Igbo Mass Readings for October 11 2026, Ụka nke Iri Abụọ na Asatọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Mbụ.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for October 11 2026, Ụka nke Iri Abụọ na Asatọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Mbụ.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 25:6-10

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ onye Amụma Aịzaya

Isi Okwu: Onyenweanyị ga-akpọ nnukwu oriri bịakwa hichaa onye ọ bụla anya mmiri.

Ọ bụ n’ugwu nke a, ka Onyenweanyị nke igwe ndị agha, ga-akpọrọ agbụrụ niile oke oriri, nke jupụtara na nri gbara abụba na mmanya bụ ọkachamma.

N’ugwu nke a, Ọ ga-ebibi ihe nfụchi ahụ fụchiri agbụrụ niile, na ihe mkpuchi ahụ e jiri kpuchi mba niile. Ọ ga-ala ọnwụ n’iyii ruo mgbe ebighị ebi. Onyenweanyị Chineke ga-ehicha anya mmiri n’ihu ha.

Ọ ga-esi n’ụwa niile wepụ nkwulu a na-ekwulu ndị nke Ya. N’ụbọchị ahụ, a ga-asị: “Lee Chineke anyị, Onye anyị na-ele anya na Ọ ga-azọpụta anyị. Ka anyị ñụrịanụ ọnụ bịakwa nwee obi añụrị na Ọ zọpụtala anyị.” N’ihi na aka nke Onyenweanyị ga-anọzi n’elu ugwu a.

ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 22 Az. 6

Azịza: Aga m ebi n’ụlọ Onyenweanyị, ụbọchị ndụ m niile.

1. Dinwenụ bụ onye nche m. O nweghị ihe ọ bụla ga-akọ m.

Ebe ahịhịa ndụ juru eju ka Ọ na-enye m ezumike.

Ọ na-eduga m n’agịga mmiri ka m zuru ike,

bịakwa na-agba m ume ka m kute ume ndụ.

Azịza: Aga m ebi n’ụlọ Onyenweanyị, ụbọchị ndụ m niile.

2. Ọ na-eduzi m n’ụzọ ziri ezì n’ihi aha Ya.

Ọ bụrụgodụ na m na-aga na ndagwurugwu nke ọchịchịrị,

egwu ọ bụla agaghị atụ m.

N’ihi na I ji mkpara na ngu Gị nọrọ m n’akụkụ, iji gbaa m ume.

Azịza: Aga m ebi n’ụlọ Onyenweanyị, ụbọchị ndụ m niile.

3. I ji aka Gị kwadoro m oriri nke m ga-eri n’ihu ndị iro m.

I ji aka Gị tee m ude n’isi.

Iko mmanya m ejula n’ọnụ.

Azịza: Aga m ebi n’ụlọ Onyenweanyị, ụbọchị ndụ m niile.

4. Sọ ịdịmma na obi ọma Gị ga na-eso m n’ụbọchị ndụ m niile.

Aga m ebi n’ụlọ nke Onyenweanyị ebighị ebi ebighị ebi.

Azịza: Aga m ebi n’ụlọ Onyenweanyị, ụbọchị ndụ m niile.

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 4:12-14, 19-20

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Pọl dị asọ degaara Ndị Filipịa

Isi Okwu: O nweghị ihe ọ bụla m na-agaghị emeri site n’enyemaka Onye ahụ na-agba m ume.

Amụtala m otu e si adị ndụ mgbe a nọ n’ụkọ, na otu e si ebi ndụ mgbe a nọ n’ụba. Agafeela m ihe ndị a, ha bịakwa doo m anya. N’ihi ya, ebe ọ bụla na n’oge ọ bụla, anọ m n’afọ ojuju: ma anọ m na nriju afọ, ma anọ m n’ebumọnụ; ma anọ m n’uju, ma anọ m n’ụkọ.

N’ime Onye ahụ na-enye m ike, enwere m ike ime ihe ọ bụla. Ma ụnụ mere nke ọma n’aka ụnụ nyeere m mgbe m nọ na mkpa. Chineke m ga-akwụ ụnụ ụgwọ, bịakwa gbooro ụnụ mkpa ụnụ n’uju, site n’ụdị akụ na ụba ahụ, O gosịrị anyị na Kristi Jesu. Ka otito dịrị Chineke Nna anyị, ebighị ebi, ebighị ebi. Amen.

MBEKU – Jọn 10: 27

Aleluya, aleluya!

Onyenweanyị kwuru sị: “Atụrụ M na-anụ olu M. Ama M ha; ha na-esokwa M”.

Aleluya!

OZIỌMA – 22:1-14 maọbụ 22:1-10

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Isi Okwu: Kpọbanụ onye ọ bụla n’oriri agbamakwụkwọ.

Jesu gwara ndị isi nchụaja na ndị okenye mmadụ okwu n’ilu ọzọ sị: “Alaeze eluigwe dị ka otu onye eze, nke kpọrọ oriri ọlụlụ nwunye maka nwa ya nwoke.

O zipụrụ ụmụ odibo ya, ka ha kpọọ ndị a kpọrọ oku maka oriri ọlụlụ nwunye, ma ndị a kpọrọ oku jụrụ ịbịa. Ọ bịakwara zipụ ụmụ odibo ya ndị ọzọ sị ha: Gwanụ ndị a kpọrọ oku: ‘Lee! E dozichaala m ihe oriri.

Egbuola m ehi na ewu gbara abụba maka oriri. Ihe niile ezuola! Bịawanụ oriri ọlụlụ nwunye”! Ma ndị a kpọrọ oku lefuuru ya anya, gawara nke ha: Otu jere n’ubi ya.

Nke ọzọ jee n’ụlọ ahịa ya. Ndị ọzọ nwudere ụmụ odibo eze, mesie ha ike, wee gbuo ha. Ihe a wutere eze nke ukwuu. O wee zipụ ndị agha ya, ka ha kwụgbuo ndị ogbu ọchụ ahụ, kpọọ obodo ha ọkụ.

Eze bịakwara gwa ụmụ odibo ya sị: “Akwadochaala m oriri ọlụlụ nwunye nwa m, ma ndị a kpọrọ ka ha rie ya egosila na ha etorughị ogo iri ya. N’ihi ya, gaanụ n’akụkụ okporo ụzọ niile.

Kpọtanụ onye ọ bụla ụnụ hụrụ, ka ọ bịa oriri ọlụlụ nwunye a.” Ụmụ odibo gara n’okporo ụzọ, kpọkọta ndị niile ha hụrụ, ma ndị ọma ma ndị ọjọọ. Ụlọ oriri ahụ jupụtakwara na ndị a kpọrọ.

“Ma mgbe eze batara ịhụ ndị bịara oriri, ọ hụrụ otu nwoke nọ ebe ahụ n’eyighị uwe oriri ọlụlụ nwunye. Eze jụrụ ya: ‘Enyi m, olee otu i si bata ebe a n’eyighị uwe ọlụlụ di na nwunye?”

Ma nwoke ahụ gbachiri ya nkịtị. Eze gwara ndị na-ejere ya ozi, sị: ‘Kee nụ ya ụkwụ na aka, tụpụ ya na mbara ezi, n’ime ọchịchịrị; ebe ahụ ka ịkwa akwa na ịta ikikere eze ga-adị.’ N’ihi na ọ bụ ezie na a kpọrọ ọtụtụ mmadụ, ma ọ bụ mmadụ ole na ole ka a họtara.”

Igbo Mass Readings for October 12 2026, Mọnde Izuụka nke Iri Abụọ na Asatọ N’Oge Na-Adanyeghị N’Emume

Igbo Mass Readings for October 11 2026, Ụka nke Iri Abụọ na Asatọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Mbụ.