Igbo Mass Readings for November 5 2028, Ụka nke Iri Atọ na otu n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Atọ.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for November 5 2028, Ụka nke Iri Atọ na otu n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Atọ.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 11:22-12:2
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Amamihe
Isi Okwu: “Ị na-emere mmadụ niile ebere n’ihi na Ị hụrụ ihe niile n’anya”
Dinwenụ, n’anya Gị, ụwa niile ha ka otu mkpụrụ aja, nke na-adịghị anyị arọ. Ọ dịkwa ka otu mkpụrụ ijiriji ụtụtụ dasara n’ala. Mana Ị na-emere ihe niile ebere, maka na I nwere ike ime ihe niile.
Ị na-elefuru anya na njọ mmadụ, iji mee ka ha chegharịa. N’ezie, Ị hụrụ ihe niile dị ndụ n’anya. E nweghị ihe ọ bụla I kere, bụ nke Ị kpọrọ asị; n’ihi na, ọ bụrụ na Ị kpọrọ ihe ọ bụla asị, Ị garaghị akpụ ya.
Kedụ ka ihe ọ bụla ga-esi adị, ma ọ bụrụ na Ị chọghị ka ọ dị? Olee otu a ga-esi chekwaba ihe na-esighị n’aka Gị bịa? Ị na-eme ka ihe niile dịrị, n’ihi na ha bụ nke Gị.
Dinwenụ! Onye hụrụ ndụ n’anya! Ọ bụ Gị na-echekwaba ihe niile, maka na ha bụ nke Gị. Maka na mmụọ Gị, bụ anwụ anwụ, dị n’ihe niile. Nwayọọ, nwayọọ, ka I ji agbaziri ndị na-emehie mmehie; Ị na-adụ ha ọdụ, Ị na-echetakwara ha otu ha siri mehie, ka ha were sepụ aka n’ihe ọjọọ were tụkwasa obi na Gị bụ Osebụrụwa.
ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 144:1-2, 8-11, 13-14 Az. 1
Azịza: Chineke m na Eze m, aga m etogide aha Gị ruo mgbe ebighị ebi.
1. Chineke m na Eze m, aga m eto Gị.
Aga m agọzi aha Gị ebighị ebi.
Aga m eto Gị kwa ụbọchị.
Aga m eto aha Gị ebighị ebi.
Azịza: Chineke m na Eze m, aga m etogide aha Gị ruo mgbe ebighị ebi.
2. Onyenweanyị bụ Onye amara na Onye ebere.
Ọ naghị ewe iwe ọkụ.
Obi ọma Ya ebuka!
Ọ na-emere ihe niile O kere eke ebere.
Azịza: Chineke m na Eze m, aga m etogide aha Gị ruo mgbe ebighị ebi.
3. Onyenweanyị, ka ihe niile I kere kelee Gị.
Ka ndị kwere na Gị too Gị.
Ha kọọ akụkọ ebube nke alaeze Gị.
Ha kwuo okwu banyere ịdị ike Gị.
Azịza: Chineke m na Eze m, aga m etogide aha Gị ruo mgbe ebighị ebi.
4. Onyenweanyị kwesịrị ntụkwasị obi n’okwu Ya niile.
Ọ dịkwa asọ n’ọrụ aka Ya niile.
Onyenweanyị na-ebulite ndị niile na-ada ada.
Ọ na-ekulite ndị niile huru ehuru.
Azịza: Chineke m na Eze m, aga m etogide aha Gị ruo mgbe ebighị ebi.
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 1:11-2:2
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Nke Abụọ Pọl dị asọ degaara ndị Tesalonịka
Isi Okwu: A ga-enye aha Kristi otito n’ime ụnụ; tookwa ụnụ n’ime Ya.
