Igbo Mass Readings for June 21 2026, Ụka nke Iri na abụọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Mbụ.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for June 21 2026, Ụka nke Iri na abụọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Mbụ.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 20:10-13
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ onye Amụma Jeremaya
Isi Okwu: Ọ napụtara obi ndị nọ na mkpa n’aka ndị ajọ mmadụ.
Jeremaya kwuru sị: “N’ezie, anụla m izu ọjọọ nke ọtụtụ mmadụ na-agba megide m sị: ‘Egwu dịkwa n’ebe niile! Gbagide ya ama! K’anyị gbagide ya ama!
Ndị niile mụ na ha dị na mma na-eche mgbe ọ bụla m ga-azọhie ụkwụ daa. E leghị anya, ọnya ga-ama ya, anyị enweta ya, bọọrọ onwe anyị ọbọ ihe o mere anyị.
Ma Onyenweanyị nọnyeere m, dịka oke dikeọgụ. Ndị na-ebuso m agha ga-asụ ngọngọ. Ha agaghị e meri. Ihere ga-eju ha anya n’ọdịda ha, wee butere ha oke ọgba gharịị dị ebighị ebi, nke a na-agaghị echefu echefu.
Onyenweanyị nke igwe ndị agha, ọ bụ Gị na-enyocha ndị ezi omume: Gị bụ onye ahụ na-enyocha uche na obi mmadụ, kwee ka m jiri anya m hụ ọbọ Ị ga-abọgwata ha, maka na ọ bụ Gị ka m kpesaara olu m.
Kweere Onyenweanyị ukwe. Too Onyenweanyị maka na Onyenweanyị agbapụtala ndụ ụmụ ogbenye n’aka ike nke ndị ajọ omume.
ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 68:8-10, 14, 17, 33-35 Az. 14
Azịza: Onyenweanyị, were nnukwu ịhụnanya Gị za m oku.
1. N’ihi Gị ka m ji ana nkọcha. Ihere ekpuchiela m ihu.
Aghọọla m onye a tụpụrụ n’iwu n’ebe ụmụnne m nọ.
Bịakwa ghọọ onye ọbịa n’etiti ụmụnne m, ndị otu nne mụrụ mụ na ha.
Maka na obi ịnụ ọkụ maka Gị erepịala m.
Nkọcha ndị na-ekwutọ Gị na-ala m n’isi.
Azịza: Onyenweanyị, were nnukwu ịhụnanya Gị za m oku.
2. Onyenwe m, ana m arịọ Gị: Chineke m, ana m arịọ amara Gị.
Na nnukwu obi ọma Gị, nyere m aka ugboro ugboro, za m oku.
Onyenwe m za m oku n’ihi na obi ọma Gị ebuka.
Na nnukwu ebere Gị tụgharịa chee m ihu.
Azịza: Onyenweanyị, were nnukwu ịhụnanya Gị za m oku.
3. Ụnụ bụ ụmụ ogbenye, leenụ anya, ka obi tọọ ụnụ ụtọ.
Ụnụ bụ ndị na-achọ Chineke, ka obi ụnụ jupụta n’añụrị.
Maka na Onyenweanyị na-anụ olu ụmụ ogbenye.
Anya Ya-anaghị apụ apụ na ndị nke Ya e ji n’agbụ.
Ka eluigwe na ala too Ya. Ka osimiri na ihe niile na-emetụ ụñara n’ime ya too Onyenweanyị.
Azịza: Onyenweanyị, were nnukwu ịhụnanya Gị za m oku.
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 5:12-15
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Pọl dị asọ degaara ndị Rom
Isi Okwu: Amara e nyere kariri ọdịda a dara.
Dịka njọ si n’aka otu nwoke wee bata n’ụwa; ọnwụ sokwara njọ bata. Otu ahụ ka ọnwụ si rute mmadụ niile, maka na onye ọ bụla emeela njọ. Njọ anọọlarị n’ụwa ogologo oge tupu e nye Iwu.
Ma ebe ọ bụ na iwu adịghị, o nweghị onye e nwere ike ibo ebubo na o mere njọ nke ‘imebi iwu’. Ma ọnwụ chịrị mmadụ niile, bido n’Adam ruo na Mosis; ọ bụladị na njọ ha abụghị imebi iwu, dịka nke Adam.
Adam bụ onye e ji ama atụ nke Onye Ahụ gaje ịbịa. Ma amara e nyere jiri ihe buru ibu karịa ọdịda a dara. Ọ bụrụ na o were anya, na mmadụ niile sitere n’ọdịda otu nwoke nwụọ; ọ kara wee anya na amara Chineke, nke sitere n’aka otu nwoke ahụ bụ Jesu Kristi, bịara rute mmadụ niile, dịka onyinye zuru oke, e nyere na nkịtị.
MBEKU – Jọn 14:23
Aleluya, aleluya!
Onye ọ bụla hụrụ M n’anya ga-edebe okwu M. Nna M ga-ahụ ya n’anya. Anyị ga-abịakwute ya.
Aleluya!
OZIỌMA – 10:26-33
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Isi Okwu: Ụjọ mmadụ atụla ụnụ.
Jesu gwara Ụmụazụ Ya sị: “Ụnụ atụla ụjọ mmadụ! N’ihi na ihe ọ bụla e kpuchiri ekpuchi ugbu a ga-abụ ihe e kpughere ekpughe. Nke ọ bụla e zoro ezo, ga-abụ ihe a gbara n’anwụ.
Ihe M gwara ụnụ n’ọchịchịrị, kwuonụ ya n’ehihie ọcha. Ihe M takwụnyere ụnụ na ntị, kwusaanụ ya n’elu ụlọ. Ụnụ atụla egwu ndị ahụ na-egbu ahụ, ma ha enweghị ike igbu mkpụrụ obi.
Kama tụọnụ egwu Onye ahụ nwere “ike ime ka ahụ na mkpụrụ obi laa n’iyii n’ọkụ ala mmụọ. Ihe a na-ere ụmụ nza abụọ ọ bụghị naanị otu kọbọ? Ma nke ọ bụla n’ime ha e nweghị ike ịda n’ala, ma ọ bụrụ na Nna ụnụ amaghị.
Ma otu ọ dị, a gụọla agịrị isi ụnụ bu n’isi ọnụ. Ya mere, ụnụ atụla egwu ọ bụla. N’ihi na ụnụ dị oke ọnụ ahịa karịa ọtụtụ ụmụ nnụnụ. “Ya mere, onye ọ bụla nke ga-ekwupụta M n’ihu mmadụ, aga M ekwupụta ya n’ihu Nna M nọ n’eluigwe. Ma onye ọ bụla nke ga-agọnarị M n’ihu mmadụ, aga M agọnarị ya n’ihu Nna M nọ n’eluigwe.
Igbo Mass Readings for June 22 2026, Monde Izuụka nke Iri na Abụọ N’Oge Na-Adanyeghị N’Emume
Igbo Mass Readings for June 21 2026, Ụka nke Iri na abụọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Mbụ.