Igbo Mass Readings for August 16 2026, Ụka nke Iri Abụọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Mbụ.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for August 16 2026, Ụka nke Iri Abụọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Mbụ.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 56:1, 6-7

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ onye Amụma Aịzaya

Isi Okwu: Aga M akpọta ndị mba ọzọ n’ugwu nsọ M.

Lee ihe Onyenweanyị kwuru: Mewe ihe ọma. Kwụba aka Gị ọtọ, n’ihi na mgbapụta abịala nso. O ruola mgbe M ga-egosi ikpe nkwụmọtọ M. Ndị Mba ọzọ ahụ rapaara n’ahụ Onyenweanyị wee na-efe Ya; ndị hụrụ aha Onyenweanyị n’anya wee ghọọ ụmụodibo Ya; ndị na-ewepụ aka n’imerụ ụbọchị izuike, bịakwa jidesie aka ike n’ọgbụgba ndụ M; ọ bụ ndị a ka m ga-akpọlite n’ugwu nsọ M, bịakwa mee ka ọñụ ju ha obi n’ụlọ ekpere M. A ga-anabata aja nsure ọkụ na aja ọ bụla ha chụrụ n’ebe nchụaja M. N’ihi na a ga-akpọ ụlọ M ụlọ ekpere maka mmadụ niile.

ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 66:2-3,5-6 Az. 4

Azịza: Ka mba niile too Gị, O Chineke; Ka mba niile too Gị.

1. Ka Chineke meere anyị ebere, gọzie anyị.

Ya mere ka ihu Ya chakwasa anyị ka e wee mata ụzọ Gị n’ụwa.

Ka mba niile wee mara mgbapụta Gị.

Azịza: Ka mba niile too Gị, O Chineke; Ka mba niile too Gị.

2. Ka obodo niile wulite elu n’ọñụ,

bịakwa nwee obi añụrị.

N’ihi na Ị kwụbara aka ọtọ wee na-achị mba niile.

Ọ bụ Gị na-eduzi mba niile dị n’ụwa.

Azịza: Ka mba niile too Gị, O Chineke; Ka mba niile too Gị.

3. Chineke m, ka mmadụ niile too Gị.

Ka mmadụ niile too Gị.

Ka Chineke gọzie anyị.

Ka akụkụ ụwa niile sọpụwara Ya.

Azịza: Ka mba niile too Gị, O Chineke; Ka mba niile too Gị.

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 11:13-15, 29-32

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Pọl dị asọ degaara Ndị Rom

Isi Okwu: A bịa n’ihe gbasara Izrel, o nweghị mgbe Chineke ga-ahapụ imezu nkwa O kwere.

Ụnụ bụ ndị mba ọzọ ka m na-agwa okwu a: Ebe mụ onwe m bụ onye ozi nke ndị mba ọzọ, ana m eji ọrụ ije ozi e kenyere m akpa nganga. N’ihi na e nwere m olileanya na, ma eleghị anya, apụrụ m isite n’ụzọ a kpasuo ekworo ụfọdụ ndị Juu, ka e site n’ekworo ha zọpụta ụfọdụ n’ime ha.

N’ihi na, ọ bụrụ na ọjụjụ a jụrụ ha mere ka Chineke na ụwa dịkwa na mma ọzọ, mkpọbata ha ọ ga-adị añaa? Ọ ga-adị ka isi na ndị nwụrụ anwụ enweta ndụ ọzọ!

Amara Chineke nyere na oku Ọ kpọrọ enweghị ike ịlaghachi azụ. Ya nye mmadụ onyinye ma ọ bụ họrọ mmadụ, ọ dịghị eme Ya nchegha. Dịka ụnụ onwe ụnụ, ndị mba ọzọ, si gbanwoo, ghara ịbụzi ndị na-enupụrụ Chineke isi; bịakwa n’oge ugbu a, bụrụ ndị na-eri uru amara, n’ihi inupu isi nke ndị Juu.

E mechaa, otu ahụ kwa ka ndị a na-enupụ isi n’oge ugbu a, sọsọ n’ihi amara e meere ụnụ, ga-esi erite uru amara. Chineke tụrụ mmadụ niile mkpọrọ n’ime ekweghị ekwe ha, ka O wee meere ha niile ebere.

MBEKU – Jọn 1, 12: 14

Aleluya, aleluya!

Okwu Chineke ghọrọ mmadụ wee binyere anyị. O nyere ndị niile nabatara Ya ike ịghọ ụmụ Chineke.

Aleluya!

OZIỌMA – 15:21-28

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Isi Okwu: Nwanyị, okwukwe gị ebuka!

Jesu hapụrụ Genesaret gaa n’ebe ọzọ dị obodo Taịa na Saịdọn nso. N’ebe ahụ, Otu nwanyị Onye Kena bi n’obodo ahụ bịakwutere Jesu rịọ ya sị, “Onyenwe m, nwa Devid, biko meere m ebere.

Ada m nwanyị nwere ajọ mmụọ n’ime ya nke na-esogbu ya oge niile.” Ma Jesu egheghị nwanyị ahụ ọnụ. Ọ gbara ya nkịtị. E mesịa ndị Ụmụazụ Ya bịakwutere ya rịọ ya sị ya, “Chụlaa nwanyị a!

Lee ka O si esogharị anyị na-enye anyị nsogbu site n’arịrịọ ya!” Jesu sịrị nwanyị ahụ, “Ezitere m naanị inyere ndị Juu aka, ndị bụ atụrụ furu efu nke Izrel.”

Ma nwanyị a bịara daa n’ụkwụ Jesu rịọ ya arịrịọ sị ya, “Onyenwe m, nyere m aka!” Jesu zara sị ya, “O zighị ezi na a ga-ewere nri ụmụntakịrị tụpụrụ nkịta.” Nwanyị ahụ zara ya sị, “Ọ bụ eziokwu Onyenwe m.

Ma a na-ekwekwa ka ụmụ nkịta nọ n’okpuru Oche nri rie irighịri nri nke na-esi n’elu Oche nri ahụ daa n’ala.” Jesu zara sị ya, “Nwanyị, Okwukwe gị dị ukwuu! Laa, e meerala gị ihe ị na-arịọ.” N’otu oge ahụ a gwọrọ ada ya.

Igbo Mass Readings for August 17 2026, Mọnde Izuụka nke Iri Abụọ N’Oge Na-Adanyeghị N’Emume

Igbo Mass Readings for August 16 2026, Ụka nke Iri Abụọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Mbụ.