Igbo Mass Readings for December 22 2024, Ụka nke Anọ N’oge Olileanya Onye Nzọpụta – Afọ Nke Atọ

Nke a bụ Igbo Mass Readings for December 22 2024, Ụka nke Anọ N’oge Olileanya Onye Nzọpụta – Afọ Nke Atọ.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 5:1-4

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ onye amụma Maịka

Isi Okwu: Na gị ka a ga-esi mụta onye ahụ ga-achị Izrel.

Lee ihe Onyenweanyị kwuru: “Gị bụ Betlehem Efrata, ị dị ntakịrị karịchaa ọnụmara niile nke Juda, na gị ka e si amụtara M onye ga-achị achị n’Izrel; mbido ndụ Ya sitererịị n’ọkpụ-tọrọ-ọkpụ.

Ya bụ, Onyenweanyị ga-agbaketa ha azụ ruo mgbe nwanyị ahụ dị ime mụrụ nwa ya. Mgbe ahụ ka ụmụnne ya fọdụrụnụ ga-alọghachi azụ bịakwute ụmụ Izrel.

Ọ ga-eji ike nke Onyenweanyị, jirikwa ebube eze nke aha Chineke ya, guzoro na-azụ igwe atụrụ ya. Ha ga-ebiri n’enweghị nsogbu ọ bụla, n’ihi na site oge ahụ gawa, Ọ ga-eme ka ike ọchịchị Ya rute akụkụ ụwa niile. Ọ bụ ya ga-abụ udo.

ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 79:2-3, 15-16, 18-19. Az. 4

Azịza: Chineke nke igwe ndị agha, kpọchighaa anyị azụ; mee ka ihu Gị chakwasị anyị, ka anyị wee nwee nzọpụta.

1. Biko, Onye nche nke Izrel, tọọ ntị n’ala nụrụ olu anyị.

Si n’oche eze ebe I ji ndị Mmụọọma gbakwasị ụkwụ, chawapụta.

Kpalite ike Gị, bịa zọpụta anyị. Azịza.

2. Chineke nke igwe ndị agha, anyị na-arịọ Gị,

chee anyị ihu ọzọkwa. Si n’eluigwe ledata anya n’ala ka Ị hụ.

Bịa leta osisi vaịn nke a.

Chekwawa ihe I ji aka nri kụnye n’ala. Azịza.

3. Ka enyemaka Gị nọnyere onye Ị họtara ahọta,

Onye I jiri aka Gị nye mgbasike.

Mgbe ahụ anyị agaghịkwa ahapụ Gị ọzọ.

Nye anyị ndụ ọhụrụ, ka anyị wee na-akpọku aha Gị. Azịza.

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 10:5-10

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọozi e degaara ndị Hibru

Isi Okwu: Lee, anọ m ebe a! Abịara m ime uche Gị.

N’ihi nke a, mgbe Kristi na-abịa n’ụwa, Ọ sịrị Chineke: “Ọ bụghị aja na anụmanụ e chere n’ihu Gị ka Ị chọrọ. Kama, otu ahụ ka Ị kwadebeere m. Aja nsureọkụ na aja e ji ebupụ mmehie adịghịkwa atọ Gị ụtọ.

Mgbe ahụ ka M ji sị: ‘Chineke, lee, abịala M ime uche Gị, dịka e dere banyere M n’Akwụkwọ Nsọ.’ Ihe mbụ O kwuru bụ nke a: “Ọ bụghị aja na anụmanụ e chere n’ihu Gị, ka Ị chọrọ.

Aja nsureọkụ na aja e ji ebupụ mmehie adịghịkwa atọ Gị ụtọ.” O kwuru otu a, ọ bụ ezie na a chụrụ aja ndị a dịka iwu si dị. O kwukwara sị: “Chineke, lee, abịala M ime uche Gị.”

Nke a na-egosị na Chineke ewepụla aja ochie mbụ niile, were nke abụọ, bụ aja nke Kristi, dochie ọnọdụ ha. N’ihi na Jesu Kristi mezuru ihe Chineke chọrọ ka O mee. O mere ka anyị si na mmehie dị ọcha. O mere nke a site n’iche ahụ Ya n’ihu Chineke dịka aja, naanị otu mgbe.

MBEKU – Luk 1:38

Aleluya, aleluya!

Abụ m odibo nwanyị nke Osebụrụwa, Ya reere m ka i siri kwuo.

Aleluya!

OZIỌMA – 1:39 -44

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere

Isi Okwu: “Onyedị ka m bụ, nne nke Onyenwe m ji bịa ileta m”?

N’oge na-eteghị aka, Marịa biliri ije, gaa elu ala ọsọọsọ, ruo otu obodo nta dị n’ala ugwu nke Judia. O wee banye n’ụlọ Zekarịa, kelee Elizabet. Mgbe Elizabet nụrụ olu ekele Marịa, nwa o bu n’afọ wụliri elu.

Elizabet wee jupụta na Mmụọ Nsọ. O wee welie olu ya tie mkpu ọñụ, sị: “Ị bụ onye a kachara nye ngọzi n’etiti ụmụ nwanyị niile! Nwa ahụ ị ga-amụ bụkwa onye a gọziri agọzi! Olee ebe ka nke a si ru m na nne nke Onyenwe m bịara ileta m? N’ihi na lee, mgbe olu ekele gị dara m na ntị, nwa nọ m n’afọ wụliri elu n’ihi ọñụ.

Igbo Mass readings for December 23 2024, Mọnde

Igbo Mass Readings for December 22 2024, Ụka nke Anọ N’oge Olileanya Onye Nzọpụta – Afọ Nke Atọ.