Igbo Mass Readings for November 12 2028, Ụka nke Iri Atọ na abụọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Atọ.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for November 12 2028, Ụka nke Iri Atọ na abụọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Atọ.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 7:1-2.9-14
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Abụọ nke Makabiz
Isi Okwu: Eze nke ụwa ga-akpọlite anyị na ndụ ebighị ebi.
E nwere ụmụnne asaa e jidere ha na nne ha. Eze ji ntamahụhụ nke ịpịa ụtalị na oke imesi ike na- akwanye ha ka ha rie anụ ezi, nke iwu mabidoro ha irinụ.
Otu n’ime ha, dịka onye na-ekwuchitere ha niile, kwuo sị: “Kedụ ihe ị na-agba mbọ ịchọpụta n’aka anyị? Anyị dị njikere ịnwụ ọnwụ karịa imebi iwu nke nna anyị ha.”
Mgbe nwanne ya nke abụọ na-ekubi ume ikpeazụ, o kwuo sị: “Ekwensu na-enweghị akọ na uche, i nwere ike gbuo anyị n’ụwa nke a, ma Eze nke ụwa ga-ekulite anyị na ndụ ebighị ebi, ebe anyị na-anwụ n’ihi Iwu Ya, ka anyị wee dịkwa ndụ ọzọ ebighị ebi.”
Mgbe onye nke a nwụrụ, ha were onye nke atọ na-eme ihe ọchị. Mgbe ha chọrọ ire ya, o wepụtara ya ọsọsọ, were obi siri ike setịa aka ya, bịa were nchekwube juru afọ kwuo sị: “Ọ bụ eluigwe nyere m ihe ndị a.
N’ihi iwu Chineke, ajụla m ha, n’ihi na enwere m nchekwube na aga m enwetakwa ha ọzọ n’aka Chineke.” Ọ tụrụ onye eze na ndị ụmụ odibo ya n’anya nke ukwuu, oge ha hụrụ obi siri ike na atụghị egwu ahụhụ ọ bụla nke nwa okorobịa ahụ.
Ka onye nke a nwụrụ, ha takwara onye nke anọ nnukwu ahụhụ n’otu aka ahụ. Oge ọ na-anwụ, o were kwuo sị: “Anyị eketala oke ka mma n’ịnara ọnwụ n’aka ndị mmadụ, ma anyị nwere nchekwube n’ebe Chineke nọ, na Ọ ga-ekulite anyị na ndụ ọzọ. Ma n’ebe ụnụ nọ, ụnụ agaghị enwe mbilite n’ọnwụ na ndụ ọhụrụ.’
ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 16:1. 5-6. 8. 15. Az. 15
Azịza: Onyenweanyị, aga m enwe afọ ojuju mgbe a ga-egosi ebube Gị.
1. Onyenweanyị, nụrụ ihe bụ ezi omume m.
Gee ntị na mkpu akwa m.
Chee ntị nụrụ arịrịọ m.
Aghụghọ ọ bụla anọghị n’egbugbere ọnụ m.
Azịza: Onyenweanyị, aga m enwe afọ ojuju mgbe a ga-egosi ebube Gị.
2. Nzọ ụkwụ m nọsiri ike n’okporo ụzọ Gị;
ka ụkwụ m ghara ịgahie ụzọ.
Chineke, ana m akpọku Gị n’ihi na Ị na-aza oku m.
Tụgharịa chee m ntị, nụrụ arịrịọ m.
Azịza: Onyenweanyị, aga m enwe afọ ojuju mgbe a ga-egosi ebube Gị.
3. Zobe m n’okpuru ndo nku Gị.
N’ezi omume m ka m ga-ahụ Gị.
Aga m enwe añụrị mgbe m tetara hụ ihu ebube Gị.
Azịza: Onyenweanyị, aga m enwe afọ ojuju mgbe a ga-egosi ebube Gị.
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 2:16-3:5
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi nke Abụọ Pọl dị asọ degaara Ndị Tesalonịka
Isi Okwu: Ka Chineke mee ka ụnụ guzosie ike n’ọrụ ọma na n’okwu ọma niile.
Ka Onyenweanyị Jesu Kristi n’onwe Ya, na Chineke Nna anyị, Onye nyere anyị ịhụnanya Ya, bịakwa site n’amara Ya, nye anyị nkasiobi na nchekwube ebighị ebi.
Ka Chineke Nna na Onyenweanyị Jesu Kristi kasie ụnụ obi, bịakwa nye ụnụ mgbasike n’ihe ọma niile ụnụ na-eme, ma ọ bụ nke ụnụ na-ekwu. Ụmụnna m, na nke ikpeazụ, kpesiekwaranụ anyị ekpere ike.
Na-arịọnụ ka ozi nke Onyenweanyị gbasaa ọsọsọ; ka e were nsọpụrụ na ugwu nabata ya n’etiti ụnụ. Na-ekpenụ ekpere ka a zọpụta anyị n’aka ndị ajọ mmadụ, n’ihi na ọ bụghị onye ọ bụla ka e nyere onyinye nke okwukwe.
Kama ọ bụ Onyenweanyị ji okwukwe. Ọ ga-enye ụnụ mgbasike, bịakwa chekwaba ụnụ n’aka onye ọjọọ ahụ. N’ime Onyenweanyị, anyị nwere obisike na ụnụ na-eme; na ụnụ ga na-emekwa ihe anyị gwara ụnụ mee. Ka Onyenweanyị tụgharịa obi ụnụ, ka o chee ihu n’ịhụnanya Chineke, na obisike nke Kristi.
MBEKU – Mkpughe 1:5-6
Aleluya, aleluya!
Jesu Kristi bụ Onye mbụ a mụrụ n’etiti ndị nwụrụ anwụ. Ka otito na ọchịchị dịrị Ya ebighị ebi.
Aleluya!
OZIỌMA – 20:27-38
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Isi Okwu: Ọ bụghị Chineke nke ndị nwụrụ anwụ, kama ọ bụ nke ndị dị ndụ.
Ụfọdụ ndị Sadusii – ndị ahụ na-ekweghị na e nwere mbilite n’ọnwụ – bịakwutere Jesu, jụọ Ya ajụjụ sị: “Onye Nkuzi, Mosis deere anyị n’akwụkwọ; na onye nwanne ya lụrụ nwanyị, nwụọ n’amụtaghị nwa, ya kuchie nwunye nwanne ya ahụ, ka ọ mụtara nwanne ya nwụrụ anwụ ụmụ.
“Ugbu a, e nwere ụmụnne nwoke asaa. Nke diọkpara lụrụ nwanyị, nwụọ n’amụtaghị nwa. Nke abụọ a kuchie nwunye nwanne ya, bịakwa nwụọ n’amụtaghị nwa; nke atọ kwa.
Otu-ihe ahụ mere ụmụnne asaa ahụ; ha niile nwụrụ n’amụtaghị nwa. N’ikpeazụ, nwanyị ahụ bịakwara nwụọ. Ugbu a, na Mbilite n’ọnwụ, nwunye onye ka ọ ga-abụ, ebe ọ bụ na ha asaa lụchara ya ka nwunye?”
Jesu zara ha: “Ụmụ nke ụwa a na-alụ di, na-alụ nwunye. Ma ndị e kpebiri na ha tozuru oke inwe ọnọdụ n’ụwa ọzọ na Mbilite n’ọnwụ, anaghị alụ di, nke ha na-alụ nwunye.
N’ihi na ha enweghị ike ịnwụ anwụ; ha dị ka ndị mmụọma, ebe ha bụ ụmụ nke mbilite n’ọnwụ. Ha bụ ụmụ Chineke. Mosis n’onwe ya rụtụrụ aka na ndị nwụrụ anwụ na-ebilite; ebe ahụ o dere maka ọhịa na-agba ọkụ, ọ kpọrọ Onyenweanyị ‘Chineke nke Ebreham, Chineke nke Aịzik, na Chineke nke Jekọp’. Ugbu a, Ọ bụ Chineke ndị dị ndụ, Ọ bụghị nke ndị nwụrụ anwụ. Maka na mmadụ niile dị ndụ n’ezie n’ihu Ya.”
Igbo Mass Readings for November 13 2028, Mọnde Izuụka nke Iri Atọ na Abụọ N’Oge Na-Adanyeghị N’Emume
Igbo Mass Readings for November 12 2028, Ụka nke Iri Atọ na abụọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Atọ.