Igbo Mass Readings for December 13 2026, Ụka nke Atọ n’Oge Olileanya Onye Nzọpụta Anyị – Afọ nke Abụọ
Nke a bụ Igbo Mass Readings for December 13 2026, Ụka nke Atọ n’Oge Olileanya Onye Nzọpụta Anyị – Afọ nke Abụọ.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 61:1-2, 10-11.
Ihe ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ onye Amụma Aịzaya.
Isi Okwu: “Ana m awụli elu n’ọñụ n’ime Onyenweanyị.”
E nyela m mmụọ nke Onyenweanyị, n’ihi na Onyenweanyị eteela m ude. O zipụla m ka m butere ụmụ ogbenye Oziọma, ka m jikọọ obi gbawara agbawa; ka m tọhapụ ndị e ji eji n’agbụ ha, meghepụkwara ndị nọ n’ụlọ nga ụzọ ka ha nwere onwe ha, bịakwa kwupụta afọ amara nke Onyenweanyị.
“Ana m awụli elu n’ọñụ n’ime Onyenweanyị. Mmụọ m na-añụrị ọñụ na Chineke m, n’ihi na O yiwela m uwe nke nzọpụta, bịakwa chịrị akwa mwụda nke ezi omume kpuchie m; dị ka nwoke na-agba akwụkwọ si ekpu okpu mara mma; dịka nwanyị e ji agba akwụkwọ si e were ihe ejiji ya chọọ onwe ya mma.
“N’ihi na otu ala si eme ka ihe dị ndụ na-etolite; dịka ala ọrụ ubi si eme ka ihe a kụrụ n’ime ya na-epulite, otu ahụkwa ka Onyenweanyị ga-esi mee ka eziomume na otito pulite n’ihu mba niile.”
ABỤỌMA NA AZỊZA YA – Luk 1:46-50. 53-54. Aịz. 61:10
Azịza: Mmụọ m na-añụrị ọñụ na Chukwu m.
1. Ọ na-eto Dinwenụ bụ mkpụrụobi m.
Mmụọ m na-añụrị na Chineke Onye Nzọpụta m.
O leela anya n’adịghị ike nke odibo nwanyị Ya.
Site taa gawa, ndụdụgandụ niile na-akpọ m onye dị ngọzi.
Azịza: Mmụọ m na-añụrị ọñụ na Chukwu m.
2. Onye ji ike niile emeerela m nnukwu ihe itụnanya: aha Ya dị asọ.
Ebere Ya si na ndụdụgandụ ruo na ndụdụgandụ maka ndị na-atụrụ Ya egwu.
Azịza: Mmụọ m na-añụrị ọñụ na Chukwu m.
3. O jila ihe ọma nyejuo ndị agụụ na-agụ afọ;
bịakwa chụpụ ndị ọgaranya n’enyeghị ha ihe ọ bụla.
O chekwawara Izrel nwodibo Yan a ncheta ebere Ya.
Azịza: Mmụọ m na-añụrị ọñụ na Chukwu m.
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 1 Tesa. 5:16-24
Ihe ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Ozi Mbụ Pọl dị asọ degaara ndị Tesalonịka.
Isi Okwu: Arịrịọ anyị bụ ka e chekwawa ụnụ na mmụọ na mkpụrụobi maka ọbịbịa nke Onyenweanyị.
Hụnụ na ọ dịghị onye ọ bụla n’ime ụnụ nke na-eji ihe ọjọọ akwụghachi ụgwọ ihe ọjọọ. Kama na-emerenụ ibe ụnụ na mmadụ niile ezi ihe mgbe niile. Na-añụrịnụ ọñụ mgbe niile. Na-ekpekwanụ ekpere n’ewepụghị aka. Nyenụ Onyenweanyị ekele n’ihe ọ bụla. Nke a bụ ihe Chineke chọrọ na’aka ụnụ, ka ụnụ na-adị ndụ n’ime Kristi Jesu.
