Igbo Mass Readings for September 21 2025, Ụka nke Iri Abụọ na Ise n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Atọ.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for September 21 2025, Ụka nke Iri Abụọ na Ise n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Atọ.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 8:4-7

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Onye Amụma Emọs

Isi Okwu: Maka ndị ji ego egote ndị ogbenye.

Nụrụnụ ihe a, ụnụ bụ ndị na-emegbu ndị nọ na mkpa, na-achọkwa ịkpagbu ndị ogbenye nọ n’ime obodo ụnụ; ụnụ ndị na-ekwu sị: “Ọnwa ọhụrụ, ya gafee ọsọsọ, ka anyị gaa ree ngwa ahịa anyị!

Ụbọchị izuike, ya gafee ọsọsọ, ka anyị ree ọka anyị! Anyị ga-ebepụ ihe n’iko e ji ere ahịa, bịakwa bulite ọnụ ahịa elu. Ka anyị were aghụghọ ghọgbuo ndị anyị na ha na-azụkọrịta ahịa, bịakwa gbanwoo ihe e ji atụnyere mmadụ ihe n’ahịa. Anyị ga-eji ego goro ụmụ ogbenye, bịakwa were akpụkpọ ụkwụ gbanwota ndị nọ na mkpa.

Ọ bụrụgodu ihe ọka a zafuru azafu, anyị ga-eji ya enweta ego.” Onyenweanyị añụọla ya ka ọ bụrụ iyi, site n’ụdị nganga e ji mara Jekọp: “E nweghị M ike ichefu nke ọ bụla n’ihe ọjọọ niile i mere.”

ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 112:1-2, 4-8. Az. 1.7

Azịza: Toonụ Dinwenụ, Onye na-ekulite ndị ogbenye elu.

1. Ụmụodibo Chineke, toonụ Dinwenụ!

Ka ngọzi dịrị aha nke Dinwenụ bido ugbu a, ruo mgbe ebighị ebi.

Azịza: Toonụ Dinwenụ, Onye na-ekulite ndị ogbenye elu.

2. Dinwenụ dị elu karichaa mba niile.

Otito Ya dị elu karịa eluigwe.

Onye dị ka Dinwenụ, Chineke anyị,

Onye bi n’elu kacha elu;

bịakwa were obi ọma Ya si n’eluigwe na-eledata anya n’ụwa.

Azịza: Toonụ Dinwenụ, Onye na-ekulite ndị ogbenye elu.

3. Ọ na-esi n’ala na-ebulite ndị dara ada.

Ọ na-esikwa n’ụwa ọjọọ ha na-ebulite ndị ogbenye,

iji kpọbata ha n’ọgbakọba ndị eze.

N’ezie n’ọgbakọba ndị eze ndị nke Ya!

Azịza: Toonụ Dinwenụ, Onye na-ekulite ndị ogbenye elu.

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 2:1-8

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Mbụ Pọl dị asọ degaara Timoti

Isi Okwu: Ofufe nru n’ime Nzukọ Kristi

Nke mbụ, ana m adụ ọdụ ka a na-ekpe ekpere maka onye ọ bụla: ka a na-arịọ arịrịọ, na-ebeku Chukwu, na-enye ekele maka mmadụ niile; ma nke ka nke bụ maka ndị eze, na ndị na-achị achị, ka anyị were ume na obi iru ala, biri n’udo na ọñụ, wee fee Chineke anyị ofufe.

Ime ihe dị otu a ziri ezi, bụrụkwa ihe ga-amasị Chineke Onye Nzọpụta anyị. Ọ chọrọ ka a zọpụta onye ọ bụla, bịakwa chọọ ka mmadụ niile nweta ezi okwu ahụ n’uju. N’ihi na, ọ bụ sọ otu Chineke dị.

Ọ bụkwa sọ otu onye ogbugbo dị n’agbata Chineke na mmadụ. Onye ahụ bụ mmadụ, Kristi Jesu. Onye jiri Onwe Ya gbapụta mmadụ niile. Ọ bụ ya gbara akaebe na nke a, bụrụkwa Ya ka e zitere mgbe oge zuru.

Mụ onwe m bụ onye a kpọrọ aha, kenye ọrụ izisa ozi a na onye e mere Nwazụ maka ya. Eziokwu ka m na-ekwu! Anaghị m atụ asị! Abụụrụ ndị ọgọmmụọ onye nkuzi nke okwukwe na nke eziokwu ahụ. N’ihi ya, n’ebe niile, a chọrọ m ka mmadụ were nsọpụrụ, chilie aka elu n’ekpere, n’ebughị iwe na ọnụma.

MBEKU – Jọn 14:5

Aleluya, aleluya!

Onyenweanyị kwuru sị: “Abụ M ụzọ, eziokwu na ndụ. E nweghị onye ọ bụla na-abịakuwte Nna, e wepụ ma o si n’aka M.”

Aleluya!

OZIỌMA – 16:1-13 maọbụ 16:10-13

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere

Isi Okwu: Ụnụ enweghị ike ịbụ ohu Chineke bụrụkwa ohu akụ na ụba.

Jesu gwara Ụmụazụ Ya: [“E nwere otu ọgaranya a kọọrọ na nwodibo ya na-ala akụ na ụba ya n’iyii. Ọ kpọrọ nwodibo ahụ, jụwa ya sị: ‘Gịnị bụ ihe a m na-anụ banyere gị?

Kọọrọ m otu i si eme akụ na ụba m, n’ihi na ị gaghị agbakwara m odibo ọzọ. “Nwodibo ahụ ekwuo n’obi ya sị: “Ugbu a, nna m ukwu na-achụ m n’ọrụ! Olee ihe m ga-eme?

Ike igwu ala adịghị m! Ihere ga-eme m ịrịọ arịrịọ! Ahaa! Amatala m ihe m ga-eme, ka e wee nwee ndị ga-anabata m n’ụlọ, mgbe a chụpụrụ m n’ọrụ! O wee kpọọ ndị niile ji nna ya ukwu ụgwọ n’otu n’otu.

Ọ jụọ onye nke mụ: Ụgwọ gịnị ka i ji nna m ukwu?’ Ọ zaa: ‘puku karama mmanụ. Nwodibo ahụ wee sị ya: ‘Ngwa! Were akwụkwọ gị ọsọsọ, degharịa ya narị karama ise. Ọ bịakwa jụọ onye nke ọzọ: ‘Ụgwọ gịnị ka i ji?’

Ọ zaa: ‘Ụgwọ narị akpa ọka !’ Nwodibo ahụ asị ya: ‘Ngwa! Degharịa ya iri akpa ọka asatọ.” Ọgaranya ahụ toro nwodibo arụrụala a maka ọgụgụ isi ya. N’ihi gịnị?

N’ihi na ụmụ ụwa nke a, na-agba mbọ n’ihe ụwa nke a, karịa ka ụmụ nke ihe, si agba mbọ n’ihe ụwa nke ọzọ. “Ana m agwa ụnụ: ‘Werenụ akụ na ụba rụrụ arụ nke ụwa a, nwetara onwe ụnụ ndị enyi; ka ọ ga-abụ, mgbe ọ bụla akụ nke ụwa aga-agwụ, e wee kpọbata ụnụ n’ụlọ obibi nke dị ebighị ebi.]

Onye ọ bụla e nwere ike ịtụkwasị obi n’ihe ntakịrị, e nwekwara ike ịtụkwasị ya obi n’ihe buru ibu. Onye ọ bụla na-ekwesịghị ntụkwasị obi n’ihe ntakịrị, ekwesịghịkwa ntụkwasị obi n’ihe buru ibu.

“Ọ bụrụ na i kwesịghị ntụkwasị obi n’akụ na ụba nke ụwa a rụrụ arụ, kedụ ka ị ga-esi kwesị ntụkwasị obi na nke ahụ bụ ezi akụ na ụba? Ọ bụrụ na i kwesịghị ntụkwasị obi n’ihe na-abụghị nke gị, kedụ ka a ga-esi tụkwasị gị obi n’ihe bụ nke aka gị?

Odibo anaghị abụ ohu nna ukwu abụọ. Ma ọ bụghị na ọ kpọrọ nke mbụ asị, hụ nke abụọ n’anya; ọ bụrụ na ọ na-asọpụrụ nke mbụ, ji nke abụọ na-akpa ọchị. Ụnụ enweghị ike ịbụ ohu Chineke na ohu ego.”

Igbo Mass Readings for September 22 2025, Mọnde Izuụka nke Iri Abụọ na Ise N’Oge Na-Adanyeghị N’Emume

Igbo Mass Readings for September 21 2025, Ụka nke Iri Abụọ na Ise n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Atọ.