Igbo Mass Readings for January 30 2028, Ụka nke Anọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Atọ.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for January 30 2028, Ụka nke Anọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Atọ.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 1:4-5.17-19

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ onye Amụma Jeremaya

Isi Okwu: Ahọrọla M gị ka ị bụrụ onye amụma nke ndị mba niile.

N’oge Josaya, a gwara m okwu nke Osebụrụwa sị: “Tupu M kpụọ gị n’ime afọ, amarala M gị. Tupu a mụọ gị, edoola M gị nsọ. Ahọrọla M gị ka ị bụrụ onye amụma nke mba niile.

Ugbu a, jikeere ịrụ ọrụ. Kulie, ka ị gwa ha ihe niile M tiri gị n’iwu. Egwu atụla gị mgbe ị kwụ n’ihu ha; ka M ghara ikwe ka ihere mee gị n’ihu ha. Taa, Mụ onwe M ga-eme gị ka ị bụrụ obodo kwụsiri ike, ide e ji okporo igwe wuo, aja ụlọ e ji ọla ọkụ hiwe, ka i were luso ala niile ndị a ọgụ; ma ndị eze nke Juda na ndị ọchịchị ya niile; ndị nchụaja ya na ndị obodo ahụ niile.

Ha ga-alụso gị ọgụ mana ha agaghị emeri gị, n’ihi na anọnyere M gị ka M wee zọpụta gị”: ọ bụ Dinwenụ na-ekwu nke a.

ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 70:1-6. 15-17. Az. 15

Azịza: Ọnụ m ga-ekwupụta enyemaka Gị.

1. Onyenweanyị, Gị ka m na-agbakwute.

E kwekwala ka ihere mee m.

Were ikpe nkwụmọtọ Gị gbapụta m, wee tọhapụ m.

Gee m ntị, bịa zọpụta m.

Azịza: Ọnụ m ga-ekwupụta enyemaka Gị.

2. Bụrụ nkume ebe m na-agbaba.

Ide nke nzọpụta m!

N’ihi na Gị bụ nkume m, Ide m.

Zọpụta m n’aka ndị ajọ omume.

Azịza: Ọnụ m ga-ekwupụta enyemaka Gị.

3. Onyenwe m, Gị bụ nchekwube m,

onye ntụkwasị obi m kemgbe m ji bụrụ nwata.

Kemgbe e jiri mụta m ka m ji dabere na Gị;

Gị bụ onye enyemaka m site n’afọ nne m.

Azịza: Ọnụ m ga-ekwupụta enyemaka Gị.

4. Ọnụ m ga-ekwupụta ikpe nkwụmọtọ Gị,

kọwapụtakwa enyemaka Gị kwa ụbọchị.

Onyenwe m, kemgbe m ji bụrụ okorobịa ka I ji kuziwere m;

aga m na-ekwupụtakwa ọrụ ịtụnanya Gị.

Azịza: Ọnụ m ga-ekwupụta enyemaka Gị.

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 12:31-13:13 ma ọ bụ 13:4-13

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Mbụ Pọl dị asọ degaara ndị Kọrịnt

Isi Okwu: Ụzọ ihe atọ na-anọgide: Okwukwe, nchekwube, na ịhụnanya; nke kachasị n’ime ha bụ ịhụnanya.

Werenụ obi na-anụ ọkụ chọọ onyinye-amara ndị kachasị ibe ha. “Ma ugbu a aga m egosikwa ụnụ ụzọ nke kachasị mma: A sị na eji m asụsụ dị iche iche nke mmadụ na nke ndị Mmụọozi na-ekwu okwu, ma enweghị m ịhụnanya, mụ na okwu m aghọọla ogele ukwu wara awa, nke na ụda ya na-adịghịkwa mma na ntị; ma ọ bụ ọja-ọla nke na-ada ụda n’efu.

A sịkwa na enwere m onyinye ibu-amụma, matakwa ihe omimi niile na ihe ọmụma niile; a sịkwa na enwere m ụdị okwukwe ahụ pụrụ ibupụ ugwu, ma enweghị m ịhụnanya, abụghị m ihe ọ bụla.

A sị m were ihe niile m nwere zụọ ndị ogbenye, a sịkwa na ewere m ahụ m nye ka a kpọọ m ọkụ ka e wee too m, ma enweghị m ịhụnanya, ọ baraghị m uru ọ bụla.” Ịhụnanya nwere ogologo ntachi obi.

O nwekwara obi ọma. Ịhụnanya adịghị ekwo ekworo. Ịhụnanya adịghị anya isi; ọ dịghị afụli onwe ya elu. Ịhụnanya adịghị eme ihe na-adịghị mma n’anya, ọ dịghị achọ nke naanị ya.

Oke iwe adịghị ewe ya, ọ dịghịkwa agụkọ ihe ọjọọ e mere ya. Ịhụnanya adịghị añụrị ọñụ n’ihe ọjọọ; kama ọ na-eso ezi okwu añụrịkọ ọñụ. Ịhụnanya na-anagide ihe niile; na-ekwe ihe niile, na-ele anyà ihe niile: na-enwe ntachi obi n’ihe niile.

Ịhụnanya anaghị ada ada. E nwee onyinye ibu amụma, oge na-abịa mgbe ọ ga-akwụsị ịdị ire. Ike ịsụ asụsụ dị iche iche agaghị adịgidekwa wee ruo mgbe ebighị ebi.

E nwekwara mgbe ike ọmụma ga-akwụsị ịdị ire. N’ihi na amamihe anyị ezughị oke. Ibu amụma anyị ezughịkwa oke. Ma mgbe ọ bụla ihe zuru oke ga-apụta ihe, ihe na-ezughị oke ga-ezo onwe ya.

Mgbe m bụ nwata, ana m ekwu okwu ka nwata; ana m atụkwasị uche n’ihe dịka nwata; ana m atụgharịkwa uche dịka nwata. Ma ugbu a, m ghọrọla okenye, ahapụla m omume nwatakịrị.

Ugbu a, anyị na-ahụ ihe niile inyoghị inyoghị dịka n’enyo. Ma na mgbe ahụ, anyị ga-ahụ ihe niile ihu na ihu. Aga m amazu ihe niile, dịka Chineke mazuru ihe banyere m. Ma ugbu a, ihe atọ ndị a na-anọgide: okwukwe, nchekwube na ịhụnanya, ma nke kachasị ibe ya bụ ịhụnanya.

MBEKU – Jọn.14:5

Aleluya, aleluya!

Onyenweanyị kwuru sị: Abụ M Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ; o nweghị onye nwere ike ịbịakwute Nna bere sọ ma o sitere na M.

Aleluya!

OZIỌMA – 4:21-30

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere

Isi Okwu: Dịka Elaịja na Elisha, e zigaghị Jesu naanị n’etiti ndị Juu.

Jesu wee malite ịgwa ha okwu, sị: “Taa, ka e mezuru na ntị ụnụ ihe e dere n’akụkụ ebe a M gụrụ n’Akwụkwọ Nsọ.” Ọtụtụ okwu amara si n’ọnụ Ya pụta wee ju ha niile anya.

N’ihi nke a ha wee jụọ sị: “Onye a, Ọ bụghị nwa Josef.” Ụfọdụ ndị nọ n’ụlọ nzukọ ahụ wee malite ịgba akaebe ọma banyere Jesu. Jesu wee sị ha: “Ama M na ụnụ ga-atụrụ m ilu a: Dibịa gwọọkwanụ onwe gị.”

Ụnụ ga-asịkwa M: “Meekwanụ ka anyị hụ, n’obodo a mụrụ Gị, ụdị ihe ahụ anyị nụrụ na I mere na Kapanọm.” N’ịgwa ụnụ eziokwu: A dịghị anabata onye amụma ọ bụla nke ọma n’obodo a mụrụ ya.

Gee ntị ka M gwa ụnụ! Ọ bụ ezie na ọtụtụ ụmụ nwanyị di ha nwụrụ juru n’ala Izrel, n’oge Elaịja, mgbe e mechiri eluigwe; mmiri ezoghị afọ atọ na ọnwa isii, mgbe oke ụnwụ dara n’ala ahụ niile.

Ma ọ dịghị onye ọ bụla n’ime ha Chineke zigara Elaịja jekwuru, ma ọ bụghị naanị otu nwanyị di ya nwụrụ nke bi n’obodo Zarefat, nke dị n’ala Saidọn. Ọtụtụ ndị ekpenta nọkwa n’ala Izrel n’oge Elaịsha onye amụma; ma ọ dịghị onye ọ bụla n’ime ha e mere ka ọ dị ọcha ma ọ bụghị Naaman, onye Siria.”

Mgbe ndị niile nọ n’ụlọ nzukọ ahụ nụrụ okwu ndị a ọnụma jupụtara ha n’obi. Ha wee bilie, nupu Jesu n’azụ obodo, kpụrụ Ya ruo elu otu ugwu nta, e wuru Nazaret n’elu ya, ka ha wee bulie Ya, kụọ Ya n’ala. Ma Ọ mịchapụrụ onwe Ya n’aka ha, zọrọ ije, gafee n’etiti igwe mmadụ ahụ, wee laa.

Igbo Mass Readings for January 31 2028, Mọnde Izuụka nke Anọ N’Oge Na-Adanyeghị N’Emume

Igbo Mass Readings for January 30 2028, Ụka nke Anọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Atọ.