Igbo Mass Readings for May 9 2027, Ụka Nke Asaa N’oge Ncheta Mbilite N’Ọnwụ Kristi – Afọ nke Abụọ.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for May 9 2027, Ụka Nke Asaa N’oge Ncheta Mbilite N’Ọnwụ Kristi – Afọ nke Abụọ.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 1:15-17.20-26

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Ọrụ Ndị Ozi

Isi Okwu: K’anyị họrọ otu onye n’ime ha ka ọ bụrụ onye akaebe nke mbilite n’ọnwụ.

Mgbe ụbọchị olemole gasịrị, ndị otu Kristi, ihe dị ka narị mmadụ na iri abụọ, wee nwee nzukọ. Pita wee guzo n’etiti ha sị: “Ụmụnna m n’ime Kristi! Ihe edere n’Akwụkwọ Nsọ aghaghị imezu, nke Mmụọ Nsọ siri n’ọnụ Devid kwuo n’oge gara aga, maka Judas nwa Iskariọt, onye mesịrị bụrụ onye-ndu nke ndị jidere Jesu.

Ụnụ maara nke ọma na ọ bụụrụ onye otu anyị na mbụ; na o nweburu oke n’ije ozi anyị.” N’ihi na e dere ya n’Akwụkwọ Abụọma, sị: “Ka ụlọ ya tọgbọrọ n’efu; Ka mmadụ ọ bụla ghara ibi na ya”.

E dekwara sị: “Ka onye ọzọ nọchie n’ọnọdụ o jiri bụrụ onye nlekọta”! N’ihi ya, otu onye aghaghị iso anyị, n’ọnọdụ onye ozi, bụrụ onye akaebe nke mbilite n’ọnwụ Kristi.

Ọ ghaghị ịbụ otu onye n’ime ndị nwoke anyị na ha so, oge niile anyị na Onyenweanyị Jesu so na-apụ, na-abata, site n’oge Jọn kwusara mmirichukwu nke ya, tutuu ruo n’ụbọchị ahụ Jesu, laghachiri n’eluigwe.”

Ha wee guzo mmadụ abụọ: Josef, onye a na-akpọ Basabas, (onye a na-akpọkwa Jọstus), na Matịas. Ha wee kpee ekpere, sị: “Onyenweanyị, Gị, onye maara echiche obi mmadụ niile, gosi anyị onye Ị họpụtara n’ime mmadụ abụọ ndị a, ịnọchi n’ọnọdụ ije-ozi nke a, na ịbụ onye ozi, nke Judas Iskarịọt si n’ime ya dapụ, wee gaa ebe ọnọdụ kwesịrị ya.”

Ha wee feere mmadụ abụọ ndị a nza. Nza ahụ wee ma Matịas. O wee banye n’otu Ụmụazu iri na otu ahụ imezu ọnụ ọgụgụ ha.

ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 102:1-2, 11-12, 19-20 Az. 19

Azịza: Onyenweanyị emeela ka oche eze Ya guzosie ike n’eluigwe. Ma ọ bụ Aleluya

1. Mkpụrụ obi m, too Onyenweanyị.

Ka ihe niile nọ n’ime m too aha nsọ Ya.

Mkpụrụ obi m, too Onyenweanyị.

E chefukwala amara niile O meere gị.

Azịza: Onyenweanyị emeela ka oche eze Ya guzosie ike n’eluigwe. Ma ọ bụ Aleluya

2. N’ihi na otu eluigwe si dị oke elu karịa ala;

otu ahụ kwa ka obi ọma Ya si buo oke ibu maka ndị na-atụrụ Ya egwu.

Dịka ọwụwa anyanwụ si tee aka n’ọdịda anyanwụ;

otu ahụ kwa ka O si eweti njọ anyị aka n’ebe anyị nọ.

Azịza: Onyenweanyị emeela ka oche eze Ya guzosie ike n’eluigwe. Ma ọ bụ Aleluya

3. Onyenweanyị emeela ka oche eze Ya guzosie ike n’eluigwe.

Alaeze Ya gazuru ebe niile.

Ndị Mmụọma Ya niile, toonụ Ya.

Ụnụ bụ ndị na-eme uche Ya, ike ụnụ dị egwu.

Azịza: Onyenweanyị emeela ka oche eze Ya guzosie ike n’eluigwe. Ma ọ bụ Aleluya

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 4:11-16

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Mbụ Jọn dị asọ dere

Isi Okwu: Onye ọ bụla bi n’ịhụnanya, bi n’ime Chineke, Chineke ebiri kwa n’ime ya.

Ndị m hụrụ n’anya! Ọ bụrụ na Chineke hụrụ anyị n’anya otu a, anyị jikwa ụgwọ ịhụrịta ibe anyị n’anya. O nwebeghị onye ọ bụla n’ime anyị ji anya ya hụ Chineke anya.

Ma ọ bụrụ na anyị ahụrịta onwe anyị n’anya, Chineke na-ebi n’ime anyị. Ọ na-emekwa ka ịhụnanya Ya zuo oke n’ime anyị. Otu a ka anyị si amata na anyị na-ebi n’ime Chineke; na Ya onwe Ya na-ebikwa na anyị: ọ bụ n’ihi na O nyela anyị Mmụọ Nsọ Ya.

Anyị onwe anyị ejirila anya anyị hụ na-agbakwa akaebe na Chineke ezitela Nwa Ya ka Ọ bụrụ Onye Nzọpụta nke ụwa. Onye ọ bụla kwupụtere na Jesu bụ Nwa Chineke, Chineke bi n’ime ya, onye ahụ ebirikwa n’ime Chineke.

Anyị onwe anyị amarala, kwerekwa n’ịhụnanya ahụ Chineke nwere n’ebe anyị nọ. Chineke bụ ịhụnanya. Onye ọ bụla bi n’ịhụnanya, bi n’ime Chineke. Chineke ebirikwa n’ime ya.

MBEKU – Jọn 14:18

Aleluya, aleluya!

Onyenweanyị kwuru sị: “Agaghị M ahapụ ụnụ dịka nwa enwe nne, na nna. Aga M abịakwute ụnụ. Mgbe ahụ, obi ụnụ ga-añụrị ọñụ.”

Aleluya!

OZIỌMA – 17:11-19

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere

Isi Okwu: Ka ha bụrụ otu dịka anyị onwe anyị.

Jesu welitere anya Ya n’eluigwe, kpee ekpere wee sị: A na-enyekwa M otito site na ha. Ugbu a ana M alaghachikwute Gị. Anọghịkwa M n’ụwa ọzọ. Ma ha onwe ha ka nọ n’ụwa.

Nna dị nsọ! Debe ha nke ọma site n’ike nke aha Gị, bụ ndị ahụ I nyere M; ka ha wee bụrụ otu dịka Anyị onwe Anyị si bụrụ otu. Mgbe Mụ na ha nọ, edebere m ndị ahụ I nyere M nke ọma site n’ike nke aha Gị.

Echekwara m ha; ọ dịghịkwa onye ọ bụla n’ime ha lara n’iyii, ma ọ bụghị nwa nke ịla n’iyii ahụ. Ma nke a mere ka e wee mezuo ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ.

Ma ugbu a, ana M alaghachikwute Gị. Ana M ekwu ihe ndị a otu a M ka nọ n’ụwa, ka ha wee nwee ọñụ M n’uju ya niile, n’ime obi ha. Agwara M ha okwu Gị; ụwa wee kpọ ha asị, n’ihi na ha abụghị nke ụwa dịka Mụ onwe M na-abụghị mmadụ nke ụwa.

Ekpere M abụghị ka I wepụ ha n’ụwa, kama ka I chebe ha, ka ha pụọ n’aka ajọ onye ahụ. Ha abụghị ndị nke ụwa, dịka Mụ onwe M na-abụghị mmadụ nke ụwa.

Were eziokwu doo ha nsọ. N’ihi na okwu Gị bụ eziokwu. Ezigara M ha n’ụwa dịka I si ziga M n’ụwa. N’ihi ha ka m ji edoro Gị onwe M nsọ, ka e wee dooro Gị ha nsọ n’eziokwu.

Igbo Mass Readings for May 10 2027, Mọnde Izuụka nke Asaa N’oge Ncheta Mbilite N’Ọnwụ Kristi

Igbo Mass Readings for May 9 2027, Ụka Nke Asaa N’oge Ncheta Mbilite N’Ọnwụ Kristi – Afọ nke Abụọ.