Igbo Mass Readings for September 12 2027, Ụka nke Iri Abụọ na anọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for September 12 2027, Ụka nke Iri Abụọ na anọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 50:5-9
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Onye Amụma Aịzaya
Isi okwu: E were m azụ m nye ndị na-akụ m ihe.
Onyenweanyị Chineke na-emeghe ntị m ka m nụ ihe. Mụ onwe m enupụghị isi. Alaghachighị m azụ. Eweere m azụ m nye ndị na-akụ m ihe; bịakwa were ntị m nye ndị na efopụsị ahụ ọnụ.
Esepụghị m ihu m n’ebe ndị na-ekwa emu, na ndị na-agbụ m ọnụ mmiri nọ. Onyenweanyị Chineke bụ enyemaka m; n’ihi ya, ihere agaghị eme m. Agaghị m elekwa anya n’azụ.
O were m anya na ihere agaghị eme m. Onye na-ewelite aka nri m elu nọ nso. E nwere onye ọ bụla chọrọ ka mụ na ya chịpụ ya, ya bịa ka mụ na ya guzo ihu na ihu.
Onye ka mụ na ya ga-ekpe? Ya pụkwute m n’ogbo ikpe. Ị hụla na Onyenweanyị Chineke bụ enyemaka m. Ọ bụ onye ga-egosi na ikpe mara m?
ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 114:1-6, 89, Az. 9
Azịza: Aga m aga n’ihu nke Onyenweanyị n’ala ndị dị ndụ. Ma ọ bụ Aleluya.
1. Ahụrụ m Onyenweanyị n’anya, n’ihi na Ọ nụla olu ekpere m;
n’ihi na O geere m ntị n’ụbọchị m kpọkuru Ya.
Azịza: Aga m aga n’ihu nke Onyenweanyị n’ala ndị dị ndụ. Ma ọ bụ Aleluya.
2. Ụdọ ọnwụ gbara m gburugburu.
Ọnya nke ala mmụọ ejidela m.
Iwe na ọnụma juru m obi.
M wee kpọkuo aha Onyenweanyị:
“Onyenweanyị, zọpụta ndụ m.’
Azịza: Aga m aga n’ihu nke Onyenweanyị n’ala ndị dị ndụ. Ma ọ bụ Aleluya.
3. Onyenweanyị bụ onye amara na Onye aka Ya kwụ ọtọ.
N’ezie, Chineke anyị bụ onye ebere.
Ọ bụ aka na-echekwaba ụmụntakịrị.
E buturu m ala, ma Ọ zọpụtala m.
Azịza: Aga m aga n’ihu nke Onyenweanyị n’ala ndị dị ndụ. Ma ọ bụ Aleluya.
4. N’ihi na Ọ tọhapụla mkpụrụ obi m n’ọnwụ.
O hichaala m anya mmiri n’anya,
bịakwa mee ka ụkwụ m ghara ịsọ ngọngọ.
Aga m aga n’ihu Onyenweanyị n’ala ndị dị ndụ.
Azịza: Aga m aga n’ihu nke Onyenweanyị n’ala ndị dị ndụ. Ma ọ bụ Aleluya.
IHE ỌGUGU NKE ABỤỌ – 2:14-18
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Jemis dị asọ
Isi okwu: Okwukwe na-enweghị ezi ọrụ nwụrụ anwụ.
Ụmụnna m! Werenụ akụkọ onye na-ekwu na ya nwere okwukwe, ma e nwebeghị otu ọrụ ọma ọ bụla ọ rụrụ. Ụdị okwukwe ahụ, ọ ga-azọ ya? E nwee otu nwannne anyị nwoke, ma ọbụ nwanne anyị nwanyị, na-enweghị uwe ma ọ bụ ihe oriri ga-ezuru ya; ọ bụrụ na otu onye n’ime ụnụ asị ya: ‘Ya dịkwara gị mma!
Oyi atụkwala gị ọzọ! Rijukwaa afọ!’ n’enyeghị ya nke ọ bụla n’ihe ndị a e ji enyere ndụ aka, olee uru e ritere n’ekele ndị a? Otu ahụ ka okwukwe dị. Okwukwe na-enweghị ezi ọrụ nwụrụ anwụ.
Lee ihe a ga-agwa onye na-eme ụdị ihe a: “I kwuru na i nwere okwukwe, mana enwere m ezi ọrụ. Gosi m okwukwe gị na-enweghị ezi ọrụ, ka m were ezi ọrụ m gosi gị okwukwe m.”
MBEKU – Jọn 14:5
Aleluya, aleluya!
Onyenweanyị kwuru sị: “Abụ M Ụzọ, Eziokwu na Ndụ. O nweghị onye ọ bụla na-abịakwute Nna, e wepụ ma o si n’aka M.
Aleluya!
OZIỌMA – 8:27-35
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere
Isi okwu: Ị bụ Kristi. Nwa nke mmadụ aghaghị ịhụ ahụhụ.
Jesu na Ụmụazụ Ya pụrụ, na-agagharị n’obodo nta dị iche iche nke obodo Sizarịa Filipi. Mgbe ha na-aga n’ụzọ, Jesu jụrụ Ụmụazụ Ya, sị: “Onye ka ndị mmadụ na-asị na M bụ?”
Ha sị Ya: “Ụfọdụ na-ekwu na Ị bụ Jọn Ome Mmirichukwu; ụfọdụ na-ekwu na Ị bụ Ilaija; ndị ọzọ na-asị na Ị bụ otu n’ime ndị amụma.” O wee jụọ ha nke ha, sị: “Onye ka ụnụ onwe ụnụ na-eche na M bụ?”
Pita zara Ya sị: “Ị bụ Kristi” O wee dọọ ha aka na ntị ka ha ghara ịgwa onye ọ bụla na ya bụ Kristi. Jesu wee malite ikuziri Ụmụazụ Ya na: “Nwa nke Mmadụ aghaghị ịhụ ọtụtụ ahụhụ: Ndị okenye, na ndị isi nchụaja, na ndị ode-akwụkwọ aghaghị ịjụ Ya. A ghaghị igbu Ya. Ma mgbe ụbọchị atọ gasịrị, Ọ ghaghị isi n’ọnwụ bilie.”
Ọ kọọrọ ha ihe a n’ezoghị ọnụ. Nke mere na Pita kpọọrọ Ya jee n’akụkụ, malite ịbara ya mba na ịta Ya ụta. Ma Jesu tụgharịrị, lee Ụmụazụ Ya anya, wee baara Pita mba sị: “Gafee M n’azụ, ekwensu!
N’ihi na ụdị echiche ị na-eche, adịghị ka nke Chineke; kama ị na-eche echiche ka mmadụ. Jesu bịakwara kpọkọta igwe mmadụ ahụ, na ndị Ụmụazụ Ya wee sị ha: “Onye ọ bụla chọrọ ịbụ onye na-eso M, ya jụ onwe ya; bịakwa buru obe ya sowe M.
Maka na onye ọ bụla chọrọ ichekwaba ndụ ya ga-atụfu ya. Ma onye ọ bụla tụfuru ndụ ya n’ihi M, na n’ihi Oziọma, ga-azọpụta ndụ ya.
Igbo Mass Readings for September 12 2027, Ụka nke Iri Abụọ na anọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ.