Igbo Mass Readings for August 23 2026, Ụka nke Iri Abụọ na otu n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Mbụ.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for August 23 2026, Ụka nke Iri Abụọ na otu n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Mbụ.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 22:19-23
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Onye Amụma Aịzaya
Isi Okwu: Aga M atụkwasa mkpịsị igodo nke obi Devid n’ubu gị.
Lee ihe Onyenweanyị Chineke nke igwe ndị agha gwara Shebna, onye ahụ ji oke ọkwa nke ichedo obi eze: “Aga M akwatu gị na nnukwu ọkwa gị, bịakwa site n’ọnọdụ gị dị elu, kpụda gị n’ala. “N’ụbọchị ahụ, aga M akpọta nwodibo M bụ Eliakim nwa Hilkia.
Aga M eyikwasị ya uwe nru ala gị, kekwasịkwa ya ihe ike n’ukwu. Aga m ewere ike ọchịchị ahụ i nwere na mbụ nyefee ya n’aka. Ọ ga-abụ nna ndị niile bi na Jerusalem, na ndị niile bi n’ụlọ Juda.
Aga M ewere igodo na ọtụghe ọnụ ụzọ nke ụlọ Devid tụkwasa ya n’ubu. Ọnụ ụzọ ọ bụla ọ gbaghere, o nweghị onye ọ bụla pụrụ ịgbachi ya. Ọnụ ụzọ ọ bụla ọ gbachiri, nweghị onye ọ bụla pụrụ ịgbaghe ya.
Aga M eme ka ọ ghọọ ntu a kpọgidesiri ike n’ebe siri ike; n’ebe ọ na-aghaghị ekwe nfopụ. Ka ọ ghọọ ebe nwere ugwu n’ezi na ụlọ ya.”
ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 137:1-3, 6, 8 Az. 8
Azịza: Onyenweanyị, ịhụnanya Gị dị ebighị èbi. A jụkwala ọrụ aka Gị.
1. Onyenweanyị, aga m eji obi m niile ekele Gị,
N’ihi na Ị nụla okwu si m n’ọnụ.
Aga m ekwe ukwe otito Gị n’ihu ndị mmụọma.
Aga m efe Gị n’ụlọ nsọ Gị.
Azịza: Onyenweanyị, ịhụnanya Gị dị ebighị èbi. A jụkwala ọrụ aka Gị.
2. Aga m ekele aha Gị, n’ihi obi ọma na eziokwu Gị.
Mgbe m kpọrọ Gị oku, Ị zara m.
Ị gbara m ume.
Azịza: Onyenweanyị, ịhụnanya Gị dị ebighị èbi. A jụkwala ọrụ aka Gị.
3. Onyenweanyị dị n’ebe kacha elu,
ma Ọ na-ahụ ndị e ji n’ala.
Ọ nọ n’ebe dị anya na-ele ndị nganga.
Onyenweanyị, obi ọma Gị na-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.
A jụkwala ọrụ aka Gị.
Azịza: Onyenweanyị, ịhụnanya Gị dị ebighị èbi. A jụkwala ọrụ aka Gị.
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 11:33-36
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Pọl dị asọ degaara ndị Rom
Isi Okwu: Ihe niile siri na Ya pụta. Ọ bụ Ya mere ihe niile. Ihe niile si Ya n’aka.
Akụ na ụba dị n’ime Chineke adịka omimi! Amamihe na mmụta Ya ebuka! Ịchọpụta ihe O bu n’obi, na ịghọta usoro O ji eme ihe akarịka mmadụ! Onye nwere ike ịkọwa ihe Onyenweanyị bu n’obi?
Onye nwere ike ịbụ onye na-adụ Ya ọdụ? Onye nwere ike inye Ya ihe Ọ na-enweghị, ma ọ bụ binye Ya ihe ọ bụla? Ihe niile dị adị si na Ya dịrị. Ọ bụ Ya kere ihe niile maka onwe Ya. Ka otito niile dịrị Ya ebighị ebi, ebighị ebi! Amen.
MBEKU – Jọn 14:5
Aleluya, aleluya!
Onyenweanyị kwuru sị: “Abụ M ụzọ, eziokwu na ndụ. O nweghị onye ọ bụla na-abịakwute Nna, e wepụ ma o si n’aka M.
Aleluya.
OZIỌMA – 16:13-20
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Isi Okwu: Ị bụ Pita. Aga M enye gị mkpịsị igodo alaeze eluigwe.
Mgbe Jesu rutere n’ọnụmara Sizarịa Filipi, Ọ jụrụ Ụmụazụ Ya sị: “Onye ka ndị mmadụ na-asị na Nwa nke Mmadụ bụ?” Ha zara sị Ya: “Ụfọdụ na-ekwu na ị bụ Jọn onye ome mmirichukwu.
Ụfọdụ na-ekwu na ị bụ Ilaija; ndị ọzọ na-ekwu na ị bu Jeremaya, ma ọ bụ otu n’ime ndị amuụma mgbe ochie.” Ma Jesu jụrụ ha sị: “Ụnụ onwe ụnụ, onye ka ụnụ na-eche na Mụ onwe M bụ?”
Saịmọn Pita zara sị: “Ị bụ Kristi ahụ, Ị bụ Nwa Chineke dị ndụ.” Jesu zara ya sị: “Ngọzi dịrị gị, Saịmọn, nwa Jona! N’ihi na ọ bụghị mmadụ nkịtị kpugheere gị eziokwu nke a, kama ọ bụ Nna M nọ n’eluigwe.
Ugbu a, ana M agwa gị, Ị bụ Pita, N’elu nkume a ka M ga-ewukwasị Nzukọ M. Ọnụ-ụzọ ọkụ mmụọ enweghị ike imeri ya. Aga M achịnye gị mkpịsị-igodo alaeze eluigwe.
Ihe ọ bụla i kechiri n’elu ụwa, a ga-agụnye ya n’ihe e kechiri ekechi n’eluigwe. Ihe ọ bụla i keghapụrụ n’elu ụwa, a ga-agụnye ya n’ihe e keghapụrụ ekeghapụ n’eluigwe.” Mgbe ahụ, Jesu dọrọ Ụmụazụ Ya aka na ntị, dọsiekwa ha ike, ka ha ghara ịgwa onye ọ bụla na Ya onwe Ya bụ Kristi ahụ.
Igbo Mass Readings for August 24 2026, Emume Ncheta Bartholomew dị Asọ – Nwaazụ.
Igbo Mass Readings for August 23 2026, Ụka nke Iri Abụọ na otu n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Mbụ.