Igbo Mass Readings for September 19 2027, Ụka nke Iri Abụọ na Ise n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for September 19 2027, Ụka nke Iri Abụọ na Ise n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 2:12.17-20

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Amamihe

Isi Okwu: Ka anyị maa ya ikpe ọnwụ ihere

Ndị ajọ mmadụ kwuru sị, Ngwanụ ka anyị gbaa onye ezi omume gburugburu kpugide ya, n’ihi na ọ na-akasị anyị anya. Ọ pụụrụ onwe ya iche bịa na-emeghasị ihe niile anyị na-eme.

Ọ na-abara anyị mba, na ata anyị ụta na anyị na-emebi iwu. Ọ na-ama anyị ikpe na anyị na-emerụ ọzụzụ a zụrụ anyị. Ngwanụ ka anyị leghaa ma okwu ya, ọ bụ ezi okwu.

Ka anyị chọpụta ihe ga-eme ya. N’ihi na, a na sị na onye ezi omume bụ nwa Chineke, Chineke ga-alụrụ ya ọgụ, bịakwa zọpụta ya n’aka ndị iro ya. Ka anyị were nkwutọ na ntamahụhụ leghaa ya, iji chọpụta ma ọ ga-anọrọ nwayọọ were ndidi digbuo ihe niile. Ka anyị ma ya ikpe ọnwụ ihere: n’ihi na ihe o kwutere n’ọnụ bụ, na Chineke ga-azọ ya.

ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 53:3-6, 8 Az. 6

Azịza: Onyenweanyị na-ewelite ndụ m.

1. Chineke m, were aha Gị zọpụta m.

Were ike Gị lụọrọ m ọgụ.

Chineke m, nụrụ arịrịọ m.

Chee ntị n’okwu si m n’ọnụ.

Azịza: Onyenweanyị na-ewelite ndụ m.

2. N’ihi na ndị nganga ebiliela imegide m.

Ndị na-akpọghị ndụ ihe ọ bụla na-achọ iwepụ ndụ m n’ike.

Ha akpọkwaghị Chineke ihe ọ bụla.

Azịza: Onyenweanyị na-ewelite ndụ m.

3. Ma lee, Chineke bụ enyemaka m.

Onyenweanyị na-akwalite ndụ m.

Aga m eji obi m niile achụrụ Gị aja.

Onyenweanyị aga m eto aha Gị n’ihi na Ị dị mma.

Azịza: Onyenweanyị na-ewelite ndụ m.

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 3:16-4:3

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Jemis asọ dere

Isi Okwu: Mgbe ndị na-eme udo na-ekpe udo, ha na-agha mkpụrụ ga-amịta ịdị nsọ.

Ebe ọ bụla ekworo na oke ọchịchọ dị, n’ebe ahụ ka a na-ahụ ekwe ekwe, na ime ụdị arụ niile dị iche iche. Ma amamihe si n’eluigwe bịa, bụ ihe na-arụghị arụ.

O jupụtara n’udo, na-ewetakwa obi ọma, na ume na obi iru ala. O jupụtara n’ebere, na-egosikwa onwe ya site n’ịrụ ezi ọrụ. A naghị ahụ mmegbu na arụrụala n’ime ya.

Mgbe ndị na-eme udo na-ekpe udo, ha na-agha mkpụrụ ga-amịta ịdị nsọ. Olee ihe na-akpata ibu agha, na ịlụ ọgụ n’etiti ụnụ na ibe ụnụ? Ọ bụ na ọ bụghị oke ọchịchọ dị iche iche, nke na-ebuso ibe ha agha n’ime ụnụ?

Ị chọrọ ihe, ị chọtaghị ya n’ihi ya, ị kwadoro igburu ya mmadụ. Ị chọrọ ihe, i nwetaghị ya; n’ihi ya, i bido ọgụ na mgba, ka i nweta ya n’ike. Ihe i jiri enwetaghị ihe ị na-achọ bụ maka na ị naghị ekpe ekpere maka ya.

Ọ bụrụ na ị kpere ekpere, ma ịrịọtaghị ihe ị na-arịọ, ọ bụ maka na i kpezighị ekpere gị nke ọma. Ihe ị rịọrọ bụ ka e nye gị, ihe ga-ezuru gị oke ọchịchọ ahụ bi n’ime gị.

MBEKU – Matiu.11:25

Aleluya, aleluya!

Nna, ngọzi dịrị Gị, Onyenwe eluigwe na ụwa. Ọ bụ ụmụ ntakịrị ka I gosiri ihe omimi nke alaeze ahụ.

Aleluya!

OZIỌMA – 9:30-37

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere

Isi Okwu: A ga-arara Nwa nke Mmadụ nyefee n’aka ndị mmadụ.

Jesu na Ụmụazụ Ya si n’ugwu gbadata, wee na-agafe na Galili. Ma o nweghị onye ọ bụla ọ chọrọ ka ọ mata, n’ihi na e nwere ihe Ọ na-akụziri Ụmụazụ Ya.

Ọ na-akụziri ha na: ‘A ga-arara Nwa nke Mmadụ nyefee n’aka ndị mmadụ. Ha ga-egbu Ya. Ma mgbe ha gbuchara Ya, Ọ ga-ebilitekwa ọzọ n’ụbọchị nke atọ.” Ma Ụmụazụ Ya aghọtaghị ihe O kwuru.

Ma ụjọ ekweghị ha jụghaa Ya ihe O kwuru. E mesịa ha bịarutere Kapanọm. Mgbe ha banyere n’ime ụlọ, Ọ jụrụ ha sị: “Gịnị ka ụnụ na-arụrịta ụka banyere ya, mgbe anyị nọ n’ụzọ?”

Ha ekwughị ihe ọ bụla, n’ihi na mgbe ha nọ n’ụzọ, ha na-arụrịta ụka banyere onye kachasị ibe ya n’etiti ha. O wee nọdụ ala, kpọkọta Ụmụazụ iri-na-abụọ ahụ wee sị ha: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla chọrọ ịbụ onye mbụ, ọ ga-eme onwe ya onye ikpeazụ na odibo mmadụ niile.” O wee kpọrọ otu nwantakịrị, guzowe ya n’etiti ha.

O kuuru nwanta ahụ n’aka ya sị ha: “Onye ọ bụla nabatara nwata ntakịrị dị otu a n’aha M, nabatara M. Onye ọ bụla nabatara M, ọ bụghị M ka ọ nabatara; kama ọ nabatara Onye ahụ zitere M.”

Igbo Mass Readings for September 20 2027, Mọnde Izuụka nke Iri Abụọ na Ise N’Oge Na-Adanyeghị N’Emume

Igbo Mass Readings for September 19 2027, Ụka nke Iri Abụọ na Ise n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ.