Igbo Mass Readings for March 7 2027, Ụka nke Anọ N’oge Ncheta Ahụhụ Kristi – Afọ Nke Abụọ
Nke a bụ Igbo Mass Readings for March 7 2027, Ụka nke Anọ N’oge Ncheta Ahụhụ Kristi – Afọ Nke Abụọ.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 36:14-16; 19-23
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ nke Abụọ nke Ihe- E-Mere
Isi Okwu: E gosịpụtara iwe na ebere Chineke n’oge ha nọ n’ala a chụpụrụ ha, na n’oge atọhapụrụ ha.
Ndị isi nchụaja niile na ndị mmadụ mere njọ kwuru njọ mekwasị n’elu mmehie ha niile, bịakwa na-eme arụ niile nke ụmụ mba ndị ọzọ, na-emerụkwa Ụlọ Nsọ nke Onyenweanyị doro asọ na Jerusalem.
Onyenweanyị Chineke nke nna nna anyị ha buru ụzọ si n’ọnụ ndị ozi Ya dị iche iche, na-ezigara ha ozi, n’akwụsịghị akwụsị, n’ihi na, na Ọ chọrọ ịzọpụta ndị nke Ya na Ụlọ Nsọ Ya.
Ma ha jiri ndị ozi Chineke mere ihe ọchị, nupụkwa isi n’aka Ọ dọrọ ha na ntị. Ha jiri ndị amụma Ya mee ihe ọchị, wee ruo mgbe iwe nke Onyenweanyị lara elu karịa n’ebe ndị nke Ya nọ, nke na o kwekwaghị ogbugbo.
Ọ bịa were eze ndị Kaldia, buso ha agha, onye gbusiri ụmụ okorobịa ha n’ebe kacha nsọ nke Ụlọ Nsọ; nke na o nweghị onye ọnwụ hapụrụ, ma ụmụ okorobịa ma ụmụ agbọghọbịa, ma okenye ma onye na-ala ezumike nka.
O weere ha niile nyefee eze ndị Kaldia n’aka. Ndị iro ha bịara were ọkụ suree Ụlọ Nsọ Chineke, kwatuchaa mgbidi Jerusalem, surekwaa ụlọ eze ọkụ, bịakwa laa ihe niile bara uru na Jerusalem n’iyii.
Nebukadneza buuru ndị mma agha gbufọrọ laa Babịlọn. Ebe ahụ ka ya na ụmụ ya jiri ha mere ohu wee ruo mgbe alaeze ndị Peshia weere ike ọchịchị.
Ihe niile ndị a bụ ihe e mere iji mezuo okwu Onyenweanyị si n’ọnụ Jeremaya kwuo sị: “Wee ruo mgbe ala a weghachiri ụbọchị ezumike niile fulahara ya, n’oge niile ahụ ọ tọgbọrọ n’efu, ọ ga-edogide ụbọchị ezumike asọ ruo iri afọ asaa.”
N’afọ mbụ nke Saịrọs, eze Peshia, iji mezuo okwu ahụ Onyenweanyị siri n’ọnụ Jeremaya kwuo, Onyenweanyị kpalitere mmụọ nke Saịrọs, eze Peshia ka o tie iwu, depụtakwa ya ebe mmadụ niile ga-ahụ ya n’alaeze ya gburugburu.
Nke a bụ ihe Saịrọs, eze Peshia kwuru: “Onyenweanyị, Chineke nke eluigwe enyela m alaeze niile nọ n’ụwa. O nyela m iwu ka m wuoro ya Ụlọ Nsọ na Jerusalem nke dị na Juda. N’ihi ya, onye ọ bụla n’ime ụnụ so na ndị nke Ya, ka Chineke ya nọnyere ya. Ya gbagoo ebe ahụ.”
ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 136:1-6 Az. 6
Azịza: Ọ bụrụ na m echefuo Gị, ka ire m rapara n’okpo ọnụ m.
1. N’agịga mmiri Babịlọn ka anyị nọdụrụ ala,
na-akwa akwa mgbe anyị chetara Zayọn.
N’alaka osisi toro n’ala ahụ,
ka anyị kokwasara ụbọ akwara anyị.
Azịza: Ọ bụrụ na m echefuo Gị, ka ire m rapara n’okpo ọnụ m.
2. N’ebe ahụ ka ndị dọtara anyị n’agha gwara anyị,
ka anyị bụọrọ ha abụ.
Ndị na-emegbu anyị gwara anyị ñụrịba ọñụ,
bịakwa sị: Bụọrọnụ anyị abụ Zayọn.
Azịza: Ọ bụrụ na m echefuo Gị, ka ire m rapara n’okpo ọnụ m.
3. Ma olee otu anyị ga-esi bụọ abụ Onyenweanyị n’ala mba ọzọ?
Jerusalem, ọ bụrụ na m echefuo gị,
ka aka nri m kpọnwụọ.
Azịza: Ọ bụrụ na m echefuo Gị, ka ire m rapara n’okpo ọnụ m.
4. Ọ bụrụ na m ghara icheta gị,
ka ire m rapara n’okpo n’ọnụ:
ma ọ bụrụ na m ejighị Jerusalem mere isi añụrị m.
Azịza: Ọ bụrụ na m echefuo Gị, ka ire m rapara n’okpo ọnụ m.
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 2:4-10
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọozi Pọl dị asọ degaara ndị Efesọs
Isi Okwu: Ụnụ bụ ndị nwụrụ anwụ site na njọ abụrụla ndị a zọpụtara site n’amara.
Chineke bara ụba n’amara. N’ihi na ịhụnanya Ya n’ebe anyị nọ ebuka, ọ bụrụgodụ mgbe ahụ anyị nwụrụ anwụ site na njọ anyị, Chineke kpọbatara anyị na ndụ n’ime Kristi. Chineke ji amara zọpụta ụnụ!
N’ime Kristi Jesu, Chineke mere ka anyị na Kristi soro bilite n’ọnwụ, bịakwa nye anyị na Ya ọnọdụ n’eluigwe. Nke a bụ iji gosị ndụdụgandụ niile na-abịanụ, site n’imere anyị ihe ọma dị egwu n’ime Kristi Jesu, na amara Ya anaghị agwụ agwụ.
Ebe ọ bụ na e jiri amara zọpụta ụnụ, site n’okwukwe; na ọ bụghị, site n’ike aka ụnụ, kama site n’onyinye amara Chineke; na ọ bụghị site n’ihe ọ bụla ụnụ metara, ka mmadụ ọ bụla ghara ịnya isi.
Anyị bụ ọrụ-aka nke Chineke kere n’ime Kristi Jesu ka anyị wee na-ebi ụdị ezigbo ndụ ahụ Chineke kwadoro n’isi mbido na mmadụ ga-ebi.
MBEKU – Jọn. 3:16
R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.
Chineke hụrụ ụwa n’anya nke ukwuu, nke na O weere otu Nwa Ya nye: onye ọ bụla kwere na Ya enweela ndụ ebighị ebi.
R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.
OZIỌMA – 3:14-21
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere
Isi Okwu: Chineke zitere Nwa Ya ka ụwa site na Ya nweta nzọpụta.
Jesu gwara Nịkọdemos: “Dịka Mosis si welie agwọ elu n’ime ọzara, otu ahụ ka a ga-esi welie Nwa nke Mmadụ elu, ka onye ọ bụla kwere na Ya nwee ndụ ebighị ebi.
Chineke hụrụ ụwa n’anya nke ukwuu nke na O nyere sọ Otu Nwa ya, ka onye ọ bụla kwere na Ya ghara ịla n’iyi, kama ka o nweta ndụ ebighị ebi. N’ihi na Chineke eziteghị Nwa Ya n’ụwa ka Ọ ma ụwa ikpe, kama ka Ọ zọpụta ụwa.
A gaghị ama onye kwere na Ya ikpe, ma amalarị onye na-ekweghị na Ya ikpe, n’ihi na o kweghị na Nwa ahụ Chineke mụrụ naanị Ya. Nke a bụ ikpe-ọmụma ahụ: na onye ahụ bụ ihe abịala n’ụwa, ma ndị mmadụ hụrụ ọchịchịrị n’anya karịa ihe, n’ihi na omume ha jọrọ njọ.
Onye ọ bụla omume ya jọrọ njọ na-akpọ ihe asị. Ọ dịghị abịakwute ihe, ka a ghara ime ka ajọ omume ya pụta ihe. Ma onye na-eme ezi omume na-abịakwute ihe ahụ, ka ezi omume ya wee pụta ihe, n’ihi na o mere ya n’irubere Chineke isi.
Igbo Mass Readings for March 8 2027, Mọnde Izuụka nke Anọ n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi
Igbo Mass Readings for March 7 2027, Ụka nke Anọ N’oge Ncheta Ahụhụ Kristi – Afọ Nke Abụọ.