Igbo Mass Readings for February 1 2026, Ụka nke Anọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Mbụ.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for February 1 2026, Ụka nke Anọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Mbụ.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 2:3, 3:12-13
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ onye Amụma Zefania
Isi Okwu: Aga M ahapụ ndị umeala na ndị na-eme nwayọ n’etiti ụnụ.
Ndị umeala niile nọ n’ụwa, chọọnụ Onyenweanyị. Ndị niile na-edowe iwu Ya, chọọnụ Ya. Chọọnụ ezi omume. Chọọnụ obi umeala. E leghị anya, a ga-echekwaba ụnụ n’ụbọchị iwe nke Onyenweanyị.
Ma aga M ahapụ ndị e gbufọrọ egbufọ n’etiti ụnụ; nke ga-abụ ndị umeala na ndị a na-agụnyeghị na mmadụ. Olee ndị ga-agbara ọsọ ndụ gbaba n’aha Onyenweanyị?
Ọ bụ ndị ahụ e gbufọrọ n’ala Izrel. Ha ga-edebe aka ha ọcha. Ha agaghị atụ asị. A gaghị ahụ ire na-ekwu ụgha n’ọnụ ha. Ha ga-azụ atụrụ ha, mekwaa ka ha makpuru n’enweghị nsogbu ọ bụla.
ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 145:7-10. Az. Mt. 5:3
Azịza: Ngọzi dịrị ndị dara ogbenye n’ime mmụọ, n’ihi na alaeze eluigwe bụ nke ha. Ma ọ bụ Aleluya.
1. Onyenweanyị na-edebe nkwa O kwere ruo mgbe ebighị ebi.
Ọ na-ekpeziri ndị a na-emegbu emegbu ikpe,
bịakwa na-enye ndị agụụ na-agụ nri.
Onyenweanyị na-ahapụ ndị e ji eji ka ha nwere onwe ha.
Azịza: Ngọzi dịrị ndị dara ogbenye n’ime mmụọ, n’ihi na alaeze eluigwe bụ nke ha. Ma ọ bụ Aleluya.
2. Onyenweanyị na-eme ka ndị kpuru isi hụwa ụzọ.
Onyenweanyị na-ekulite ndị huru ehuru.
Onyenweanyị hụrụ ndị ezi omume n’anya.
Onyenweanyị na-echekwaba ndị ọbịa.
Azịza: Ngọzi dịrị ndị dara ogbenye n’ime mmụọ, n’ihi na alaeze eluigwe bụ nke ha. Ma ọ bụ Aleluya.
3. Onyenweanyị na-eguzowe nwamgbei na nwanyị isimkpe.
Ma ọ na-ahịgharị ụzọ onye na-arụ ala ka ọ gbagọrọ agbagọrọ.
Onyenweanyị ga-achịgide ruo mgbe ebighị ebi.
Zayọn, Chineke gị ga-achịgide ruo na ndụdụgandụ niile.
Azịza: Ngọzi dịrị ndị dara ogbenye n’ime mmụọ, n’ihi na alaeze eluigwe bụ nke ha. Ma ọ bụ Aleluya.
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 1:26-31
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Mbụ Pọl dị asọ degaara ndị Kọrịnt.
Isi Okwu: Ihe mmadụ kpọrọ ihe nzuzu ka Chineke họọrọ.
Ụmụnna m! Chetanụ ihe ụnụ bụ tupu Chineke akpọọ ụnụ: Ọ bụghị ọtụtụ n’ime ụnụ mụtara akwụkwọ, ma ọ bụ maara ihe dịka ụmụ ụwa si achụ ya taa. Ọ bụghị ọtụtụ n’ime ụnụ bụ oke dike.
Ọtụtụ n’ime ụnụ abụghị ụmụ ndị ukwu ma ọ bụ ndị a ma ama n’obodo. Kama Chineke họpụtara ihe ụmụ ụwa kpọrọ ihe nzuzu ka O wee mee ka ihere mee ndị na-eche na ha maara ihe.
Ọ bụkwa ihe ụmụ ụwa na-eche na ike adịghị na ya ka Chineke họpụtara ka O wee mee ka ihere mee ndị dike. Ọ bụkwa ihe ụmụ ụwa na-eleda anya, ihe ha kpọrọ ihe efu na ihe na-abaghị n’ihe, ka Chineke họpụtara, ka O wee mee ka ihe nke dị adị n’anya mmadụ ghara ịdị ire.
Ka mmadụ ọ bụla ghara ịnya isi n’ihu Chineke. Ma Chineke bụ isi-iyi nke ndụ anyị n’ime Kristi Jesu. O meela ka Kristi bụrụ isi-iyi nke amamihe anyị, nke ezi omume anyị na nke ido anyị nsọ, na Onye Mgbapụta anyị. Ya mere, dịka Akwụkwọ Nsọ si kwu: “Onye na-anya isi, ya jiri ihe Onyenweanyị mere nyaa isi.”
MBEKU – Ọrụ Ndị Ozi 16:14
Aleluya, aleluya!
Onyenweanyị, meghee obi anyị, ka anyị wee nụ okwu nke Nwa Gị.
Aleluya!
OZIỌMA – 5:1-12
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị Asọ nke Matiu dere
Isi Okwu: Ngọzi dịrị ndị dara ogbenye n’ime mmụọ.
Mgbe Jesu hụrụ igwe mmadụ ahụ. Ọ rịgooro n’elu ugwu. Mgbe Ọ nọdụrụ ala, ndị Ụmụazụ Ya wee bịakwute Ya. Jesu wee malite ikuziri ha ihe, sị:
“Ngọzi dịrị ndị bụ ogbenye n’ime mmụọ ha, n’ihi na alaeze eluigwe bụ nke ha!
Ngọzi dịrị ndị na-eru ụjụ, n’ihi na a aga-akasi ha obi!
Ngọzi dịrị ndị dị nwayọọ n’obi, n’ihi na ha ga-eketa ala ahụ.
Ngọzi dịrị ndị nwere agụụ na akpịrị ịkpọ nkụ maka ezi omume, n’ihi na ha ga-enwe afọ ojuju.
Ngọzi dịrị ndị na-emere mmadụ ibe ha ebere, n’ihi na a ga-emere ha ebere.
Ngọzi dịrị ndị dị ọcha n’obi, n’ihi na ha ga-ahụ Chineke.
Ngọzi dịrị ndị na-eme ka mmadụ na ibe ha dị n’udo, n’ihi na a ga-akpọ ha ụmụ Chineke.
Ngọzi dịrị ndị a na-emegbu emegbu n’ihi ịkwụba aka ọtọ, alaeze eluigwe bụ nke ha.
Ngọzi dịrị ụnụ mgbe ndị mmadụ ga-ata ụnụ ụta, na-emegbu ụnụ, na-ekwukwa okwu ọjọọ nile dị iche iche megide ụnụ, na-asịgidekwa ụnụ asị n’ihi M. Ñụrịanụ ọñụ! Ka obi tọọkwa ụnụ ụtọ, n’ihi na ụgwọ ọrụ ụnụ buru ibu n’eluigwe.
Igbo Mass Readings for February 2 2026, Nkubata Dinwenụ Jesu Krist N’Ụlọ Nsọ
Igbo Mass Readings for February 1 2026, Ụka nke Anọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Mbụ.