Igbo Mass Readings for March 8 2026, Ụka nke Atọ N’oge Ncheta Ahụhụ Kristi – Afọ Nke Mbụ
Nke a bụ Igbo Mass Readings for March 8 2026, Ụka nke Atọ N’oge Ncheta Ahụhụ Kristi – Afọ Nke Mbụ.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 17:3-7
Ihe Ọgụgụ a wetara n’Akwụkwọ Ọpụpụ
Isi Okwu: Nye anyị mmiri ọñụñụ.
Mgbe akpịrị ịkpọ nkụ bịara karịa n’ebe ụmụ Izrel nọ, ha bidoro ntamu, na-ekwutọ Mosis sị: “Gịnị mere i jiri kpọpụta anyị n’ala ljipt? Ọ bụ ka anyị na ụmụ anyị na anụ ụlọ anyị nwụchaa n’agụ mmiri?
Mosis ewere rịọ Onyenweanyị sị: “Olee ihe m ga-eme ndị a? Ọ fọtụkwara nwa ntakịrị ugbu a ka ha tụwa m okwute.” Onyenweanyị ewere gwa Mosis sị: “Kpọrọ ụfọdụ ndị okenye nke ụmụ Izrel.
Gị na ha bute ndị mmadụ niile ụzọ. Werekwa mkpara ahụ i jiri kụọ n’osimiri jide n’aka mgbe ị na-aga. Aga M eguzoro n’ihu gị n’elu okwute Horeb ahụ. Ị ga-akụ ihe n’okwute ahụ.
Mmiri ndị mmadụ ahụ ga-añụ ga-esi na ya agbapụta. Ọ bụ ihe a ka Mosis mere n’ihu ndị okenye ụmụ Izrel. A kpọrọ ebe ahụ Masa na Meriba n’ihi ntamu nke ụmụ Izrel tamuru, na n’ihi na ha nwara Onyenweanyị ọnwụnwa mgbe ha sịrị: “Onyenweanyị, Ọ nọnyere anyị ka ọ bụ na Ọ nọnyeghịrị anyị?”
ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 94:1-2, 6-9, Az. 8
Azịza: Ọ bụrụ na ụnụ anụ olu Ya taa ụnụ agbachikwala obi ụnụ.
1. Bịanụ ka anyị were mkpu ọñụ tikuo Onyenweanyị;
toonụ nkume nke nzọpụta anyị.
Ka anyị bata n’ihu Ya, nye Ya ekele;
bịakwa were ukwe too Ya.
Azịza: Ọ bụrụ na ụnụ anụ olu Ya taa ụnụ agbachikwala obi ụnụ.
2. Bịanụ ka anyị hulata, kpọọrọ Ya isi ala,
ka anyị sekpuoro Chineke kere anyị.
N’ihi na ọ bụ Chineke anyị, anyị bụ ndị nke Ya;
igwe atụrụ O ji aka Ya azụ.
Azịza: Ọ bụrụ na ụnụ anụ olu Ya taa ụnụ agbachikwala obi ụnụ.
3. Ọ bụrụ na ụnụ anụ olu Ya taa,
ụnụ agbachikwala obi ụnụ,
dị ka e mere ya na Masa n’ime ọzara.
Mgbe nna ụnụ ha ledara M anya.
Ha ledara M anya nke ukwuu,
ma ha hụkwara aka ọrụ M.
Azịza: Ọ bụrụ na ụnụ anụ olu Ya taa ụnụ agbachikwala obi ụnụ.
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 5:1-2,5-8
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọozi Pọl dị asọ degaara ndị Rom
Isi Okwu: Mmụọ Nsọ e nyere anyị amụnyela ịhụnanya Chineke n’ime obi anyị.
Ugbu a, ebe a gụrụla anyị na ndị eziomume site n’okwukwe, anyị na Chineke dị n’udo site n’aka Onyenweanyị Jesu Kristi. Jesu akpọbatala anyị n’ime amara Chineke, site n’okwukwe.
Anyị na-erugharịkwa n’ime amara ahụ ugbu a. Ya mere, anyị na-añụrị ọñụ, n’ihi na anyị were olile anya na anyị ga-eketa otito Chineke! Ma ọ bụghị naanị nke a: Anyị na-añụrịkwa ọñụ n’ime mkpagbu anyị niile.
Olile anya ahụ adịghịkwa aghọ anyị ahịa. N’ihi na Chineke wusara ịhụnanya Ya n’ime obi anyị site n’aka Mmụọ Nsọ ahụ O nyere anyị. N’ihi na mgbe anyị ka nọ n’enweghị ike imere onwe anyị ihe ọ bụla; mgbe oge ahụ a kara aka ruru, Kristi nwụrụ n’ihi ndị na-amaghị Chineke.
Ọ bụ ihe siri ike mmadụ ịnwụ n’ihi onye ezi omume. E leghị anya mmadụ dị añaa nwere ike ijisi ike nwụtara ezi mmadụ ọnwụ. Ma ihe pụrụ nnukwu iche n’ịhụnanya Chineke hụrụ anyị bụ na Kristi nwụtaara anyị ọnwụ mgbe anyị ka nọ n’agbụ nke njọ.
MBEKU – Jọn 4:42. 15
R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.
Onyenweanyị, n’ezie, Ị bụ Onye nzọpụta nke ụwa. Nye m mmiri ndụ ahụ, ka agụụ mmiri gharakwa ịgụ m ọzọ.
R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.
OZIỌMA – 4:5-42
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere
Isi Okwu: Isi iyi na-asọba na ndụ ebighị ebi.
Jesu wee rute n’otu obodo Samerịa a na-akpọ Shekem nke dị nso n’ala ubi ahụ Jekọb nyere nwa ya Josef. Ọ bụkwa ebe ahụ ka olulu mmiri Jekọb dị. Jesu wee bịa, nọdụ ala n’akụkụ olulu mmiri ahụ, n’ihi na ije O jere gwụrụ Ya ike.
Oge ahụ bụ ihe dị ka etiti ehihie. Otu nwanyị Samerịa bịara isere mmiri. Jesu wee sị ya: “Nyetụ M mmiri ka M ñụọ.” (Mgbe ahụ, Ụmụazụ Ya jere n’ime obodo ịzụta ihe oriri).
Ma nwanyị ahụ zara sị: “Olee otu Gị bụ onye Juu si arịọ m bụ nwanyị Samerịa mmiri ka ị ñụọ?” (N’ihi na ndị Juu na ndị Samerịa adịghị erikọ). Jesu zara, sị ya: “Ọ bụrụ na ị maara onyinye nke Chineke na onye ọ bụ nke na-asị gị, ‘Nyetụ M mmiri ka M ñụọ’, ị garala-arịọ Ya ka O nye gị mmiri nke ndụ.”
Nwanyị ahụ wee sị Ya: “Nna m ukwu, I jighị ite mmiri. Olulu mmiri a mikwara emi. Olee ebe Ị ga-esi enweta mmiri ahụ na-enye ndụ? Ọ bụ Gị ka nna anyị Jekọb, onye nyere anyị olulu mmiri a?
Ya onwe ya, na ụmụ ya, na anụ ụlọ ya sikwara n’olulu mmiri a nweta mmiri ha ñụrụ. Ma Jesu zara ya sị: “Onye ọ bụla ñụrụ mmiri si n’olulu a, akpịrị ga-akpọkwa ya nkụ ọzọ.
Ma onye ọ bụla ñụrụ mmiri ahụ nke Mụ onwe M ga-enye ya, akpịrị aghaghị akpọ ya nkụ ruo mgbe ebighị ebi. Kama mmiri ahụ M ga-enye ya ga-aghọ n’ime ya isi-iyi nke ga na-asọpụtara ya mmiri nke ndụ ebighị ebi.”
Nwanyị ahụ wee sị Ya: “Nna m ukwu, nye m mmiri a, ka akpịrị ghara ịkpọ m nkụ ọzọ, ka m gharakwa ịbịa ebe a ọzọ isere mmiri.” Jesu wee sị ya: “Jee, kpọta di gị, bịaghachikwa n’ebe a.”
Nwanyị ahụ zara Ya, sị: “Enweghị m di.” Jesu wee sị ya: “I kwuru nke ọma na i nweghị di. I nweela di ise; ma nwoke gị na ya bi ugbu a abụghị di gị. Ya bụ na ị gwara m eziokwu.”
Nwanyị ahụ wee sị Ya: “Nna m ukwu, ahụrụ m na Ị bụ onye amụma. Nna anyị ha kpọọrọ Chineke isi ala n’ugwu a; ma ụnụ na-ekwu na ebe mmadụ ga-akpọrọ Chineke isi ala bụ naanị na Jerusalem.”
Jesu zara ya sị: “Nwanyị, kwere ihe M kwuru: Oge na-abịa mgbe ụnụ na-agaghị akpọkwara Nna isi ala n’ugwu a, ma ọ bụ na Jerusalem. Ụnụ na-efe ihe ụnụ na-aghọtaghị isi ya na ọdụ ya.
