Igbo Mass Readings for March 2 2025, Ụka nke Asatọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Atọ.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for March 2 2025, Ụka nke Asatọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Atọ.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 27:4-7

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Sirak

Isi Okwu: Enyela mmadụ otito tupu o kwuo okwu.

Mgbe a yọchara ihe na nkata, ka ifuribe ya na-apụta. Otu ahụ kwa ka ịgba-ọrụ dị na mmadụ si egosi onwe ya n’okwu ọnụ ya. Otu e si eji ọkụ elegha aka ọrụ onye ọkpụ-ite, ka e si eji okwu ọnụ mmadụ elegha ya.

E ji mkpụrụ osisi ala mịtara were amata otu ubi ebe osisi ahụ pulitere siri dị; otu ahụ kwa, okwu ọnụ mmadụ na-egosi ihe dị ya na mmụọ. E nyela mmadụ otito tupu o kwuo okwu n’ihi na ọ bụ okwu ka e ji elegha mmadụ.

ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 91:2-3.13-16. Az. 2

Azịza: Onyenweanyị ọ dị mma inye Gị ekele

1. Ọ dị mma inye Onyenweanyị ekele;

ya na ikwere Gị bụ onye Kacha Elu ukwe otito;

bịakwa na-ekwupụta obi ọma Gị n’ụzọ ụtụtụ,

bido kwa n’abalị na-ekwupụta ịdị mma Gị ruo na chi ọbụbọ.

Azịza: Onyenweanyị ọ dị mma inye Gị ekele

2. Onye ezi omume ga-eto ogologo,

bịakwa maa mma dịka nkwụ.

Ọ ga-etowapụ dịka osisi seda nke Lebanọn.

Ndị a kụrụ n’ụlọ nke Onyenweanyị ga-eto ogologo maa mma n’ogige nke Chineke anyị.

Azịza: Onyenweanyị ọ dị mma inye Gị ekele

3. Ha ga-amịgide mkpụrụ mee agadi,

bịakwa jupụta na ndụ gbasiekwa ike;

Na-ekwupụtanụ ka Onyenweanyị si akwụba aka ọtọ.

Nkume m! Onye na-ebughị ọrụ ọ bụla!

Azịza: Onyenweanyị ọ dị mma inye Gị ekele

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 15:54-58

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Mbụ Pọl dị asọ degaara ndị Kọrịnt

Isi Okwu: O sitela na Onyenweanyị Jesu Kristi nye anyị mmeri.

Mgbe ahụ nke a pụrụ ire ure yikwasịrị ereghị ure; mgbe ahụ nke a pụrụ ịnwụ anwụ yikwasịkwara anwụ anwụ; mgbe ahụ ka a ga-emezu okwu ahụ e dere n’Akwụkwọ Nsọ sị: “E loro ọnwụ n’ime mmeri! Ọnwụ! olee ebe mmeri gị dị? Ọnwụ! Olee ebe ụfụ gị dị?

Ụfụ ọnwụ bụ njọ. Ihe na-enye njọ ike bụ iwu. Ma ekele dịrị Chineke Onye nyere anyị mmeri site n’aka Onyenweanyị Jesu Kristi. Ụmụnna m m hụrụ n’anya, guzosienụ ike n’okwukwe ụnụ.

Kwụrụnụ chịm n’ịrụ ọrụ nke Onyenweanyị. Ụnụ maara nke ọma na mbọ ụnụ na-agba abụghị ihe efu mgbe a gbara ya n’ime Onyenweanyị.

MBEKU – Ọrụ Ndị Ozi 16:14

Aleluya, aleluya!

Onyenweanyị, meghee obi anyị ka anyị wee nara okwu nke Nwa Gị.

Aleluya!

OZIỌMA – 6:39-45

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere

Isi Okwu: Okwu ọnụ mmadụ na-esite na ihe juru ya obi apụta.

Jesu tụụrụ Ụmụazụ Ya ilu sị: “Onye-isi, ọ pụrụ idu onye-isi? Ọ bụrụ na ya nwaa anwaa, ụnụ chere na ha mmadụ abụọ agaghị adaba n’olulu? Nwata akwụkwọ adịghị aka onye nkuzi na-azụ ya.

Mgbe nwata akwụkwụ mụtachara ihe niile a kuziri ya, akwụkwọ ọ mụtara ha ka nke onye nkuzi ya. “Ma gịnị mere i ji legide anya na nwa irighiri ahịhịa dị n’anya nwanne gị, ma ị chọpụtaghị ibe osisi dachiri anya nke gị?

Olee otu i si hụ ọnụ ịsị nwanne gị: Nwanne m, ka m tụchapụ gị nwa irighiri ahịhịa dị gị n’anya”, mgbe gị onwe gị na-achọpụtaghị ibe osisi dachiri anya nke gị?

Ome ka e too ya! Burugodụ ụzọ bupụ ibe osisi dachiri gị anya gị, ka i wee hụ ụzọ ịtụchapụ nwa irighiri ahịhịa ahụ dị n’anya nwanne gị. “Osisi ọma anaghị amịta mkpụrụ rere ere.

Osisi rere ere anaghị amịta mkpụrụ ọma. A na-amata osisi ọbụla site na mkpụrụ ya. A naghị aghọta ụdara n’osisi ogwu; a dịghịkwa aghọta ụtụ n’osisi uke.

Ezigbo mmadụ na-esite n’ihe ọma juru ya obi na-eme ihe ọma; ajọ mmadụ na-esitekwa n’echiche ọjọọ furu ike n’obi ya, na-arụ arụrụala. N’ihi na ọnụ ka e ji ekwupụta ihe juru mmadụ n’obi.

Igbo Mass Readings for May 3 2025, Mọnde Izuụka nke Asatọ N’Oge Na-Adanyeghị N’Emume

Igbo Mass Readings for March 2 2025, Ụka nke Asatọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Atọ.