Igbo Mass Readings for August 30 2026, Ụka nke Iri Abụọ na abụọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Mbụ.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for August 30 2026, Ụka nke Iri Abụọ na abụọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Mbụ.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 20:7-9

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Onye Amụma Jeremaya

Isi okwu: Okwu nke Onyenweanyị buteere m nkọcha.

Onyenweanyị, ị ghọọla m aghụghọ, meekwa m ka m ghọọ onye a ghọgburu n’aghụghọ. I jidesiela m ka aka ike, mee ka Uche gị mezuo m n’ahụ. Lee na mmadụ niile na-akparị m ụbọchị niile.

Onye Ọ bụla jikwa m na-eme ihe ọchị. N’ihi na mgbe ọ bụla m meghere ọnụ m kwuo okwu, mgbe ọ bụla m tiri mkpu, ihe na-esite n’ọnụ m apụta bụ nkwusa banyere ihe ike na nbibi.

N’ụzọ dị otu a okwu Onyenweanyị m na-ekwusa ewetarala m mkparị na ịkwa emu ụbọchị niile. Ọ bụrụkwa na m ekwuo n’obi m sị, “Agaghị m ekwute ihe ọ bụla banyere ya, agakwaghị m ekwu ihe ọ bụla metụtara aha ha ọzọ,” ọ dịghị ekwe m.

N’ihi na okwu ya na-enwu m ọkụ n’obi. Ọ dịkwa ka ọkụ na-enwu enwu emechibidoro ụzọ n’ime ọkpụkpụ m. Ike agwụla m ịnagide okpomọkụ nke okwu ya. N’ezie, apụkwaghị m ịnagide ya.

ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 62:2.6, 8-9. Az. 2

Azịza: Onyenwe m na Chineke, akpịrị na-akpọ mkpụrụobi m nkụ maka Gị.

1. Chineke, Ị bụ Chineke m onye m na-achọ.

Ahụ m na-achọsi Gị ike.

Akpịrị na-akpọ mkpụrụ obi m nkụ maka Gị,

dịka ịchakịrị ala kpọrọ nkụ na-enweghị mmiri.

Azịza: Onyenwe m na Chineke, akpịrị na-akpọ mkpụrụobi m nkụ maka Gị.

2. Otu a ka m si lee anya n’ebe Ị nọ n’ụlọ nsọ;

ka m wee hụ ike ebube Gị.

Maka na obi ọma Gị dị mma karịa ndụ.

Egbugbere ọnụ m ga na-eto Gị.

Azịza: Onyenwe m na Chineke, akpịrị na-akpọ mkpụrụobi m nkụ maka Gị.

3. N’ihi ya ka m ga-eji na-eto Gị ugbu a, m dị ndụ.

Ewelitere m aka m elu wee na-akpọku aha Gị.

Mkpụrụobi m ga-enwe afọ ojuju ka onye e jiri ihe gbara abụba kpọọrọ oriri.

Ọnụ m wee na-ekwe otito Gị.

Azịza: Onyenwe m na Chineke, akpịrị na-akpọ mkpụrụobi m nkụ maka Gị.

4. Ị bụ enyemaka m.

N’okpuru nku gị ka m na-eti mkpu ọñụ.

Mkpụrụobi m na-arapara Gị n’ahụ.

I jiri aka nri Gị kuru m.

Azịza: Onyenwe m na Chineke, akpịrị na-akpọ mkpụrụobi m nkụ maka Gị.

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 12:1-2

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Pọl dị asọ degaara Ndị Rom

Isi Okwu: Werenụ ahụ ụnụ chụọrọ Ya aja dị ndụ.

Ụmụnna m, eji m obi ebere Chineke, na-arịọ ụnụ, ka ụnụ were ahụ ụnụ gọọrọ Chineke, dịka aja dị ndụ, e doro nsọ nke na-amasị Chineke n’eziokwu.

Ụnụ eñomikwala ụdị ndụ ahụ, ụmụ ụwa gbara ụnụ gburugburu na-ebi. Kama meenụ ka ụdị ndụ ụnụ na-ebi bụrụ nke e nwoghara enwogha n’usoro ọhụrụ ahụ e ji eche echiche.

Ọ bụ sọ otu a, ka ụnụ nwere ike isi chọpụta ihe bụ ime uche Chineke; bịakwa mara nke bụ ime ihe ọma, ime ihe Chineke na-achọ, na ibi ndụ zuru oke.

MBEKU – Jọn 17:17

Aleluya, aleluya!

Onyenweanyị, okwu Gị bụ eziokwu. Doo anyị asọ n’eziokwu Gị.

Aleluya!

OZIỌMA – 16:21-27

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Isi Okwu: Onye ọ bụla chọrọ ịbụ onye na-eso ụzọ m, ya buru ụzọ gọlaha onwe ya.

Site mgbe ahụ gawa, Jesu malitere ime ka Ụmụazụ Ya ghọta na ọ dị Ya n’akara aka ije Jerusalem, taa nnukwu ahụhụ n’aka ndị okenye, ndị isi nchụaja, na ndị ode akwụkwọ; na ha ga-egbu Ya, mana Ọ ga-esi n’ọnwụ bilite n’ụbọchị nke atọ.

Mgbe ahụ ka Pita kpọọrọ Ya, jee n’akụkụ, malite ịkọwara Ya ka ọ ghara ịta ụdị ahụhụ ahụ, wee sị: “Onyenweanyị, Chineke ekwela ka ihe dị otu ahụ mee Gị, ma ọlị.”

Ma Jesu tụgharịrị, bachie Pita ọnụ, sị: “Gafee M n’azụ! Ekwensu! Ị nọchiiri M ụzọ! N’ihi na i jiri anya mmadụ nkịtị hụ ya; ọ bụghị anya Chineke ka i jiri hụ ya!”

Jesu bịakwara gwa Ụmụazụ Ya sị: “Onye ọ bụla chọrọ ịbụ onye na-eso M, ga-eburugodụ ụzọ jụ onwe ya, bịakwa chee aka buru obe ya, na-eso na nzọ ụkwụ M.

N’ihi na onye ọ bụla na-achọ ichekwaba ndụ ya, ga-atụfu ya. Ma onye ọ bụla tụfuru ndụ ya n’ihi M ga-achọta ya. Ma kedụ uru ọ ga-abara mmadụ, ma ya ritechaa ụwa niile n’uru, e wee napụ ya ndụ ya?

Ma ọ bụ ihe mgbanwo gịnị ka mmadụ ga-eji gbanworo ndụ ya? N’ihi na mgbe Nwa nke Mmadụ ga-abịa, n’ebube nke Nna Ya, n’ọgbara ndị mmụọma Ya, Ọ ga-akwụ onye ọ bụla ụgwọ dịka omume ya si dị.

Igbo Mass Readings for August 31 2026, Mọnde Izuụka nke Iri Abụọ na Abụọ N’Oge Na-Adanyeghị N’Emume

Igbo Mass Readings for August 30 2026, Ụka nke Iri Abụọ na abụọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Mbụ.