Ma anyị na-efe onye anyị maara. N’ihi na nzọpụta si n’aka ndị Juu abịa. Ma oge na-abịa, n’ezie, ọ bịalarị abịa, mgbe ndị na-efe Chineke n’ezie ga-akpọrọ ya isi ala n’ime mmụọ na n’eziokwu.
N’ihi ndị dị otu a ka Nna chọrọ ka ha bụrụ ndị na-ekpere Ya. Chineke bụ Mmụọ; ndị na-efe Ya ga-efe Ya n’ime mmụọ na n’eziokwu.” Nwanyị ahụ wee sị Ya: “Ama m na Mezaya, onye a na-akpọ Kristi, (ma ọ bụ E Chiri Echi) na-abịa.
Mgbe Ọ bịara, Ọ ga-akọwara anyị ihe niile.” Jesu wee sị ya: “Mụ onwe M na-agwa gị okwu bụ Ya.” (Mgbe Ọ na-ekwu nke a, Ụmụazụ Ya wee bata. Ọ tụrụ ha n’anya na Ya na nwanyị ahụ na-akparịta ụka.
Ma ọ dịghị onye ọ bụla n’ime ha jụrụ Ya sị: “Gịnị ka ị na-achọ n’aka ya? Ma ọ bụ, “Gịnị ka Gị na ya ji akparị ụka?” Ma nwanyị ahụ hapụrụ ite mmiri ya laghachi n’ime obodo, wee gwa ndị bi ebe ahụ sị: “Bịanụ, lee nwoke gwara m ihe niile m merela na ndụ m niile.
Onye ma, ma ọ bụ Kristi ahụ? Ha wee si n’obodo ha bịakwute Jesu. Mgbe ihe ndị a na-eme, Ụmụazụ Jesu rịọrọ Ya, sị: “Onye nkuzi, rienụ ihe.” Ma Jesu sịrị ha, “E nwere M nri M na-eri, nke ụnụ na-amaghị.”
Ụmụazụ Ya wee jụwa ibe ha, sị: “Ọ dị onye wetaara Ya ihe oriri?” Jesu wee zaa ha, sị: “Ihe oriri M bụ ime uche Onye zitere m, na ime ka a rụzuo ọrụ Ya. Ụnụ na-ekwu sị: Ọ fọrọ ọnwa anọ, owuwe ihe ubi eruo.
Ma ana M agwa ụnụ, ka ụnụ letịa anya hụ na mkpụrụ a kụrụ n’ubi achaala; na oge owuwe ihe n’ubi eruola. Onye na-ewe ihe ubi ebidolarị ịnara ụgwọ ọrụ ya, na ịchịkọtakwa mkpụrụ maka ndụ ebighị ebi, ka onye ghara mkpụrụ akụkụ n’ubi, soro onye owuwe ihe ubi ñụrịa ọñụ.
N’ihi na e mezuola okwu a ndị mmadụ na-ekwu, sị: “Onye ọzọ ghara mkpụrụ akụkụ, onye ọzọ bụ onye owuwe ihe ubi.” Ezigala M ụnụ iwe ihe ubi n’ebe ụnụ na-adọgbughị onwe ụnụ n’ọrụ.
Ndị ọzọ adọgbuola onwe ha n’ọrụ; ihe ụnụ na-eme ugbu a bụ iri uru ihe ha rụtara.”) Ọtụtụ ndị Samerịa, ndị si n’obodo ahụ kweere na Jesu site n’akụkọ nwanyị ahụ kọrọla ha, sị: “Ọ gwara m ihe niile m merela na ndụ m niile.”
Mgbe ndị Samerịa bịakwutere Jesu, ha rịọrọ Ya ka Ọ nọtụkwuo na be ha. O wee nọọ ebe ahụ ụbọchị abụọ. Site n’okwu ọnụ Ya, ọtụtụ mmadụ sokwara nweta okwukwe.
Ha gwara nwanyị ahụ sị: “Ọ bụghịkwa n’ihe ị kọọrọ anyị ka okwukwe anyị dabere. Kama anyị ejila ntị anyị nụ, jikwa obi anyị kwere na n’eziokwu, Onye a bụ Onye Nzọpụta nke ụwa.”
Igbo Mass Readings for March 9 2026, Mọnde Izuụka nke Atọ n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi
Igbo Mass Readings for March 8 2026, Ụka nke Atọ N’oge Ncheta Ahụhụ Kristi – Afọ Nke Mbụ.