Anyị na-echeta ụnụ n’expere ugboro ugboro, na-arịọ ka Chineke anyị mee, ka ụnụ bụrụ ndị kwesịrị ekwesị maka oku ahụ Ọ kpọrọ ụnụ. Anyị na-arịọkwa ka O were ike Ya nyezuo ụnụ ihe ọma niile na-agụ ụnụ agụụ n’obi, bịakwa mezuo ihe niile ụnụ na-eme n’okwukwe.
Otu a ka a ga-esi enye aha Onyenweanyị Jesu Kristi otito n’ime ụnụ, bịakwa nye ụnụ otito n’ime Ya, site n’amara nke Chineke anyị na nke Onyenweanyị Jesu Kristi.
Ụmụnna m, a bịa n’okwu gbasara ọbịbịa nke Onyenweanyị Jesu Kristi, na otu anyị niile ga-esi gbaa ya gburugburu, ụnụ ekwekwala ka ume na obi koro ụnụ n’elu ọsọsọ.
Ka ụnụ ghara ikwenye akụkọ a na-akọ ugbu a, nke na-asị na oge ọbịbịa Onyenweanyị eruola. Ọ bụrụ na ụnụ ahụ ndị na-ahụ ọhụ pụrụ iche banyere nke a, ma ọ bụ ndị na-ekwu na ha sitere n’aka Chineke nata ozi pụrụ iche banyere ya, ma ọ bụ ndị ga-agwa ụnụ na ha nwetara akwụkwọ anyị dere banyere okwu a, ụnụ ekwenyela n’ihe ndị a.
MBEKU – Luk 19: 38
Aleluya, aleluya!
Ngọzi dịrị Eze na-abịa n’aha Dinwenụ! Udo n’eluigwe, otito n’elu kacha elu.
Aleluya!
OZIỌMA – 19:1-10
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị nsọ nke Luk dere
Isi Okwu: Nwa nke Mmadụ bịara ịchọ na ịzọpụta ihe furu efu
Mgbe Jesu banyere na Jeriko, wee na-agafe n’ime obodo ahụ, otu nwoke a na-akpọ Zakịọs pụtara. Nwoke ahụ bụ nnukwu ọgaranya, bụrụkwa onye isi ndị ọna-ụtụ.
Ọ gụrụ ya agụụ n’obi ịhụ Jesu, mana o nweghị ike ilefe anya n’isi igwe mmadụ ahụ, n’ihi na ọ dị mkpụ mkpụ. Ọ gbaara ọsọ, gawa n’ihu, rịgoro n’elu osisi sikamọ, ka o wee nwee ike ịhụ Jesu, Onye si n’ụzọ ahụ agafe.
Mgbe Jesu bịaruru n’ebe ahụ, o leliri anya elu, hụ Zakịọs, sị ya: “Zakịọs! Ngwa rịdata, n’ihi na-aga M anọ n’ụlọ gị taa!” Zakịọs jiri ọsọ rịdata, werekwa ọñụ nabata Jesu.
Mgbe igwe mmadụ ahụ hụrụ ihe na-emenụ, ha tamuru ntamu sị: “Ọ gaala ịnọ na be onye njọ!” Ma Zakịọs guzooro, sị Onyenweanyị: “Nna m ukwu! Lee! Aga m ewere ọkara ihe niile m nwere keere ụmụ ogbenye.
A sịkwanụ o nwere onye ọ bụla m ghọgburu, aga m akwụ ụgwọ ya mmaji anọ.” Jesu wee sị ya: “Taa ka nzọpụta bịaruru n’ụlọ a, ebe ọ bụ na nwoke a sokwa bụrụ nwa Ebreham. Maka na Nwa nke Mmadụ bịara ịchọpụta na ịzọpụta ihe furu efu.
Igbo Mass Readings for November 6 2028, Mọnde Izuụka nke Iri Atọ na Otu N’Oge Na-Adanyeghị N’Emume
Igbo Mass Readings for November 5 2028, Ụka nke Iri Atọ na otu n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Atọ.