Igbo Mass Readings for January 24 2027, Ụka nke Atọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for January 24 2027, Ụka nke Atọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 3:1-5, 10
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Onye Amụma Jona
Isi Okwu: Ndị Ninive jụrụ ajọ omume.
Okwu Onyenweanyị bịakwutere Jona nke ugboro abụọ sị: Bilie gaa nnukwu obodo ahụ bụ Ninive. Zie ha ozi a M ga-ezi gị.” Jona ewee kwado gawa Ninive; dịka Onyenweanyị si gwa ya.
Ninive bụ nnukwu obodo buru oke ibu. Ọ na-ewe abalị atọ ịgafe ya. Jona bidoro njem o ji agafe nnukwu obodo ahụ. Ọ gaala ije otu ụbọchị na-ekwu sị: Sọ iri ụbọchị anọ ka ọ fọrọ tupuu a laa Ninive n’iyi.”
Ndị Ninive ewee kwere na Chineke. Ha kara na onye ọ bụla ga-ebu ọnụ, bịakwa yiri uwe mkpe, ma onye ukwu ma onye nta. Mgbe Chineke hụrụ ihe ha mere n’ịtụgharị n’ụzọ ọjọọ ha, ihe ahụ Ọ bara na mba ga-eme ha ewee wute Ya n’obi nke ukwuu. O mekwaghị ha ihe ahụ.
ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 24:4-9 Az. 4
Azịza: Biko Onyenweanyị, kuziere m ụzọ Gị.
1. Biko Onyenwe m, mee ka m mara ụzọ Gị.
Kuziere m okporo ụzọ Gị.
Duziwe m n’ezi okwu Gị;
kuziwekwara m n’ihi na Ị bụ Chineke na Onye Nzọpụta m.
Azịza: Biko Onyenweanyị, kuziere m ụzọ Gị.
2. Onyenweanyị, cheta na nnukwu obi ebere na obi ọma Gị bidororị na mbụ.
Onyenweanyị, were obi ọma Gị cheta m n’ihi ịdị mma Gị.
Azịza: Biko Onyenweanyị, kuziere m ụzọ Gị.
3. Onyenweanyị dị mma bịakwa kwụba aka Ya ọtọ.
Otu a ka O si egosi ndị njọ ụzọ.
Ọ na-edute ndị umeala n’ezi omume,
bịakwa na-akuziri ha ụzọ Ya.
Azịza: Biko Onyenweanyị, kuziere m ụzọ Gị.
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 7:29-31
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Mbụ Pọl dị asọ degaara ndị Kọrịnt
Isi Okwu: Ọdịdị ụwa nke a gaha agafere.
Ụmụnna m, isi okwu m bụ nke a: Oge fọdụụrụ anyị dị mkpụmkpụ. Bido ugbu a gawa, ndị ji nwanyị, ha biri ka ndị na-alụghị nwunye. Ndị na-akwa akwa, ha nọdụ ka ha akwaghị akwa.
Ndị na-añụrị ọñụ, ha nọdụ ka ha añụrịghị. Ndị na-azụ ahịa, ha biri dịka ọ bụghị ha nwe ihe ha zụtara. Ndị na-agbaso akụ na ụba na ihe ụtọ nke ụwa nke a, ha agafela oke n’ihe ha ji ihe nke ụwa eme. N’ihi na ọdịdị ụwa nke a anyị nọ n’ime ya gaha-agafere.
MBEKU – Mak 1: 15
Aleluya, aleluya!
Alaeze Chineke dị kwa nso; chegharịanụ kwerenụ n’Oziọma.
Aleluya!
OZIỌMA – 1:14-20
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere
Isi Okwu: Chegharịanụ, ma kwerekwanụ n’Oziọma.
Ma mgbe e tinyesịrị Jọn n’ụlọ mkpọrọ, Jesu bịara na Galili na-ekwusa Oziọma Chineke, sị: oge ezuola, ọchịchị Chineke dịkwa nso; chegharịanụ kwerenụ n’Oziọma.”
Mgbe Ọ na-aga n’ụzọ Osimiri Galili, Ọ hụrụ ndị ọkụ azụ abụọ, Saịmọn na Andrụ nwanne ya, ka ha na-awụnye ụgbụ ha na mmiri. Jesu wee sị ha: “Bịanụ so M n’azụ, M ga-eme ka ụnụ bụrụ ndị na-akụta mmadụ dịka e si akụta azụ.”
Ngwa ngwa ha wee hapụ ihe niile ha ji egbu azụ, soo Ya. Mgbe Ọ gatụkwuru n’ihu, Ọ hụrụ ụmụnne abụọ, Jemis na Jọn, ụmụ Zebedi ka ha nọ n’ụgbọ, na-edozi ihe ha ji egbu azụ.
Ngwa ngwa O wee kpọọ ha. Ha wee hapụ nna ha Zebedi n’ụgbọ, ya na ndị ọrụ e goro ego wee soo Ya n’azụ. Jesu na ndị na-eso ụzọ Ya wee bịaruo n’obodo Kapanọm.
N’ụbọchị izuike sonụ, Jesu banyere n’ụlọ nzukọ ha, na-ezi ihe. Ụzọ O si akuzi nkuzi wee tụ ndị niile nụrụ olu Ya n’anya; n’ihi na Ọ na-ezi ha ihe ka onye nwere ike, ọ bụghị dịka ndị Ode-akwụkwọ.
Igbo Mass Readings for January 25 2027, Emume Ntọgha nke Pọl dị Asọ
Igbo Mass Readings for January 24 2027, Ụka nke Atọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ.