Igbo Mass Readings for October 17 2027, Ụka nke Iri Abụọ na Itoolu n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for October 17 2027, Ụka nke Iri Abụọ na Itoolu n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 53:10-11
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Onye Amụma Aịzaya
Isi Okwu: Ọ ga-enwe ogologo ndụ
Ma ọ sọrọ Onyenweanyị iji ahụhụ gwerie Ya. Ọ bụrụ na O jiri ndụ Ya chụọ aja mmeda obi, Ọ ga-ahụ ndị ga-eri Ya ekpe. Ọ ga-enwe ogologo ndụ. A ga-esikwa n’aka Ya mezuo ihe Onyenweanyị chọrọ.
Mgbe Ọ pụtara na ndụ ahụhụ Ya, Ọ ga-ahụ ihe; bịakwa ñụrịa ọñụ ọzọ. Site n’ahụhụ Ya, nwodibo M ga-eme ka a gụnye ọtụtụ mmadụ na ndị ezi omume, bịakwa bokwasa onwe Ya mmehie ha.
ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 32:4-5, 18-20, 22. Az, 22
Azịza: Onyenweanyị, ka ebere Gị nọnyere anyị, ebe anyị tụkwasara obi anyị niile na Gị
1. Okwu Onyenweanyị ziri ezi.
Ọrụ Ya niile kwesịrị ntụkwasa obi.
Ihe ọ chọrọ bụ ezi omume na ikpe nkwụmọtọ.
Ụwa jupụtara n’obi ọma nke Onyenweanyị.
Azịza: Onyenweanyị, ka ebere Gị nọnyere anyị, ebe anyị tụkwasara obi anyị niile na Gị
2. Ị hụla, anya Onyenweanyị wụkwasara na ndị na-atụrụ Ya egwu,
na ndị tụkwasara obi n’amara Ya.
Ka Ọ zọpụta ha na njọ,
bịakwa na-echekwaba ha n’ụkọ nri.
Azịza: Onyenweanyị, ka ebere Gị nọnyere anyị, ebe anyị tụkwasara obi anyị niile na Gị
3. Obi anyị na-eche Onyenweanyị.
Ọ bụ enyemaka anyị na mgbodo anyị.
Onyenweanyị, mee ka amara Gị dakwasa anyị,
ebe ọ bụ na anyị tụkwasara obi anyị niile na Gị.
Azịza: Onyenweanyị, ka ebere Gị nọnyere anyị, ebe anyị tụkwasara obi anyị niile na Gị
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 4:14-16
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi e degaara Ndị Hibru
Isi Okwu: Ka anyị jidesienụ nkwupụta anyị ike
Ebe ọ bụ na, n’ime Kristi, Nwa Chineke, anyị nwere Nnukwu Ụkọchukwu bụ E kwucha Ọ gwụ; Onye gazurula eluigwe kacha eluigwe, anyị enweghị ike ịhapụ aka n’okwukwe ahụ e ji mara anyị.
N’ihi na ọ dịghị ka a ga-asị, na anyị nwere nnukwu ụkọchukwu na-enweghị ike iso anyị anụ ụfụ adịghị ike anyị. Kama, Onye anyị nwere bụ Onye e leghara elegha n’ụdị niile e ji elegha anyị, bịakwa hụ na O bughị njọ.
N’ihi ya, ka anyị werenụ obisike bịaruo n’oche eze nke amara, ka anyị wee nweta ebere n’aka Ya, bịakwa chọta amara mgbe anyị nọ na mkpa.
MBEKU – Ọrụ Ndị Ozi 16.14
Aleluya, aleluya!
Ka Nna Onyenweanyị Jesu Kristi tinye ihè n’anya nke obi anyị, ka anyị wee hụ ka erire dị n’oku ahụ a kpọrọ anyị si buo ibu.
Aleluya!
OZIỌMA – 10:35-45 maọbụ 10:42-45
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere
Isi Okwu: Nwa nke mmadụ bịara i were ndụ ya nye iji gbapụta ọtụtụ mmadụ.
Ụmụ Zebedi bụ Jemis na Jọn, bịakwutere Jesu sị Ya: Nna anyị ukwu, e nwere otu amara anyị na-arịọ ka I meere anyị.” Jesu wee jụọ ha sị: “Gịnị ka ụnụ chọrọ ka M meere ụnụ?”
Ha sị Ya: “Biko mee ka otu n’ime anyị nọdụ n’aka nri Gị; ka nke ọzọ nọdụ n’aka ekpe Gị, mgbe Ị ga-abanye n’ebube Gị.” Ma Jesu sịrị ha: “Ụnụ amaghị ihe ụnụ na-arịọ M.
Ụnụ nwere ike ịñụ iko ahụ M ga-añụ? Ma ọ bụ nata ụdị mmirichukwu ahụ M ga-anata?” Ha zara Ya: “Anyị nwere ike”. Jesu sịrị ha: “Iko ahụ M ga-añụ, ka ụnụ ga-añụ.
Ụdị mmirichukwu ahụ M ga-anata, ka ụnụ ga-anata. Ma, ịnọ M n’aka nri, ma ọ bụ n’aka ekpe, ọ bụghị M ka ọ dịịrị inye nke ahụ. Oke ahụ dịịrị ndị e debeere ya”.
Mgbe Ụmụazụ iri ndị ọzọ nụrụ ihe a, ha busoro Jemis na Jọn iro. Jesu bịara kpọkọta ha ọnụ sị ha: “Dị ka ụnụ onwe ụnụ maara, ndị eze ụwa a, na ndị a maara aha ha, na-eji aka ike achị ndị nọ n’okpuru ha.
Ma n’etiti onwe ụnụ ọ gaghị esi otu a dịrị. Kama ọ bụrụ na onye ọ bụla achọọ ịbụ onye ukwu, ọ ga-ebu ụzọ bụrụ onye na-ejere ụnụ ozi, Onye ọ bụla kwa chọrọ ịbụ onye mbụ ga-abụ odibo na ohu ụnụ niile.
N’ihi na Nwa nke Mmadụ abịaghị ka a gbaara Ya odibo; kama Ọ bịara ịgbara ndị ọzọ odibo, ya na iwere ndụ Ya nye iji gbapụta ọtụtụ mmadụ.
Igbo Mass Readings for October 18 2027, Emume Ncheta Luke dị Asọ
Igbo Mass Readings for October 17 2027, Ụka nke Iri Abụọ na Itoolu n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ.