Igbo Mass Readings for October 10 2027, Ụka nke Iri Abụọ na Asatọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for October 10 2027, Ụka nke Iri Abụọ na Asatọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 7:7-11
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Amamihe
Isi Okwu: A gụnyere akụ na ụba n’ihe efu.
Ekpere m ekpere, e wee nye m akọ. A rịọsiri m arịrịọ ike, mmụọ nke Amamihe ewee bịakwute m. Ọ tọrọ m ụtọ karịa mkpara eze na okwu eze. Mgbe m ji ya tụnyere akụ na ụba, agụnyere m akụ na ụba n’ihe efu.
O nweghị ọla ọ bụla dara oke ọnụ nke m kwetara na ọ bụ ihe e ji atụnyere amamihe. N’ihi na ọla edo niile bụ nwa aja ntakịrị n’ihu amamihe. ọla ọcha dị ka apịtị n’ihu ya.
Amamihe tọrọ ụtọ n’obi karịa ịgbasi ike na ịma mma nke anụ ahụ. Ahọọrọ m ya karịa ịhọrọ ihe, e be ọ bụ na ebube ya anaghị arahụ ụra. Ma ihe ọma niile sooro ya bịakwute m. Akụ na ụba juru ya ọba aka.
ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 89:12-17, Az. 14
Azịza: Onyenweanyị, nye anyị ịhụnanya Gị n’uju, ka anyị wee gụọrọ Gị egwu ọñụ.
1. Kụziere anyị ịgụta ụbọchị ndụ anyị nke ọma,
ime ka anyị mara ka ha si dị mkpụmkpụ,
ka obi anyị wee jupụta n’amamihe.
Onyenweanyị, lọghachie azụ!
Kedụ mgbe ihe a ga-ebi?
Meerenụ ụmụodibo Gị ebere.
Azịza: Onyenweanyị, nye anyị ịhụnanya Gị n’uju, ka anyị wee gụọrọ Gị egwu ọñụ.
2. Nye anyị obi ọma Gị n’uju na chi ọbụbọ;
ka anyị were añụrị tie mkpu ọñụ n’ụbọchị anyị niile.
Were obi añụrị dochiere anyị anya oge niile a anyị hụsiri anya,
na oge niile Ị tara anyị ahụhụ.
Azịza: Onyenweanyị, nye anyị ịhụnanya Gị n’uju, ka anyị wee gụọrọ Gị egwu ọñụ.
3. Ka ụmụodibo Gị hụ aka ọrụ Gị.
Ka ụmụodibo Gị hụ ebube Gị.
Ka nchekwaba amara nke Onyenweanyị, bụrụ nke anyị.
Mee ka aka ọrụ anyị mịta mkpụrụ mmaji kwuru mmaji.
Azịza: Onyenweanyị, nye anyị ịhụnanya Gị n’uju, ka anyị wee gụọrọ Gị egwu ọñụ.
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 4:12-13
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi e degaara Ndị Hibru
Isi Okwu: Okwu Chineke nwere ike ikpe echiche na izu nzuzo anyị ikpe.
Okwu Chineke bụ okwu dị ndụ, na-adị ire. Ọ na-aghọ nkọ karịa mma-agha nwere ihu abụọ. Ọ nwere ike ịgafe n’ebe mkpụrụ obi na mmụọ jikọtara; ma ọ bụ n’ebe njikọ ọkpụkpụ na ụmị ọkpụkpụ jikọrọ.
O nwere ike ikpebi ikpe dị n’agbata echiche na izu nzuzo nke obi. O nwere ihe ọ bụla e kere eke, zoro ezo n’ihu ya? Ihe niile gba ọtọ, gherekwa oghe, n’anya Onye ahụ anyị ga-aza ajụjụ niile banyere omume anyị.
MBEKU – Jọn 6: 63.68
Aleluya, aleluya!
Onyenweanyị, okwu Gị bụ mmụọ na ndụ. Ọ bụ Gị ji okwu nke ndụ ebighị ebi.
Aleluya!
ΟΖΙỌΜΑ – 10:17-30 maọbụ 10:17-27
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere
Isi Okwu: Gaa ree ihe niile i nwere bịaghachi soro m.
Mgbe Jesu paliri ije, na-aga n’ụzọ, otu nwoke gbaara ọsọ, gbuo ikpere n’ala n’ihu Ya, jụọ Ya si: “Ezigbo Nna m ukwu, gịnị ka m ga-eme ka m nwee ike iketa ndụ ebighị ebi?”
Jesu jụrụ ya: “Gịnị mere i ji akpọ M ‘Ezigbo”? Ọ dịghị onye ọ bụla bụ “Ezigbo” karịakwa sọ Chineke. Ị maara iwu: “E gbule ọchụ! A kwala iko! E zula ohi! A gbala ama ụgha!
A ghọgbula mmadụ ibe gị! Sọpụrụ nna gị na nne gị!” Nwoke ahụ zara Ya sị: “Nna m ukwu, edebezuchaala m ha niile siterị na mgbe m bụ nwanta. Jesu bịara lezuo ya anya na ahụ, wee hụ ya n’anya, sị ya: “Otu ihe ka ọ fọdụrụ ị ga-eme: Gaa, ree ihe niile i nwere; were ego ya kee ụmụ ogbenye.
Ị ga-nweta akụ na ụba n’eluigwe. Mgbe ahụ bịaghachi soro m.” Ihu gbarụrụ nwoke ahụ, mgbe ọ nụrụ ihe a Jesu kwuru. O jiri ọnụma lawa, maka na ọ bụ onye bara ụba.
Jesu wee legharịa anya, gwa Ụmụazụ Ya: “Ụnụ ahụla ka o si siere ndị bara ụba ike, ịbanye n’alaeze Chineke!” Okwu a gbara Ụmụazụ Ya gharịị, Ma Jesu bịakwara kwusie ya ike ọzọ sị ha: “Ụmụ M, leenụ otu o si siere onye bara ụba ike ịbanye n’alaeze Chineke!
N’ezie Ọ dịịrị ịnyịnya mfe isite n’anya agịga gafee, karịa onye ọgaranya ịbanye n’alaeze Chineke.” Okwu a bịara gbaa Ụmụazụ Ya gharịị karịa; nke na, ha sịrịtara onwe ha. “Ọ bụrụ na ọ ga-arara ndị ọgaranya ahụ ịbanye, onye kwanụ ka a ga-azọpụta?
Jesu lere ha anya sị: “Ihe a karịrị mmadụ n’omume. Ma o nweghị ihe ọ bụla karịrị Chineke n’omume”. Pita amalie, jụọ Ya sị: “Lee, anyị ahapụla ihe niile, soro Gị.”
Jesu wee sị: “N’ezie, agwa m ụnụ, ọ dịghị onye ọ bụla hapụrụ ụlọ, ụmụnne ndị nwoke na ụmụnne ndị nwanyị, nne, na nna na ụmụ, ma ọ bụ ala, n’ihi M, na n’ihi Oziọma, nke na-agaghị anataghachikwa n’ụwa a ụlọ, ụmụnne nwoke, ụmụnne nwanyị, ndị nne, ụmụaka na ala ubi, tinyere mkpagbu, ihe ruru ọkpụkpụ narị karịa nke ọ hapụrụ. Ọ ga-anata kwa ndụ ebighị ebi n’ụwa ọzọ.
Igbo Mass Readings for October 10 2027, Ụka nke Iri Abụọ na Asatọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ.