Igbo Mass Readings for February 23 2025, Ụka nke Asaa n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Atọ.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for February 23 2025, Ụka nke Asaa n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Atọ.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 26:2.7-9, 12-13, 22-23
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ mbụ nke Samuel
Isi Okwu: Chineke ewerela gị nye n’aka m, mana agaghị m egbu gị.
Sọl kpọọrọ puku mmadụ atọ, bụ ụmụ okorobịa a họrọ ahọ n’ala Izrel garuo n’ịkpa nke Zif. Ọ bụ Devid ka ha na-achọ n’ọzara nke Zif. Devid na Abishai jiri abalị gagharịa n’etiti ndị agha Sọl, wee hụ Sọl ka o dina na-ehi ụra, ebe a gbara ogige gburugburu.
A rụnyere ube Sọl n’ala n’akụkụ isi ya. Abna na ndị agha dinara Sọl gburugburu. Abishaị gbaara ya Devid n’izu sị: “Taa Osebụrụwa ewerela onye iro gị nyefee n’aka gị.
Ya bụ, ka m were ube nke ya kpọgide ya n’ala. Naanị otu mma ube! Agaghị m ama ya ugboro abụọ!” Devid azaa Abishaị sị: “E merụkwala ya ahụ. Kedụ onye ga-ewelite aka ya megide onye Chineke tere ude, a ghara inye ya ọpịpịa maka ya?
Devid ewere ube ahụ, burukwa ite mmiri dị n’akụkụ isi Sọl, ha were rie ọsọ. O nweghị onye hụrụ ha, nke ọ na-enwe onye mara ihe merenụ; Ọ dịghịkwanụ onye tetara n’ụra, n’ihi na ha niile nọ n’oke ụra nke siri n’aka Osebụrụwa dakwasị ha.
Devid wee gafere na mpaghara nke ọzọ, were guzoro n’elu ugwu n’ebe dị anya. Nnukwu mbara ala kewara ha. Devid ewee kpọọ sị: “Nke a bụ ube eze. Otu onye n’ime ndị agha ụnụ gafeta bịa were ya.
Dinwenụ na-akwụghachi onye ọ bụla ụgwọ otu ezi omume na ihube isi ya si dị. Taa ka Dinwenụ weere gị nye n’aka m, mana agaghị m ewelite aka megide gị bụ onye Chineke tere ude.”
ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 102:1-4.8.10.12-13 Az. 8
Azịza: Onyenweanyị bụ ebere na ịhụnanya.
1. Ihe niile dị n’ime m, gọzie aha nsọ Ya.
Mkpụrụobi m, too Onyenweanyị.
E chefukwala amara niile O meere gị.
Azịza: Onyenweanyị bụ ebere na ịhụnanya.
2. Ọ bụ Ya na-agbaghara njọ gị niile.
Ọ bụkwa Ya na-agwọ ọrịa gị niile.
Ọ na-agbapụta ndụ gị ka ị ghara ịla n’iyii.
O ji ịhụnanya na ebere kpube gị okpu eze.
Azịza: Onyenweanyị bụ ebere na ịhụnanya.
3. Onyenweanyị bụ onye ebere na onye amara.
Ọ naghị ewe iwe ọkụ. Obiọma Ya ebuka.
Ọ naghị emesị anyị omume dịka njọ anyị si dị.
Ọ naghị esocha ka njọ anyị si buo ibu akwụ anyị ụgwọ.
Azịza: Onyenweanyị bụ ebere na ịhụnanya.
4. Dịka ọwụwa anyanwụ si tee aka n’ọdịda ya;
otu ahụ ka O si eweti mmehie anyị aka n’ebe anyị nọ.
Dịka nna si nwee obi ebere n’ebe ụmụ ya nọ,
otu ahụ kwa ka Onyenweanyị si emere ndị na-atụrụ Ya egwu ebere.
Azịza: Onyenweanyị bụ ebere na ịhụnanya.
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 15:45-49
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Mbụ Pọl dị asọ degaara ndị Kọrịnt
Isi Okwu: Anyị bụ ndị a kpụrụ n’ụdị mmadụ nke ụwa, ga-abụ ndị a ga-akpụkwa n’ụdị mmadụ nke eluigwe.
E dere ya n’Akwụkwọ Nsọ, na nwoke mbụ ahụ bụ Adam, bụ mmadụ dị ndụ. Ma Adam nke ikpeazụ aghọọla Mmụọ na-enye ndụ. Ị hụkwara na mmụọ abụghị nke butere ụzọ.
Nke butere ụzọ bụ mmadụ. Nke bụ mmụọ ewee na-esota. Nwoke mbụ bụ onye nke ụwa, e siri n’aja kpụọ. Nwoke nke abụọ bụ onye nke igwe. Ndị a kpụrụ n’ụwa dị ka onye nke ụwa.
Ndị a kpụrụ n’igwe dị ka onye nke igwe. Otu ahụ anyị si yi onye nke ụwa, ka anyị sikwara nwee oyiyi onye nke eluigwe.
MBEKU – Ọrụ Ndị Ozi 16:14
Aleluya, aleluya!
Onyenweanyị, meghee obi anyị, ka anyị nara okwu nke Nwa Gị.
Aleluya!
OZIỌMA – 6:27-38
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Isi Okwu: Bụrụnụ ndị obi ebere, otu Nna ụnụ si bụrụ onye obi ebere.
Jesu gwara Ụmụazụ Ya, sị: “Ma, ana M agwa ụnụ bụ ndị na-anụ okwu M: Na-ahụnụ ndị iro ụnụ n’anya. Na-emerenụ ndị kpọrọ ụnụ asị amara. Na-agọzinụ ndị na-abụ ụnụ ọnụ.
Na-ekperenụ ndị na-emegbu ụnụ ekpere. Ọ bụrụ na onye ọ bụla amaa gị ụra n’otu ntị, tụgharịara ya ntị nke ọzọ. Ọ bụrụ na onye ọ bụla azọrọ gị oke uwe gị n’ike, hapụ ka owerekọọ uwe ime gị.
Onye ọ bụla rịọrọ gị ihe nye ya. Ọ bụrụ na onye ọ bụla ewere ihe gị n’aka ike, a gala ịnapụta ya. Ụdị ihe ahụ ụnụ chọrọ ka a na-emere ụnụ, na-emerenụ ya ndị ọzọ. “Ọ bụrụ na ndị ụnụ na-ahụ n’anya bụ naanị ndị hụrụ ụnụ n’anya, olee oke ihe ụnụ mere?
Ọ bụrụgodụ ndị na-eme arụ, ọ bụ na ha anaghị ahụ ndị hụrụ ha n’anya n’anya? Ọ bụrụ na sọ ndị na-emere ụnụ ihe ọma ka ụnụ na-emere ihe ọma, kedụ ebe ụnụ gbadoro aka ana ụgwọ ezi omume?
Ọ bụrụgodụ ndị na-eme arụ, ọ bụ na ha anaghị eme otu ahụ? Ọ bụrụ na ndị ụnụ na-ebinye ihe bụ naanị ndị ụnụ nwere olile anya na ha ga-akwụghachi ụnụ ụgwọ ụnụ, olee oke ihe ụnụ mere?
Ọ bụ na ndị na-eme arụ anaghị ebinye ndị na-eme arụ ibe ha ihe, nwee olile anya na ha ga-anataghachi ihe niile ha binyere? Na-ahụnụ ndị iro ụnụ n’anya; na-emerenụ ha ihe ọma.
Binyenụ mmadụ ihe, n’atụghị anya na a ga-akwụghachi ụnụ ụgwọ. Mgbe ahụ ka a ga-akwụghachi ụnụ ụgwọ buru ibu. N’ezie, mgbe ahụ ka a ga-akpọ ụnụ ụmụ nke Onye Kacha Elu, n’ihi na Ọ na-ewere ihe ọma nye ndị ajọ omume na ndị anaghị ekele Ya ekele.
Nweenụ obi ebere dịka Nna ụnụ si nwee obi ebere. Ụnụ ekpela mmadụ ibe ụnụ ikpe, ka a ghara ikpe ụnụ ikpe. Ụnụ amakwala onye ọ bụla ikpe, ka a ghara ịma ụnụ ikpe.
Gbaghaaranụ ibe ụnụ, ka e wee gbaghara ụnụ. Nyenụ ibe ụnụ onyinye, ka e wee nye ụnụ onyinye. Ọ ga-ebunye ụnụ ihe ọma n’akpa buru ibu, nke a yọgharịrị ihe dị n’ime ya, nke a sụjuru n’ọnụ, nke ihe ọma jupụtara, na-awụsị. Chineke ga-adọba ihe ọma n’akpa ukwu ụnụ. N’ihi na ụdị akpa ụnụ ji tụrụ mmadụ ihe ka Chineke ga-eji tụrụ ụnụ.
Igbo Mass Readings for February 24 2025, Mọnde Izuụka nke Asaa N’Oge Na-Adanyeghị N’Emume
Igbo Mass Readings for February 23 2025, Ụka nke Asaa n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Atọ.