Igbo Mass Readings for October 3 2027, Ụka nke Iri Abụọ na Asaa n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for October 3 2027, Ụka nke Iri Abụọ na Asaa n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 2:18-24

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Genesis

Isi Okwu: Ha abụrụ otu ahụ.

Dinwenụ Chineke kwuru sị, “Ọ dịghị mma ka nwoke nọrọ naanị ya, aga m emere ya onye ya na ya ga-anọ, onye inyeaka nke kwesịrị ya.” Ọ bụ aja ka Dinwenụ Chineke ji kpụọ ụdị anụmanụ niile, na anụ ufe niile.

O dutere ha ka mmadụ ahụ nye ha aha. Aha ọ bụla mmadụ ahụ kpọrọ anụ ọ bụla, aha ha na-aza. Ma n’ime ihe ndị a niile O nweghị onye inyeaka a chọpụtara kwesịrị ekwesị nye mmadụ ahụ.

N’oge ahụ Dinwenụ Chineke mere ka nwoke mbụ ahụ daa n’ụra. O wekwara otu ọgịrịga site n’ọgịrịga nke nwoke ahụ nwere. O mechikwara ebe o siri wepụta ya.

Otu ọgịrịga a ka o ji kpụọ nwanyị, dutere ya nwoke ahụ. Mgbe nwoke a hụrụ nwanyị ahụ, O tiri mkpu sị: “Nke a bụ ya! Nke a bụ nnọọ otu n’ime ọkpụkpụ dị m n’ahụ, n’ezie ọ bụ anụ ahụ m!

Aha a ga-akpọ ya bụ nwanyị, n’ihi na e sitere n’ahụ nwoke wepụta ya.” Ọ bụ nke a mere nwoke ga-eji hapụ nne na nna ya, ka e jikọtaa ya na nwunye ya, k a ha abụọ bụrụ otu anụ ahụ.

ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 127:1-5 Az. 5

Azịza: Ngọzi ga-adịrị ndị na-atụ Chukwu egwu, na-eso ụzọ Ya.

1. Ngọzi ga-adịrị ndị na-atụ Chukwu egwu, na-eso ụzọ Ya.

Ihe aka gị kụtara ka ị ga-eri.

Añụrị na agamnihu ga-abụ nke gị.

Azịza: Ngọzi ga-adịrị ndị na-atụ Chukwu egwu, na-eso ụzọ Ya.

2. Nwunye gị ga-adị ka osisi vaịnị,

na-amị mmịmị n’ime ụlọ gị.

Ụmụ gị ga-agarube oche nri gị,

ka ome osisi olivu.

Azịza: Ngọzi ga-adịrị ndị na-atụ Chukwu egwu, na-eso ụzọ Ya.

3. Otu a ka e si agọzi ndị na-atụ Chukwu egwu.

Ka Chukwu si na Zayọn gọzie gị.

Ka ị hụkwa agamnihu nke Jerusalem.

Dịkwa ndụ hụ ụmụ ụmụ gị.

Azịza: Ngọzi ga-adịrị ndị na-atụ Chukwu egwu, na-eso ụzọ Ya.

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 2:9-11

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi e degaara Ndị Hibru

Isi Okwu: Onye ahụ na-edo nsọ na ndị ahụ a na-edo nsọ bụ otu agbụrụ.

Ma n’ime Jesu ka anyị hụrụ, Onye e mere ka Ọ dị ala, nwa oge, karịa ndị mmụọma. Ma ugbu a, e jiri otito na ebube kpube Ya okpueze, maka na O weere onwe Ya nye n’ọnwụ.

O sitere n’amara Chineke, nwụọ ọnwụ, maka nzọpụta mmadụ niile. Ebe ọ bụ na Chineke bu n’obi ịkpọbata ọtụtụ ụmụ Ya n’otito, o kwesịrị ekwesị ime, ka Onye ahụ ihe niile dịịrị, na Onye ahụ ihe niile sitere na Ya dịrị, zuo oke site n’ahụhụ; ebe Ọ bụ Onye Ndu ga-akpọbata ha na nzọpụta.

Ọ pụtara na Onye ahụ na-edo nsọ, na ndị ahụ a na-edo nsọ, bụ ndị si n’otu agbụrụ. Ọ bụ ihe a mere na, ihere emeghị Ya ịkpọ ha ụmụnne Ya.

MBEKU – Jọn 14, 23

Aleluya, aleluya!

Onye ọ bụla hụrụ M n’anya, ga-ejidesi aka ike n’okwu M. Nna M ga-ahụ ya n’anya. Anyị ga- abịakwute ya.

Aleluya!

OZIỌMA – 10:2-16 maọbụ 10:2-12

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere

Isi Okwu: Ihe Chineke jikọtara ọnụ mmadụ ekewakwala ya

Ụfọdụ ndị Farisii bịakwutere Jesu. Iji leghaa Ya, ha jụrụ Ya sị: “O megidere iwu ma ọ bụrụ na nwoke gbaa nwunye ya alụkwaghị m”? Jesu jụrụ ha, sị: “Gịnị ka Mosis nyere ụnụ n’iwu?”

Ha zara Ya: “Mosis kwenyere ka nwoke dee akwụkwọ alụkwaghị m nye nwunye ya n’aka, bịazie chụlaa ya.” Jesu wee sị ha: “Ọ bụ n’ihi ekweghị ekwe ụnụ ka Mosis ji deere ụnụ iwu dị otu a.

Ma site na mmalite okike. Chineke mere nwoke na nwunye. N’ihi ya ka nwoke ga-eji hapụ nna na nne. Ha abụọ wee bụrụ otu ahụ. N’ihi ya, ha abụghịkwa abụọ, kama ha bụ otu ahụ.

Ya mere, mmadụ ekewakwala ihe Chineke kekọtara ọnụ.” Mgbe ha banyere n’ime ụlọ, Ụmụazụ Ya jụrụ Ya ajụjụ ọzọ banyere okwu a. O wee sị ha: “Nwoke chụpụrụ nwunye ya, gaa lụrụ nwunye ọzọ, ikpe mara ya maka na ọ na-akwa iko megide nwunye ya.

Otu aka ahụ, ọ bụrụ na nwanyị ahapụ di ya, lụrụ di ọzọ, ọ na-akwa iko.” [Ndị mmadụ na-akpọtara Ya ụmụ ha, ka O bitụ ha aka. Ma Ụmụazụ Ya na-achụghasị ha azụ.

Ma mgbe Jesu hụrụ ihe ha na-eme, O jiri iwe baara ha mba sị: “Hapụnụ ka ụmụntakịrị na-abịakwute M! Ụnụ egbochila ha, n’ihi na ọ bụ ndị dị otu a nwe Alaeze Chineke.

N’ezie, onye ọ bụla na-anabataghị alaeze Chineke dịka nwata ntakịrị, enweghị ike ịbanye n’ime kuru ha n’aka ya, bikwasị ha aka n’isi, gọzie ha ya.” O wee kuru ha n’aka ya, bikwasị ha aka n’isi gọzie ha.

Igbo Mass Readings for October 4 2027, Mọnde Izuụka nke Iri Abụọ na Asaa N’Oge Na-Adanyeghị N’Emume

Igbo Mass Readings for October 3 2027, Ụka nke Iri Abụọ na Asaa n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ.