Igbo Mass Readings for October 31 2027, Ụka nke Iri Atọ na otu n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for October 31 2027, Ụka nke Iri Atọ na otu n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 6:2-6

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Diuterọnọmi

Isi Okwu: Izrel geenụ ntị: Ụnụ ga-eji obi ụnụ niile hụ Chineke n’anya.

Mosis gwara ndị mmadụ ahụ sị: “Ọ bụrụ na ụnụ na-atụrụ Onyenweanyị Chineke ụnụ egwu, bịakwa na-edebe iwu na atụmatụ niile ndị a m na-etiri ụnụ, ụbọchị niile nke ndụ ụnụ, ụnụ ga-enwe ogologo ndụ.

N’ihi nke a Izrel, tọọ ntị n’ala, kpachara anya mezuo ha. Ị ga-ebuwanye ibu bịakwa nwee agamnihu, dịka Onyenweanyị Chineke nna nna ụnụ ha siri kwe na nkwa: na Ọ ga-enye ụnụ ala mmiri ara na mmany añụ na-erugharị n’elu ya.

“Ụnụ bụ Izrel, geenụ ntị. Osebụrụwa Chineke anyị bụ naanị otu Onyenweanyị. N’ihi ya, ụnụ ga-eji obi ụnụ niile, na mmụọ ụnụ niile, na ike ụnụ niile hụ Ya n’anya. Kanyenụ okwu ndị a m na-agwa ụnụ taa n’obi ụnụ.

ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 17:2-4.47, 51 Az. 2

Azịza: Onyenweanyị, Ị bụ ike m, a hụrụ m gị n’anya.

1. Onyenweanyị na Ike m, a hụrụ m Gị n’anya.

Onyenweanyị, ike m, ụlọ nchedo m, na onye mgbapụta m.

Chineke m, Nkume m na-agbaga ọsọ ndụ,

mpi nzọpụta m, ụlọ m nọ akpa ike.

Mkpu m tiri bụ: Otito dịrị Onyenweanyị!

O nweghị ihe ọ bụla ndị iro nwere ike ime m.

Azịza: Onyenweanyị, Ị bụ ike m, a hụrụ m gị n’anya.

2. Ogologo ndụ dịrị Onyenweanyị!

Ọ bụ ya bụ Nkume m!

Otito na ebube dịrị Chineke onye nzọpụta m.

Ọ bụ Gị na-enye eze Gị nnukwu mmeri,

bịakwa na-egosi onye I tere mmanụ obi ọma Gị.

Azịza: Onyenweanyị, Ị bụ ike m, a hụrụ m gị n’anya.

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 7:23-28

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ ozi e degaara Ndị Hibru

Isi Okwu: N’ihi na ọ dị ebighi ebi, Kristi enweghị ike ịtụfu ike ịgba ụkọ nke ya.

N’usoro ọgbụgba ndụ ochie, e nwere ọtụtụ ndị ụkọchukwu, maka na ọnwụ gburu nke ọ bụla n’ime ha. Ma ebe ọ bụ na Ụkọchukwu nke a dị ndụ ebighị ebi, o nweghị ike ịtụfu ike ịgba ụkọ nke Ya.

Ihe ọ pụtara bụ na ike nzọpụta O nwere bụ nke kwụrụ chịm n’ụzọ Ọ bụla; ebe ọ bụ na Ọ dị ndụ ebighị ebi, bụrụ ọnụ na-ekwuru ndị niile, si n’aka ya na-abịakwute Chineke.

Ọ dị mkpa na Nnukwu Ụkọchukwu kwesịrị anyị ga-abụ onye dị nsọ, na-ebughị njọ ọ bụla na onye a na- emerụghị emerụ. Ọ ga-abụ Onye karịrị mmerụ nke ndị njọ na Onye e kugooro n’eluigwe; Onye ọ na-adịghị mkpa ịchụ aja, kwa ụbọchị, dịka ndị nnukwu ụkọchukwu ndị ọzọ si achụ, maka njọ ha na maka njọ ndị mmadụ; n’ihi na Kristi achụọla otu aja nke bụ a chụchaa ọ gwụ, site n’iwere onwe Ya chụọ ya bụ aja.

Ndị Iwu Mosis na-ahọpụta ka ha bụrụ ndị nnukwu ụkọchukwu bụ mmadụ, e ji n’agbụ nke adịghị ike mmadụ. Ma nkwa ahụ a ñụrụ iyi wee kwee, nke bịara mgbe e nyechara Iwu, họpụtara Nwa, Onye e mere ka O zuo oke ruo mgbe ebighị ebi.

MBEKU – 1 Sam. 3, 9; Jon 6, 68

Aleluya, aleluya!

Onyenweanyị, kwube na nwodibo Gị na-ege ntị. Ọ bụ Gị ji okwu nke ndụ ebighị ebi.

Aleluya!

OZIỌMA – 12:28-34

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere

Isi Okwu: Lee nke bụ iwu mbụ. Nke abụọ yiri ya.

Otu n’ime ndị Ode-Akwụkwọ bịara jụọ Jesu sị: “Olee nke bụ iwu mbụ n’ime iwu niile?” Jesu zara ya: “Lee nke bụ iwu mbụ: ‘Izrel, gee ntị! Ọ bụ Dinwenụ Chineke anyị bụ otu Onyenweanyị ahụ.

Ị ga-eji obi gị niile, na mmụọ gị niile, na uche gị niile, na ike gị niile hụ Dinwenụ Chineke anyị n’anya.’ Iwu nke abụọ bụ: ‘Ị ga-ahụ mmadụ ibe gị n’anya, otu i si hụ onwe gị n’anya’.

O nweghị iwu ọzọ karịrị ndị a.” Ode-Akwụkwọ ahụ sị Ya: “Nna m ukwu! I kwuru eziokwu! Na Ọ bụ sọ otu; ọ dịghị abụọ! Mmadụ iji obi ya niile, na nghọta ya niile, na ike ya niile hụ Chineke n’anya; bịakwa hụ mmadụ ibe ya n’anya, otu o si hụ onwe ya n’anya, karịrị aja nsure ọkụ niile, na onyinye ọchụchụ aja niile.”

Mgbe Jesu hụrụ ụdị amamihe o jiri kwuo okwu, Ọ sịrị ya: “Site n’ebe ị nọ ruo n’alaeze Chineke eteghị aka.” Site mgbe ahụ gawa, o nweghị onye ọzọ ụjọ kwere jụọ Jesu ajụjụ.

Igbo Mass Readings for November 1 2027, Nnukwu Emume Ncheta Ndị Nsọ Niile

Igbo Mass Readings for October 31 2027, Ụka nke Iri Atọ na otu n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ.