Igbo Mass Readings for November 16 2025, Ụka nke Iri Atọ na atọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Atọ.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for November 16 2025, Ụka nke Iri Atọ na atọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Atọ.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 3:19-20

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ onye amụma Malaki

Isi Okwu: Anyanwụ nke Eziomume ga-achawapụtara gị

Lee, oge na-abịa mgbe ndị nganga na ndị ajọ omume ga-erepịa dị ka ha bụ igbugbọ ọka. Ụbọchị ahụ ga-ere ka oke ite ọkụ. Ụbọchị ahụ na-abịanụ ga-erepịa ha, n’ahapụghịrị ha ngalaba ma ọ bụ mgbọrọgwụ.

Ọ bụ Dinwenụ nke igwe ndị agha kwuru ihe a. Ma banyere ụnụ bụ ndị na-atụ egwu aha M, ka anyanwụ nke ezi omume ga-awara, Ọ ga-ewetakwara ụnụ ọgwụgwọ mgbe ọ na-amụkwasị ụnụ.

ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 97:5-9 Az. 9

Azịza: Dinwenụ na-abịa iji ịkwụba aka ọtọ na-achị mmadụ niile.

1. Werenụ ụbọ akwara na olu abụ dị mma kweere Dinwenụ ukwe ọma.

Jirinụ opi ike na-ada ụda kwee ukwe n’ihu Eze ahụ bụ Dinwenụ.

Azịza: Dinwenụ na-abịa iji ịkwụba aka ọtọ na-achị mmadụ niile.

2. Ka osimiri na ihe niile dị n’ime ya, bigboo;

ụwa na ndị niile dị na ya.

Ka mmiri niile kụọ aka ha.

Ugwu nta niile ekwupụtakwa añụrị ha,

n’ihu nke Dinwenụ.

Azịza: Dinwenụ na-abịa iji ịkwụba aka ọtọ na-achị mmadụ niile.

3. N’ihi na Dinwenụ na-abịa ịchị ụwa.

Ọ ga-eji ịkwụba aka ọtọ na-achị ụwa;

jirikwa e leghị anya n’ihu na-achị ndị mmadụ.

Azịza: Dinwenụ na-abịa iji ịkwụba aka ọtọ na-achị mmadụ niile.

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 3:7-12

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Nke Abụọ Pọl dị asọ degaara ndị Tesalonịka

Isi Okwu: “E kwela ka onye ọ bụla jụrụ ịrụ ọrụ, rie nri.”

Ụnụ onwe ụnụ ma nke ọma ka o siri dị mkpa na ụnụ ga na-eme ihe otu anyị siri mee mgbe anyị nọ n’etiti ụnụ. Anyị ebighị ndụ aghara na umengwụ mgbe anyị nọ n’etiti ụnụ.

Anyị erighị nri onye ọ bụla n’akwụghị ụgwọ. Kama anyị rụsiri ọrụ ike, dọgbukwaa onwe anyị n’ọrụ abalị na ehihie, ka anyị ghara ịbụrụ onye ọ bụla n’ime ụnụ ibu arọ.

Ọ bụghị na anyị enweghị ike ịna ụnụ ihe oriri. Kama, anyị mere nke a ka anyị wee tọọrọ ụnụ ezi ụkpụrụ ụnụ ga na-eso. N’ihi na, ọ bụrụgodụ mgbe ahụ anyị na ụnụ nọ, anyị nyere ya ụnụ dịka iwu na: “Onye ọ bụla jụrụ ịrụ ọrụ, ya erikwala nri.”

Anyị nụrụ na ụfọdụ n’ime ụnụ na-ebi ndụ umengwụ. Ha bụ naanị ndị oriri, ndị anya tọrọ n’ihe onye ọzọ; ndị na-achọghịkwa ịrụ ọrụ ọ bụla. N’aha Onyenweanyị Jesu Kristi, anyị na-enye ndị dị otu a iwu, na-arịọkwa ha, ka ha jiri nwayọ hazie ndụ ha, mụta ịrụ ọrụ, ka ha wee kpata ihe ha ga-eri.

MBEKU – Luk. 21:36

Aleluya, aleluya!

Mụrụnụ anya, na-ekpenụ ekpere oge niile iji nweta ike iwere ntụkwasị obi guzoro n’ihu Nwa nke Mmadụ.

Aleluya!

OZIỌMA – 21:5-19

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere

Isi Okwu: Ntachi obi ụnụ ga-azọpụta ndụ ụnụ

Ụfọdụ na-akọ akụkọ otu e si were okwute dara oke ọnụ na onyinye ndị mmadụ jiri tụrụ Chineke mma mma chọọ Ụlọ Nsọ mma. Jesu wee sị ha: “Lee, ihe ndị a niile ụnụ na-ahụ, oge na-abịa, mgbe a na-agaghị ahapụ ọ bụna otu nkume n’elu ibe ya.

Ma a ga-akụdacha ha niile n’ala.” Ha bido jụọ sị: “Onye nkuzi, olee mgbe ihe ndị a ga-eme? Kedụ akara ga-egosi na ihe ndị a gaje ime?” Jesu wee sị ha: “Kpacharanụ anya ụnụ, ka mmadụ ọ bụla ghara iduhie ụnụ ụzọ.

N’ihi na ọtụtụ ga-abịa, were aha M na-agwa ndị mmadụ sị: “Abụ M Kristi ahụ; na-ekwukwa sị: Oge ọbịbịa Ya eruola. Ụnụ esokwala ha. Ọzọ kwa, mgbe ụnụ nụrụ na agha na-abịa, ma ọ bụ nụ maka ọgba aghara dị iche iche, ka ụjọ ghara ịtụ ụnụ.

N’ihi na ihe ndị a ga-ebu ụzọ mezuo. Ma ngwụcha ụwa erubeghị.” Jesu sịkwara ha: “Mba na mba ga-ebu agha. Eze na eze ga-ese okwu. A ga-enwe oke ala ọma jijiji na ụnwụ na ajọ ọrịa na-arịa ọha mmadụ n’ebe dị iche iche.

Akara dị egwu ga-apụta na mbara igwe; a bịakwa nwee ihe ịrịba ama. “Ma tupu ihe ndị a niile emezuo, ha ga-ejide ụnụ, butere ụnụ okwu na ụka. Ha ga-akpụta ụnụ n’ụlọ ekpere ma n’ụlọ mkpọrọ: bịakwa kpee ụnụ ikpe n’obi eze na n’ọgbọ ikpe ndị isi ala n’ihi aha M.

A ga-akpụta ụnụ ka ụnụ gbaara M akaebe. “Ihe M gwara ụnụ bụ: ‘kpebienụ n’onwe ụnụ tupu oge ahụ eruo na ụnụ agaghị echegbu onwe ụnụ maka ihe ụnụ ga-aza.

N’ihi na Mụ onwe M ga-enye ụnụ ọnụ okwu na amamihe, nke onye ọ bụla n’ime ndị na-emegide ụnụ na-agaghị enwe ike iguzogide, ma ọ bụ ịgbagha agbagha.

“Ọ bụna nne na nna, na ụmụnne ụnụ, na ikwu na ibe ụnụ, na ndị enyi ụnụ, ga-arara ụnụ nye. Ụfọdụ n’ime ụnụ ka a ga-egbu egbu. Mmadụ niile ga-akpọ ụnụ asị n’ihi M. Mana ọ gaghị efopụ ụnụ ọ bụna otu agịrị isi. Ọ bụ ndidi ka ụnụ ga-eji digbuo ihe ụwa; e wee zọpụta ndụ ụnụ.”

Igbo Mass Readings for November 17 2025, Mọnde Izuụka nke Iri Atọ na Atọ N’Oge Na-Adanyeghị N’Emume

Igbo Mass Readings for November 16 2025, Ụka nke Iri Atọ na atọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Atọ.