Ụnụ egbochila ọrụ nke Mmụọ Nsọ. Ụnụ elelikwala ibu amụma. Kama, nwaleenụ ihe niile nke ọma. Jidesienụ ezi ihe ike. Wepụnụ aka n’ihe ọjọọ n’ụdị ọ bụla.
Ka Chineke n’onwe Ya onye na-enye udo, doo ụnụ nsọ n’ụzọ niile. Ka O debezukwaa mmụọ ụnụ, na mkpụrụobi ụnụ, na ahụ ụnụ niile, ka a ghara inwe ihe a ga-eji ata ụnụ ụta mgbe Onyenweanyị Jesu Kristi ga-abịa. Chineke bụ onye na-akpọ ụnụ, kwesịrị ntụkwasịobi. Ọ ga-emezukwa ya.
MBEKU – Luk 4:18
Alleluịa, Alleluịa:
E nyela m mmụọ nke Onyenweanyị. O zipụla m ka m bugara ndị ogbenye Oziọma.
Alleluịa.
OZIỌMA – Jọn 1:6-8, 19-28
Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere
Isi Okwu: Otu onye ụnụ na-amaghị nọ n’etiti ụnụ. Ọ bụ Onye ahụ na-abịa ma m gasịa.
Ọ dị otu nwoke Chineke zitere, aha ya bụ Jọn. Ọ bịara ịgbara ìhè ahụ akaebe, ka mmadụ niile wee si n’aka ìhè ahụ nweta okwukwe. Ya onwe ya abụghị ìhè ahụ, kama ọ bịara ịgbara ìhè ahụ akaebe. Nke a bụ akaebe nke Jọn gbara: N’oge ahụ, ndị isi nke ndị Juu siri na Jerusalem zigara ya ndị nchụaja na ndị Livaị ka ha jụọ ya onye ọ bụ. Jọn wee kwuo ezi okwu, ọ gọghị agọ, kama o kwupụtara sị: “Abụghị m Kristi ahụ.”
Ha jụrụ ya sị: “Onye zi ka ị bụ? Ị bụ Ịlaịja”? Jọn wee zaa sị: “Mba, abụghị m ya.” Ha wee jụọ ya sị: “Ị bụ Onye Amụma Ahụ”? Ọ sị: “Mba”! Ha wee sị ya: “Gwanụ anyị onye ị bụ, ka anyị nwee ihe anyị ga-aza ndị zitere zitere anyị. Gịnị ka ị na-ekwu banyere onwe gị”?
Jọn wee sị: “Abụ m ìhè ahụ onye amụma Aịzaya kwuru sị: ‘Otu olu na-eti mkpu n’ọzara: Meenụ ụzọ Onyenweanyị ka ọ kwụrụ ọtọ.”
Ụfọdụ n’ime ha ka ndị Farisii zitere. Ndị a wee jụọ Jọn sị: “Gịnị mere i ji eme ndị mmadụ mmirichukwu, ma ọ bụrụ na ị bụghị Kristi ahụ, ma ọ bụ Ịlaịja; ị bụghịkwa Onye Amụma Ahụ”?
Jọn wee zaa ha sị: “Eji m mmiri eme ndị mmadụ mmirichukwu. Ma otu onye guzo n’etiti ụnụ, onye ụnụ na-amaghị. Ọ na-abịa n’azụ m. Ma ekwesịghị m ọ bụna ịtọpụ eriri akpụkpọ ụkwụ Ya.” Ihe ndị a mere na Betanị, n’ofe Jọdan, ebe Jọn nọ na-eme ndị mmadụ mmirichukwu.
Igbo Mass Readings for December 14 2026, Mọnde Izuụka nke Atọ n’oge Olileanya Onye Nzọpụta anyị
Igbo Mass Readings for December 13 2026, Ụka nke Atọ n’Oge Olileanya Onye Nzọpụta Anyị – Afọ nke Abụọ