Igbo Mass Readings for August 29 2027, Ụka nke Iri Abụọ na abụọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for August 29 2027, Ụka nke Iri Abụọ na abụọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 4:1-2,6-8
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Diuterọnọmi
Isi Okwu: Ụnụ atụkwasịkwala iwu ọbụla n’elu iwu ndị a, kama meenụ ihe iwu ndị a na-ekwu.
Mosis gwara ndị mmadụ ahụ sị: “Izrel, ugbu a, nụrụnụ iwu na atụmatụ ndị a m na-akuziri ụnụ ka ụnụ debe; ka ụnụ wee dị ndụ banye, wee nwetakwa ala ahụ, Onyenweanyị Chineke nke nna nna ụnụ ha na-enye ụnụ.
Mgbe ụnụ na-edebe iwu Onyenweanyị Chineke ụnụ, nke bụ iwu ndị a m na-enye ụnụ, ụnụ etinyekwala etinye, ma ọ bụ wepụ ewepụ n’iwu ndị a. Kpachapụnụ anya debe iwu ndị a, maka na ọ bụ otu a ka ụnụ ga-esi egosi mba niile na ụnụ juru n’amamihe na ọgụgụ isi.
Mgbe ha nụrụ maka atụmatụ ndị a, ihe ha ga-ekwu bụ: “N’ezie, ihe a bụ oke obodo; agbụrụ ha majuru ihe afọ.” N’ihi olee obodo chi ha nọ nso ka Onyenweanyị, Chineke anyị; Onye nọ anyị nso mgbe ọ bụla anyị kpọkuru Ya?
Ma ọ bụ, kedụ oke obodo nwere atụmatụ na iwu dịka usoro iwu ndị a ziri ezi, nke M na-eguzobe ụnụ n’ihu n’ụbọchị taa?”
ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 14:2-5 Az. 1
Azịza: Onye ezi omume ga-ebi n’ihu nke Onyenweanyị.
1. Onye ezi omume aka ya kwụrụ ọtọ;
onye na-eche eziokwu n’obi ya.
Onye na-ejighị ire ya ekwutọ mmadụ ibe ya.
Azịza: Onye ezi omume ga-ebi n’ihu nke Onyenweanyị.
2. Onye anaghị eme mmadụ ibe ya ihe ọjọọ;
onye ya na onye agbata obi ya na-anọghị n’ịbanye n’okwu na ụka;
onye anaghị eji anya ahụ ndị kpọrọ ekwu nkụ na njọ;
ma o nwere nnukwu nsọpụrụ maka ndị na-atụ egwu Chineke.
Azịza: Onye ezi omume ga-ebi n’ihu nke Onyenweanyị.
3. Onye na-ebinye mmadụ ihe n’anaghị ọmụrụ nwa;
onye anaghị anara awufu iji kpegide onye ikpe laara.
Onye ọ bụla na-eme ihe ndị a ga-enwe ume na obi iru ala.
Azịza: Onye ezi omume ga-ebi n’ihu nke Onyenweanyị.
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 1:17-18, 21-22, 27
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Jemis dị asọ
Isi Okwu: Ụnụ ga-eme ihe okwu ahụ gwara ụnụ.
Ọ bụ ihe niile dị mma na ihe niile zuru oke ka e si n’elu nye anyị. O si n’aka Nna nke ihe niile gbadata, Onye na-adịghị agbanwo agbanwo ma ọlị, nke a na-enwe ihe ọ bụla dị ka mgbanwo n’ime Ya.
O jiri aka ya họrọ anyị site n’ozi nke eziokwu, ka anyị wee bụrụ mkpụrụ mbụ nke ihe niile e kere eke. Werenụ umeala nabatanụ okwu ahụ a kụnyere n’ime ụnụ, nke nwere ike ịzọpụta mkpụrụobi ụnụ.
Ma ụnụ ga-emerịrị ihe okwu ahụ gwara ụnụ. Ọ bụghị naanị igere ya na ntị, ka ụnụ ghara ịghọgbu onwe ụnụ. Lee nke bụ ofufe dị ọcha na-arụghị arụ n’anya Chineke Nna anyị: Ịgbatara ndị na-enweghị nne na nna, na ụmụ nwanyị isimkpe ọsọ enyemaka mgbe ha nọ na mkpa; na mmadụ ichedo onwe ya ka ọ ghara inweta mmerụ nke ụwa.
MBEKU – Eph. 1:17-18
Aleluya, aleluya!
Onyenweanyị, meghee obi anyị, ka anyị nụ okwu nke Nwa Gị.
Aleluya!
OZIỌMA – 7:1-8, 14-15, 21-23
Ihe Ọgụgụ nke a, si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere
Isi okwu: Ụnụ na-ewezuga iwu Chineke, bịa jidesie aka ike n’omenala mmadụ nkịtị
Ndị Farisii na ụfọdụ ndị ode akwụkwọ si Jerusalem bịara gbaa Jesu gburugburu. Ha chọpụtara na ụfọdụ ndị Ụmụazụ Ya ji aka rụrụ arụ, ya bụ, aka a na-akwọghị akwọ, na-eri ihe.
N’ihi na ndị Farisii, n’ezie, ndị Juu niile na-eso omenala ndị okenye; nke bụ na ha enweghị ike iri ihe n’ebughị ụzọ kwọruo aka na nku aka. Mgbe ọ bụla ha lọtara ahịa, ha enweghị ike iri ihe n’ebughị ụzọ fesa onwe ha mmiri.
E nwekwara ọtụtụ omenala ndị ọzọ e nyere ha banyere ịsa iko, na ọkụ na ite. Ndị Farisii na ndị ode akwụkwọ ahụ wee jụọ Ya, sị: “Olee ihe kpatara na ndị Ụmụazụ Gị anaghị asọpụrụ omenala ndị okenye?
Kama ha na-eri ihe n’akwọghị aka?” Jesu wee zaa ha: “Aịzaya kara n’ezi n’amụma ahụ o buru banyere ụnụ, bụ ndị o kwuru ọzọ, eme ọzọ: “Ofufe ndị a na-efe M, bụ sọ n’egbugbere ọnụ; Ma ebe obi ha nọ, tere aka n’ebe M nọ; Ofufe ha na-efe M, abaghị uru ma ọlị; Sọ ihe ha na-akuzi bụ atụmatụ ụmụ mmadụ.
Ụnụ na-ewezuga iwu Chineke, bịa jidesie aka ike n’omenala mmadụ nkịtị.” Ọ kpọkwara igwe mmadụ ahụ ọzọ, wee sị ha: “Ụnụ niile, tọọnụ ntị n’ala ghọta ihe M na-ekwu.
Ọ bụghị ihe banyere n’ime mmadụ, na-emerụ mmadụ. Kama, ọ bụ ihe pụtara n’ime mmadụ, na-emerụ mmadụ. Maka na ọ bụ site n’ime mmadụ, site n’obi mmadụ ka echiche ọjọọ si apụta; ịkwa iko, izu ohi, igbu ọchụ, iyi oyi, igbu ogbuu, ibu iro n’obi, ịghọ aghụghọ, ikwu okwu rụrụ arụ, inwe anya ukwu, ịgba asịrị, ịkpa nganga na nzuzu. Ọ bụ ajọ omume niile ndị a, na-esi n’ime mmadụ apụta, na-emerụ mmadụ.
Igbo Mass Readings for August 30 2027, Mọnde Izuụka nke Iri Abụọ na Abụọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume
Igbo Mass Readings for August 29 2027, Ụka nke Iri Abụọ na abụọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ.