Igbo Mass Readings for April 26 2026, Ụka Nke Anọ N’oge Ncheta Mbilite N’Ọnwụ Kristi – Afọ nke Mbụ.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for April 26 2026, Ụka Nke Anọ N’oge Ncheta Mbilite N’Ọnwụ Kristi – Afọ nke Mbụ.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 2:14, 36-41

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Ọrụ Ndị Ozi

Isi Okwu: Chineke emeela Ya Dinwenụ na Kristi

Ma Pita guzoro, ya na Ụmụazụ iri na otu ahụ, wee welie olu ya gwa ọgbakọ ahụ okwu, sị: “Ndị Juu ibe m, na ụnụ niile bụ ndị bi na Jerusalem! Geenụ ntị ka m kọwaara ụnụ ihe ndị a.

Geekwanụ ntị n’okwu m chọrọ ikwu! Ana m eme ka ndị Izrel niile mara nke ọma na Chineke emeela Jesu Onye ụnụ kpọgidere n’obe ka Ọ bụrụ Onyenweanyị na onye nzọpụta anyị.

Ma mgbe ọgbakọ ahụ nụrụ nke a, ihe a wee dụọ ha na mkpụrụ obi. Ha wee sị Pita, na ndị ozi ndị ọzọ: “Ụmụnna anyị, gịnị ka anyị ga-eme”? Pita wee sị ha: “Chegharịanụ, sitekwanụ na mmehie ụnụ tụgharịa bịakwute Chineke; ka e mee ụnụ mmirichukwu n’aha Jesu Kristi.

Chineke ga-agbagharakwa ụnụ mmehie ụnụ niile. Ụnụ ga-anatakwa onyinye a, bụ Mmụọ Nsọ. N’ihi na ọ bụ ụnụ, na ụmụ ụnụ, na ndị niile nọ n’ebe dị anya, ka nkwa ahụ dịịrị – bụ ndị niile Onyenweanyị bụ Chineke anyị, ga-akpọtara onwe Ya”.

Pita jikwa ogologo okwuchukwu gwasie ọgbakọ ahụ ike, na-arịọkwa ha, sị: “Zọpụtanụ onwe ụnụ n’ahụhụ ga-adakwasị ọgbọ nke a gbagọrọ agbagọ”. Ọtụtụ mmadụ ndị nụrụ okwu ya wee kwere na Kristi, e wee mee ha mmirichukwu. N’ụbọchị ahụ, Chineke tụkwasịịrị ha ihe ruru puku mmadụ atọ.

ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 22:1-6 Az. 1

Azịza: Dinwenụ bụ onye nche m; o nwekwaghị ihe m ga-achọ.

1. Dinwenụ bụ Onye nche m. O nwekwaghị ihe m ga-achọ.

Ebe ahịhịa ndụ juru eju ka Ọ na-enye m ezumike.

Ọ na-eduga m n’akụkụ mmiri ka m zuru ike, ka m were kutakwa ume.

Azịza: Dinwenụ bụ onye nche m; o nwekwaghị ihe m ga-achọ.

2. Ọ na-edu m n’ụzọ ezi omume n’ihi aha Ya.

Ọ bụrụgodụ na m na-aga na ndagwurugwu ọchịchịị,

agaghị m atụ egwu ihe ọjọọ ọ bụla.

N’ihi na I ji mkpara na ngu Gị nọnyere m.

Ọ bụ ha na-akasị m obi.

Azịza: Dinwenụ bụ onye nche m; o nwekwaghị ihe m ga-achọ.

3. I ji aka Gị kwadoro m oriri nke m ga-eri n’ihu ndị iro m.

I ji aka Gị tee m ude n’isi.

Iko m ejula n’ọnụ,

Azịza: Dinwenụ bụ onye nche m; o nwekwaghị ihe m ga-achọ.

4. Ịdị mma na obi ọma ga na-agbaso m,

ụbọchị niile nke ndụ m.

Aga m ebi n’ụlọ nke Onyenweanyị,

ebighị ebi ebighị ebi.

Azịza: Dinwenụ bụ onye nche m; o nwekwaghị ihe m ga-achọ.

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 2:20-25

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Mbụ nke Pita dị asọ dere

Isi Okwu: Ụnụ alọghachiela azụ na nke onye nche ndụ ụnụ.

