Igbo Mass Readings for December 15 2024, Ụka nke Atọ N’oge Olileanya Onye Nzọpụta – Afọ Nke Atọ
Nke a bụ Igbo Mass Readings for December 15 2024, Ụka nke Atọ N’oge Olileanya Onye Nzọpụta – Afọ Nke Atọ.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 3:14-18
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ onye Amụma Zefanịa
Isi Okwu: Onyenweanyị ga-eji mkpu ọñụ teere ụnụ egwu dị ka Ụbọchị oke mmemme.
Ada Zayọn, tiwe mkpu ọñụ! Izrel tisiwe mkpu ike! Ada Jerusalem, ñụrịwa! Were obi gị niile goriwe. Onyenweanyị akagbuola ikpe a mara gị; Ọ chụpụla ndị iro gị.
Chineke, Eze nke Izrel, nọ n’etiti ụnụ; o nwekwaghị ihe ọjọọ ụnụ ga-atụ egwu. Oge ụbọchị ahụ bịara, okwu ga-erute Jerusalem sị: “Zayọn, egwu atụkwala gị, e kwekwala ka ike gwụ gị.
Dinwenụ Chineke Gị nọ n’etiti gị, ọ bụ dike na-emeri n’agha. Ọ ga-eji ọñụ gbaara gị egwu bịakwa were ịhụnanya Ya mee ka ị dịkwa ọhụrụ. Ọ ga-eji mkpu ọñụ teere gị egwu dịka n’ụbọchị nnukwu mmemme.
ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 12:2-6 Az. 6
Azịza: Kwebenụ ukwe, na-etinụ mkpu ọñụ, n’ihi na onye nọ n’etiti ụnụ bụ nnukwu Onye Dị Nsọ nke Izrel.
1. N’ezie Chineke bụ onye nzọpụta m.
Enwere m nchekwube,
egwu agaghị atụ m.
N’ihi na Onyenweanyị bụ ike m, ukwe m;
ọ bụ onye Nzọpụta m.
Ụnụ ga-eji ọñụ kuru mmiri n’ụmị nke nzọpụta. Azịza.
2. Nyenụ Onyenweanyị ekele, toonụ aha Ya.
Meenụ ka ndị mmadụ mata ọrụ ịtụnanya Ya;
Kwupụtanụ ịdị ukwu nke aha Ya. Azịza
3. Bụọrọnụ Dinwenụ abụ ọma;
N’ihi na Ọ rụọla ọrụ ebube;
Kwupụtanụ ya na mba niile.
Ndị Zayọn, kwebenụ ukwe, tibenụ mkpu ọñụ,
n’ihi na onye nọ n’etiti ụnụ bụ nnukwu Onye Dị Nsọ nke Izrel. Azịza
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 4:4-7
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọozi Pọl dị asọ degaara ndị Filipaị
Isi Okwu: “Onyenweanyị anọrọla nso”
Ñụrịanụ ọñụ n’Onyenweanyị mgbe niile! Ka m sịkwa ya ọzọ: ñụrịanụ ọñụ. Meenụ ka mmadụ niile mara na ụnụ nwere obi añụrị. Onyenweanyị nọ nso.
Ụnụ echegbula onwe ụnụ n’ihe ọ bụla. Kama, n’ihe niile, werenụ ekpere, na arịrịọ, na ekele mee ka Chineke mara ihe na-akpa, ụnụ. Udo nke Chineke, nke karịrị nghọta nke mmadụ, ga-echebe obi ụnụ na echiche ụnụ n’ime Kristi Jesu.
Ụmụnna m, na nkwubi okwu m, meenụ ka obi ụnụ jupụta n’ihe niile bụ eziokwu, ihe niile kwesịrị ekwesị, na ihe niile ziri ezi, na ihe niile dị ọcha, na ihe niile kwesịrị ịhụnanya, na ihe niile e jiri amara mee.
Ọ bụrụ na ọ dị ihe ọ bụla mafere mma oke ma ọ bụ nke kwesịrị otito karịsịa, na-echenụ uche banyere ihe ndị a.
MBEKU – Luk 4:18
Aleluya, aleluya!
E nyela m mmụọ nke Onyenweanyị. O zipụla m ka m butere ụmụ ogbenye Oziọma.
Aleluya!
OZIỌMA – 3:10-18
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Isi Okwu: “Kedụ ihe anyị ga-eme?”
Igwe mmadụ ahụ wee jụọ Jọn sị: Gịnị ka anyị kwesịrị ime?” O wee zaghachi ha, sị: “Onye nwere uwe abụọ, ya nye onye na-enweghị enwe otu, onye nwere ihe oriri, ya nyetụ onye na-adịghị nke o nwere.”
Ụfọdụ ndị ọna-ụtụ bịakwutekwara Jọn ka o mee ha mmirichukwu. Ha wee jụọ ya, sị: “Onye nkuzi, gịnị ka anyị kwesịrị ime?” O wee sị ha: “Ụnụ anafele onye ọ bụla ụgwọ karịrị ihe iwu kwuru.”
Ụfọdụ ndị agha jụkwara ya, sị: “Kedụ maka anyị? Gịnị ka anyị kwesịrị ime?” O wee sị ha: “Ụnụ azọla onye ọ bụla ihe ya n’aka ike, ma ọ bụ site n’ibo ya ebubo ụgha.
Nweenụ afọ ojuju n’ụgwọ ọrụ ụnụ.” N’oge ahụ, ebe ndị Juu nọ n’olile anya mgbe Kristi ha ga-abịa, igwe mmadụ ahụ, wee na-atụgharị n’obi ha ụdị mmadụ Jọn bụ.
Ha wee na-eche sị: “E leghị anya, ọ bụ Kristi?” Ya mere, Jọn sịrị ha: “Eji m mmiri eme ụnụ mmirichukwu, ma Onye ka m ike na-abịa, onye m na-ekwesịghị ọ bụladị ịtọpụ eriri akpụkpọ ụkwụ Ya.
Ọ ga eji Mmụọ Nsọ na ọkụ mee ụnụ mmirichukwu. O ji n’aka Ya nkata O ji ayọ ọka, ka O wee yọchasịa ọka niile dị n’ubi Ya, kpobata ezi ọka Ya n’ime ọba Ya.
Ma Ọ ga-eji ọkụ a na-apụghị imenyụ emenyụ rechapụ igbogbo na afu!” N’ụzọ dị otu a, Jọn jiri okwu ịdụ-ọdụ dị iche iche zie ndị mmadụ Oziọma.
Igbo Mass readings for December 16 2024, Mọnde Izuụka nke Atọ n’oge Olileanya Onye Nzọpụta any
Igbo Mass Readings for December 15 2024, Ụka nke Atọ N’oge Olileanya Onye Nzọpụta – Afọ Nke Atọ.