Igbo Mass Readings for September 6 2026, Ụka nke Iri Abụọ na atọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Mbụ.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for September 6 2026, Ụka nke Iri Abụọ na atọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Mbụ.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 33:7-9
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Onye Amụma Izikel
Isi Okwu: Ọ bụrụ na i zighi ajọ mmadu ozi M ziri, ị ga-aza M azịza maka ọnwụ ya.
Okwu Onyenweanyị ruru m ntị sị m, Nwa nke mmadụ, ekenyela M gị ọrụ ịbụ onye nche n’ụlọ Izrel. Mgbe ọ bụla ị nụrụ ka M kwuru ihe ọ bụla, dọọrọ M ha aka na ntị.
Ọ bụrụ na M sị onye ajọ omume na ọ ga-anwụrịrị, ị hapụ ịgwa onye ajọ omume ahụ okwu ka ọ tụgharịa obi n’iso ụzọ ọjọọ ya, onye ajọ omume ahụ ga-anwụrụ njọ ya, ma aga M ana gị ụgwọ isi ya maka ọnwụ ọ nwụrụ.
Ma ọ bụrụ na ị dọrọ onye ajọ omume ahụ aka na ntị, bịakwa gbaa mbọ ịtụgharị ya n’ụzọ ọjọọ ya, ma ya kachie ntị jụ ịtụgharị n’ụzọ ọjọọ ya, ọ ga-anwụrụ njọ ya, ma ị zọpụtala isi onwe gị.
ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 94:1-2, 6-9. Az. 8
Azịza: Taa, ọ bụrụ na ụnụ anụ olu Ya, ụnụ emela ka obi ụnụ kpọọ nkụ.
1. Bịanụ ka anyị kweere Onyenweanyị ukwe añụrị.
Ka anyị too okwute nke nzọpụta anyị.
Ka anyị were inye ekele kpọọrọ Ya isi ala.
Bịakwa were obi añụrị bụọrọ Ya abụ ọma.
Azịza: Taa, ọ bụrụ na ụnụ anụ olu Ya, ụnụ emela ka obi ụnụ kpọọ nkụ.
2. Bịanụ ka anyị sekpuoro Ya,
bịakwa kpọọrọ Ya isi ala.
Ka anyị sekpuru n’ihu Onyenweanyị, Onye kere anyị.
N’ihi na ọ bụ Chineke anyị.
Anyị bụkwa ndị Ọ na-azụ ka atụrụ,
bịakwa bụrụ igwe atụrụ Ọ na-eduzi ụzọ.
Azịza: Taa, ọ bụrụ na ụnụ anụ olu Ya, ụnụ emela ka obi ụnụ kpọọ nkụ.
3. Ewoo! Ma ọ bụrụ na ụnụ anụ olu Ya taa;
Ụnụ emela ka obi ụnụ sie ike dịka na Meriba;
dịka n’ụbọchị ahụ na Masa n’ime ọzara,
ebe nna nna ụnụ ha nọrọ nwaa m.
Ha nwara M, ma ọ bụ ezi okwu na ha ahụla ọrụ ebube M.
Azịza: Taa, ọ bụrụ na ụnụ anụ olu Ya, ụnụ emela ka obi ụnụ kpọọ nkụ.
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 13:8-10
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Pọl dị asọ degaara Ndị Rom
Isi Okwu: Ịhụnanya bụ imezu iwu niile.
Ejila onye ọ bụla ụgwọ ọ bụla, nke na-abụghị ụgwọ ahụ onye ọ bụla ji ibe ya: ụgwọ mmadụ ịhụ ibe ya n’anya; n’ihi na onye hụrụ mmadụ ibe ya n’anya edebezuola iwu.
Ihe niile e nyere n’iwu: “A kwala iko; e gbula ọchụ; e zula ohi; e nwela anya ukwu,” na iwu ndị ọzọ niile, kwekọtara isi n’iwu a: “Hụ mmadụ ibe gị n’anya otu i si hụ onwe gị n’anya.” Onye hụrụ mmadụ ibe ya n’anya adịghị eme ya ihe ọjọọ. Ihe ọ pụtara bụ na ịhụnanya bụ imezu iwu.
MBEKU – Jọn 10:27
Aleluya, aleluya!
Onyenweanyị kwuru sị: “Atụrụ M na-egere M ntị. Ama M ha. Ha na-esokwa M”.
Aleluya!
OZIỌMA – 18:15-20
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Isi Okwu: Ọ bụrụ na o geere gị ntị, i nwetakwala nwanne gị ọzọ.
Jesu gwara Ụmụazụ Ya, sị: “Ọ bụrụ na nwanne gị emehie gị, jee, tụọ ya mmehie yà n’ihu ebe naanị gị na ya nọ. Ọ bụrụ na ọ ñaa gị ntị, i ritela nwanne gị n’uru.
Ma ọ bụrụ na ọ naghị gị ntị, kpọrọ onye ọzọ ma ọ bụ mmadụ abụọ ga-agba akaebe n’ihe ọ bụla e kwuru. Ọ bụrụ na ọ ñaghị ha ntị, gwa Nzukọ. Ọ bụrụ na ọ ñaghị ntị n’ihe Nzukọ kwuru, were ya ka onye ala ọzọ, ma ọ bụ ka onye ọna-ụtụ.
“N’ezie, asị M ụnụ: ihe ọ bụla ụnụ kwupụtara na e kedoro agbụ n’elu ụwa, ga-abụ ihe e kedoro agbụ n’eluigwe. Ihe ọ bụla ụnụ kwupụtara na a tọpụrụ agbụ n’elu ụwa, ga-abụ ihe a tọpụrụ agbụ n’eluigwe.
“Ọzọ kwa, asị M ụnụ: Ihe ọ bụla mmadụ abụọ n’ime ụnụ jikọrọ ọnụ rịọ n’ekpere, Nna M nọ n’eluigwe ga-emere ya ụnụ. N’ihi na ebe mmadụ abụọ ma ọ bụ atọ zukọrọ n’aha M, ebe ahụ ka M nọ n’etiti ha.”
Igbo Mass Readings for September 7 2026, Mọnde Izuụka nke Iri Abụọ na Atọ N’Oge Na-Adanyeghị N’Emume
Igbo Mass Readings for September 6 2026, Ụka nke Iri Abụọ na atọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Mbụ.