na Jesu na-akparịta ụka. Pita wee sị Jesu: “Onye Nkuzi, ọ dị mma ka anyị nọrọ n’ebe a. Ka anyị wuo ụlọ-mkpuke atọ: Otu dịrị Gị.
Otu dịrị Mosis, otu adịkwara Elaịja.” Ihe Pita ji kwuo nke a bụ na ọ mazighị ihe ọ ga-ekwu: n’ihi na oke egwu ji ya na Ụmụazụ Jesu abụọ ndị ọzọ. Igwe-ojii wee bịa, olu wee sikwa n’igwe-ojii ahụ daa, na-akọwara Ụmụazụ Ya, sị: “Onye a bụ Nwa M, M hụrụ n’anya, nụrụnụ okwu Ya.”
N’otu oge ahụ, Ụmụazụ Jesu atọ ahụ were lee anya gburugburu. Ha ahụghịkwa onye ọ bụla ọzọ ma ọ bụghị naanị Jesu. Mgbe ha si n’elu ugwu na-arịdata, Jesu wee dọsie Ụmụazụ Ya atọ ahụ aka na ntị ike, ka ha ghara ịkọrọ onye ọ bụla ihe ha hụrụ, ruo mgbe Nwa nke Mmadụ bilitechara n’ọnwụ. Ha wee zobe okwu a n’obi, n’onwe ha, na-ajụrịta ibe ha ihe bụ “isi na ndị nwụrụ anwụ bilie.”
Igbo Mass readings for February 22 2027, Emume Oche Pita dị Asọ
Igbo Mass Readings for February 21 2027, Ụka nke Abụọ N’oge Ncheta Ahụhụ Kristi – Afọ Nke Abụọ.