Ụnụ maara na o nweghị otito ụnụ ga-enwe n’ihi na ụnụ ji ndidi anagide ahụhụ nke a na-enye ụnụ n’ihi ihe ọjọọ ụnụ mere. Ma ọ bụrụ na ụnụ na-anagide ahụhụ nke a na-enye ụnụ n’ihi ihe ọma ụnụ na-eme, ụnụ ga-enweta ngọzi n’aka Chineke.

Ọ bụ ime ihe dị otu a ka Chineke ji kpọọ ụnụ. N’ihi na Kristi tara ahụhụ n’ihi ụnụ, wee hapụrụ ụnụ ihe ịma atụ nke ụnụ ga na-eso. O meghị njọ ọ bụla. Ọ dịghịkwa mgbe ọ bụla okwu ụgha si n’ọnụ Ya pụta.

O kwutọghị onye ọ bụla mgbe ha na-ekwutọ ya. Ọ baghị mba ọ bụla mgbe ha na-ata ya ahụhụ, kama naanị ihe o mere bụ iwere ihe niile nyefee n’aka Chineke onye na-ekpe ikpe ziri ezi.

Dịka ihe e ji achụ aja, Ya onwe Ya buuru mmehie niile anyị mere n’ahụ Ya ruo n’elu obe. O mere nke a ka anyị wee nwụọ n’ebe mmehie dị, bịakwa na-adị ndụ nke ezi omume.

E sitekwara na apa ọnya dị ya na ahụ gwọọ ụnụ. Na mbụ, ụnụ dị ka ụmụ atụrụ na-awagharị na-achọ ụzọ, ma ugbu a e meela ka ụnụ laghachikwute onye na- azụ ụnụ dị ka atụrụ, na onye na-echebe mkpụrụ obi ụnụ.

MBEKU – Jọn. 10:14

Aleluya, Aleluya!

Onyenweanyị kwuru sị: “Abụ M ezigbo onye nche atụrụ. Amaara M atụrụ M, atụrụ M makwara M.

Aleluya!

OZIỌMA – 10:1-10

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere

Isi Okwu: Abụ M ọnụ ụzọ nke ogige atụrụ

Jesu kwuru sị: “Eziokwu ka M na-agwa ụnụ: Onye ọ bụla nke na-esighị n’ọnụ-ụzọ banye n’ogige atụrụ, nke na-esi n’ebe ọzọ ụzọ na-adịghị arịba, bụ onye ohi na onye na-apụnarị mmadụ ihe n’ike.

Ma onye na-esi n’ọnụ ụzọ abanye bụ onye ọzụzụ atụrụ. Onye na-eche ọnụ ụzọ ogige atụrụ na-emeghere ya ụzọ. Atụrụ ya maara olu ya. Ọ na-akpọkwa atụrụ ya aha, wee na-edupu ha.

Oge ọ bụla ọ chịpụrụ atụrụ ya, ọ na-aga n’ihu ha. Ha na-eso ya n’azụ, n’ihi na ha maara olu ya. Ma ha agaghị eso onye ọbịa. Kama ha ga-agbara ya ọsọ. N’ihi na ha amaghị olu ya”.

Ilu a ka Jesu tụụrụ ha. Ma ha aghọtaghị ihe Ọ na-agwa ha. Jesu wee gwa ha ọzọ sị: “N’ịgwa ụnụ eziokwu: Mụ onwe M bụ ọnụ ụzọ nke ogige atụrụ. Ndị niile buuru M ụzọ bịa bụ ndị ohi na ndị na-apụnarị mmadụ ihe n’ike.

N’ihi nke a atụrụ añakwaghị ha ntị. Mụ onwe M bụ ọnụ ụzọ ahụ. Ọ bụrụ na onye ọ bụla esi na M baa, a ga-azọpụta ya. Ọ ga na-apụ, na-abatakwa, na-achọtakwa nri ọ ga eri. Onye ohi na-abịa naanị ka o wee zuo ohi, gbuo mmadụ, laakwa ihe n’iyii. Ma Mụ onwe M bịara ka ha wee nwee ndụ, nwekwaa ya n’uju.

Igbo Mass Readings for April 27 2026, Mọnde Izuụka nke Anọ N’oge Ncheta Mbilite N’Ọnwụ Kristi

Igbo Mass Readings for April 26 2026, Ụka Nke Anọ N’oge Ncheta Mbilite N’Ọnwụ Kristi – Afọ nke Mbụ.