Igbo Mass Readings for November 14 2027, Ụka nke Iri Atọ na atọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for November 14 2027, Ụka nke Iri Atọ na atọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 12:1-3

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ onye amụma Daniel

Isi Okwu: N’oge ahụ a ga-anapụta ndị aha ha dị n’akwụkwọ

N’oge ahụ, nnukwu nwa eze bụ Maịkel ga-ekulite. Ọ bụ ya na-eche ndị nke Gị nche. Ahụhụ ga-adị mgbe ahụ ga-abụ ụdị nke anya na-ahụbeghị mbụ kemgbe ụwa bidoro.

N’oge ahụ, ndị nke a ga-anapụta bụ sọ ndị a chọpụtara ebe e dere aha ha n’akwụkwọ ahụ. Ọtụtụ n’ime ndị na-arahụ ụra na ntụ nke ala ga-eteta n’ụra.

Ụfọdụ ga-ebi ndụ ebighị ebi. Ndị ọzọ ga-abụ ihe a na-asọ oyi na ihe nkọcha ruo mgbe ebighị ebi. Ma ndị nwere uche ga na-enwu ọcha ka mbara igwe. Ndị kpọbatara ọtụtụ mmadụ n’ezi omume ga na-amụkesị ka kpakpando ruo mgbe ebighị ebi.

ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 15:5, 8-11. Az. 1

Azịza: Chekwaba m, O Chineke, N’ihi na-abịara m ka m zere ndụ n’ime Gị.

1. Onyenweanyị Ị bụ oke m ketara na iko m.

Ọ bụ gị ga-ejidere m oke ruuru m.

Eguzobere m Onyenweanyị n’ihu m mgbe niile.

Ebe ọ bụ na Ọ nọ m n’aka nri,

ụkwụ siri m ike n’ala.

Azịza: Chekwaba m, O Chineke, N’ihi na-abịara m ka m zere ndụ n’ime Gị.

2. N’ihi ya, obi dị m ụtọ.

Mmụọ m na-añụrị ọñụ.

Ahụ m sokwa nwee ume na obi iru ala.

N’ihi na Ị gaghị ahapụ m n’ala mmụọ;

Ị gakwaghị ekwe ka onye kwere na Gị ree ure.

Azịza: Chekwaba m, O Chineke, N’ihi na-abịara m ka m zere ndụ n’ime Gị.

3. Ị ga-egosi m okporo ụzọ nke ndụ na añụrị zuru oke n’ihu Gị,

tinyekwuoro ihe ọma juru Gị n’aka nri ruo mgbe ebighị ebi.

Azịza: Chekwaba m, O Chineke, N’ihi na-abịara m ka m zere ndụ n’ime Gị.

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 10:11-14, 18

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi e degaara Ndị Hibru

Isi Okwu: O jiri sọ otu aja ọ chụrụ naanị otu mgbe, nweta izuoke dị ebighị ebi.

N’agba ochie, ndị nchụaja niile guzoro n’ọrụ ha kwa ụbọchị. Ha chụpụ otu aja ahụ na-enweghị ike ibupụ mmehie, ha chụgharịkwaa ya ọzọ. Ma n’aka nke Kristi, Ọ chụrụ sọ otu aja maka mmehie, wee were ọnọdụ Ya mgbe ebighị ebi n’aka nri Chineke.

Ebe ahụ ka Ọ na-eche ka ndị iro Ya ghọọrọ Ya ihe mgbakwasị ụkwụ. O jiri sọ otu aja ahụ Ọ chụrụ naanị otu mgbe, nweta izuoke dị ebighị ebi maka ndị niile O doro nsọ. Ọ bụrụ na a gbagharala mmehie niile, ọ pụtara na e nwekwaghị ike ịchụ aja e ji ebupụ mmehie.

MBEKU – Matiu. 24:42.44

Aleluya, aleluya!

Na-echenụ nche; dịnụ nkwadebe. Ụnụ amaghị mgbe Nwa nke Mmadụ ga-abịa.

Aleluya!

OZIỌMA – 13:24-32

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere

Isi Okwu: Ọ ga-esi n’akụkụ anọ nke ụwa kpọkọ ndị ọ họtara.

Jesu gwara Ụmụazụ Ya: “Ma mgbe oge mkpagbu ahụ gasịrị, anyanwụ ga-agbanwo ghọọ ọchịchịrị. Ọnwa agaghị enyekwa ihè ya ọzọ. Kpakpando ga-esi n’igwe na-adasịsị.

Ike dị n’eluigwe ga-emetụ ụñara.” “Mgbe ahụ ka a ga-ahụ Nwa nke Mmadụ ka O si n’urukpu nke igwe, were oke ike na ebube na-abịa. Na mgbe ahụ, Ọ ga-ezipụ ndị mmụọ ozi Ya ka ha si n’akụkụ anọ nke ụwa, kpọkọtara Ya ndị Ọ họtara ahọta; site n’ebe ala na mbara igwe bidoro ruo n’ebe ha kwụsịrị.

“Werenụ osisi fig mụta ihe. Mgbe ọ bụla ngalaba ya malitere ịwapụta ome dị nrọ, na-epupụtakwa akwụkwọ ndụ, ụnụ maara na ọkọchị dị nso. Otu aka ahụ kwa, mgbe ọ bụla ụnụ hụrụ ka ihe ndị a na-emezu, maranụ na Nwa nke Mmadụ nọ nso; na ọ bịaruolarị n’ọnụ ụzọ.

N’ikwu eziokwu, ọgbọ dị taa agaghị agafe tupu ihe ndị a niile emezuo. Eluigwe na ụwa ga-agabiga, ma okwu M anaghị agafe agafe ma ọlị. A sị kọwa mgbe oge ahụ ga-abụ, mmadụ ọ bụla enweghị ike ịkọta ya. Ndị mmụọma bi n’igwe amaghị mgbe ọ bụ, Nwa nke Mmadụ n’onwe Ya amaghị mgbe ọ ga-abụ. Sọ Chineke Nna ga-akọ mgbe ọ ga-abụ.

Igbo Mass Readings for November 15 2027, Mọnde Izuụka nke Iri Atọ na Atọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume

Igbo Mass Readings for November 14 2027, Ụka nke Iri Atọ na atọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ.